Big Brother Naija: Lamborghini Mercy abụrụla Ugoeze Big Brother Naija

Ebe foto si, Mercy Eke
N'ikpeazụ 'Lamborghini' Mercy atụrụla ugo dịka Ugoeze n'ihe emume onyonyo nke Big Brother Naija.
Dịka ọgụ, mgba, oge ịhụnanya nakwa esemokwu mere n'ime ọnwa atọ gara aga, Mercy meriri Mike iji bulie agbaego a na-ala.
A chụpụrụ Frodd, Seyi na Omashola n'emume n'abalị ụbọchị ụka bụ ụbọchị isii nke ọnwa Ọktoba 2019, tupu a kpọpụta aha Mercy.
Cheta na ihe emume a ji mmadụ iri na ise malite n'ụbọchị 30 Juun, afọ 2019 rue taa otu onye pụtara dịka ọkaibe.
Kwado nụ onye Igbo ịbụ onyeisiala n'afọ 2023

Ndị ntoroọbịa Ohanaeze Ndigbo ekwuola na ọ dị mfe onye Igbo ịbụ onyeisiala n'afọ 2023 karịa inweta Biafra.
N'ime akwụkwọ ozi onyeisi ha bụ Okechukwu Isiguzoro na odeakwụkwọ ha bụ Okwu Nnabuike wepụtara, otu a kpọrọ okuka ndị Ipob nakwa ndị Igbo niile gbakọta aka iji họpụta nwafọ Igbo dịka onyeisiala.
Otu gara n'ihu kwuo na ha ga-enye ndị mpaghara ndị ọzọ ngarị iji mee ka ha dọnyere ndị Igbo ukwu ịhọpụta onyeisiala.
Ohanaeze Ndigbo kwuru na ha ga-arịọkwa otu ndọrọ ndọrọ ọchịchị ka ha họpụta onye Igbo ga-eji ọkọlọtọ ha zọọ ọkwa onyeisiala.
Gọọmentị akwụwala ụgwọ ọnwa opekatampe - Ngige

Ebe foto si, @LabourMinNG
Mịnịsta na-ahụ maka ndị ọrụ bụ Chris Ngige ekwuola na gọọmentị etiti amalitela ịkwụ ndị ọrụ ogodo ha kachasị nta ụgwọ ọnwa opekatampe puku naịra atọ.
Ọ gara n'ihu kwuo na gọọmentị na otu jikọtara ndị ọrụ ka na-arọzi olu maka nke ndị ọrụ nọ n'ogogo dị elu.
N'ofesi

Ebe foto si, CBS NEWS VIA EVN
Otu nwoke ji egbe agbagbuola mmadụ anọ ma merụọ mmadụ ise ahụ n'otu ụlọ a na-aṅụ mmanya n'obodo Kansas dị n'Amerịka.
Ndị uweojii gwara ndị ntaakụkọ BBC na nwoke na-asụ asụsụ ndị Spen riri mbọ mbọ ọsọ ngwa ngwa ọ gbachara arụ a.
N'egwuregwu

Ebe foto si, Getty Images
Wolverhampton Wanderers ji ọkpụ goolu abụọ asataghị otu lụọ ndị Manchester City dịka nwụnye n'asọmpi Premier League.
Chelsea ji ọkpụ anọ asatara otu tie Southampton mmọnwụ ebe Arsenal ji otu ọkpụ merie Bournemouth.
Nkeji
Ihe nkiri
Gọvanọ Borno akpọla ndị nsọ ga-eji ekpere chụpụ Boko Haram

Ebe foto si, Empics
Gọvanọ Borno steeti bụ Babagana Zulum ahọpụtala ndị ekpere 30 bụ ndị ọ sị na ha ga-aga ala nsọ bụ ebe ha ga-eje kpọpee ekpere dị ekwụ bụ nke ga-ememila Boko Haram na steeti ahụ na ndị nọ ya nso bụ ebe ọrịa Boko Haram ji aka.
Nke a si na ọnụ onye na-ekwuchitere ya bụ Gọvanọ bụ Isa Gusau bụ onye kwuru na ndị ekpere iri atọ a adịla njikere ị ga ala nsọ ha na Saụdị Arebia bụ ebe ha ga-anọ kpọpee ekpere ga-ememila ndị omekaome a.
Gusau kwuru ụbọchị Satọde na " Gọvanọ Babagana Umara Zulum na ndị ekpere iri atọ bị na Makkah enweela nkwekọrịta maka ị kpe "Dawaf' kwa ụbọchị maka ịmemila Boko Haram na steeti ndị ọmetutara".
O kwughị ma ego eso na ya bụ nkwekọrịta mana ọ sị na ndị ekpere a sị Borno, Katsina, Zamfara nakwa Kano steeti.
O kwukwara na ndị nsọ a bụ ndị tagoro ọjị ụwa n'ekpere bụ ndị nọgoro ihe ruru afọ iri anọ na Ka'aba bụ ụlọnsọ ha na-efe Chukwu.
Ka'aba bụ ebe kacha nsọ na Al-Haram Mọsk dị na Makkah.
Gusau sị na ekpere ndị a ga-enyere ndị agha aka imeri Boko Haram kpamkpam ma wetakwa udo tọrọatọ na Steeti ha.
Isreal Adesanya eturula ụgọ UFC243 middleweight

Ebe foto si, Getty Images
Isreal Adesanya nwaafọ Naịjirịa nke a na-etu "Last Stylebender" akụpụla Robert Whittaker mkpụrụ ọkwụrụ n'anya maburu mbenaukwu nturugo nke UFC middleweight championship nke na-akpọtụ na ọgbọọgụ Melbourne, Australia.
Adesanya ji iwe kụpụ Whittaker anwuru n'anya nke Bekee kpọrọ "knockout" n'agba nke abụọ.
Ọ kpara ike a site na ịkụ ya ọkpụ 3:33 bụ ebe ọ nọ menye ya bụ nwoke ihere n'ihu mmadụ puku iri ise na asaa.
Mmeri a mere ka ọ rigoro na ogoogo 18-0 bụ nke mere o jiri bụru ọkaibe na ya bụ "middleweight"
Adesanya gwara Jon Aik bụ onye nkọwa nke ọkpa ahụ " ọbara gbaburu m n'ime, ụgbụa nke ya agbawala ya".
Nwafọ Naịjirịa bụ onye na-anọchite mba New Zealand bụzị onye ji mbenukwu nke "middleweight title" na egwuregwu UFC 243.
Ọsọ tara na mmeme BBC 1 Extra na Birmingham Arena

Ebe foto si, Getty Images
Obi ọjọọ ji ndị mmadụ ụnyahu bụ Satọde ka ndị amakekwu tisara mmeme ndị BBC 1 Extra kpokobara na Birmingham Arena.
Ya bụ ahịa họrọ onyeukwu na onyenta ebe ihe ruru mmadụ 15,800 kwuru ụkwọ ya bụ mmeme gbara aka lawa na-ekirighị ihe ha jiri bịa.
BBC 1 Extra buputara egwu ndị ọhụrụ nakwa nke dị ochiedike dị n'egwu bụ nke azụchara oche niile dị n'Arena.
Mmadụ dịka Aitch, French Montana, Ms Banks, Wizkid na ndị ọzọ bụ ndị buputara egwu ha ọgbọ.
Mana ọrụ kụrụ akụ.
Otu onye n'ime ndị BBC kpọrọ bịa ya bụ egwu bụ onye ọmambem Bekee akpọrọ Krept bụ onye asị na-akụrụ ihe na ya bụ emume eji kagbuo ya.

Ebe foto si, PA Media
Ya bụ nwaadị gbara afọ 23 azaala n'akara Twitter ya na ya enweghị nsogbụ ọbụla.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post
Dịka ndị uweojii na-ama ime n'ala ka ha chọpụta nke bụ eziokwu na ndị mere ya bụ ihe, ha sị na ya bụ nwaamadị emerughị ahụ ọbụla.
Ala ọmajiji n'Alayi

Ndị Isiaku Alayi dị na Okpuruọchịchị Bende nke Abịa steeti chizi obi na aka dịka alaọmajijii mebichara ugbo na ụzọ ha.
Eze Uche Akukwu nke mbu na Alayi akpọkuola Gọọmenti ukwu ma nke nta ka ha gbatara ha ọsọ enyemaka maka ụganị nke nwere ike ịdakwasị ha maka ọdachi a.
TUC amala ọkwa abụbụ ọrụ

Ndị Naịjirịa kee nkwụcha chebiri abụbụ ọrụ kacha abụbụọrụ site n'ụbọchị iri na isii nke ọnwa Ọktoba.
Onyeisi ndị Trade Union Congress bụ Quadri Olaleye kwuru na ọ bụrụ na gọọmenti etiti elebeghị anya na ibuli ụgwọ ọnwa ndị isiọrụ bụ nke ha bidoro ịgba ụgwọ ya kemgbe na egwu ga adị.

Ebe foto si, Reuters
O gbugbu mmadụ na mmeru ahụ a ezuolanụ!
Otu na ndị isi United Nations bụ Jeanine Hennis-Plasschaert tiri mkpu maka otu narị mmadụ egbugoro na mba Iran site na ngagharịiwe amalitere kemgbe izuuka.
Ndị Iran na-eme ngagharịwe maka agụ, enweghị ọrụ na mpụ ha sị na ọ ka nkụ na obodo ha.
Arsenal na Bournemouth

Ebe foto si, Getty Images
N'egwuregwu, taa bụ oke ụbọchị na Premịa Lig dịka Arsenal ga-ezute Bournemouth, Man City na Wolves ga-ezute onwe ha.
Southampton na Chelsea ga-akwata ebe New Castle na Manchester United ga-ama ọkaibe.










