Tammy Abraham: Otu nkwọ Ọnịcha amaghị na otu onye abịaghị ahịa - Kanu Nwankwo

Fikayo Tomori na Tammy Abraham

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Fikayo Tomori na Tammy Abraham
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 3

Otu nkwọ Ọnịcha amaghị na otu onye abịaghị ahịa

Nke a bụ ihe Kanu Nwankwo nwere ikwu gbasara ọkpụkpọ ndị otu egwu bọọlụ nke mba Ịngland kpọrọ Tammy Abraham na Fikayo Tomori ka ha gbaara ha bọọlụ.

Abraham na Tomori bụ ụmụ Naịjirịa. Ha na-agbara otu egwu bọọlụ Chelsea.

Ha agbaarala Ịngland bọọlụ n'ogoogo ndị erubeghi afọ 21.

Onye nkuzi bọọlụ nke mba Ịngland bụ Gareth Southgate kpọrọ Abraham na Tomori ka ha soro gbaa bọọlụ mgbe Ịngland ga-ezute mba Chek Rịpọblik n'ọnwa Ọktoba a.

Nke a pụtara na ha abụọ agaghị enwe ike ịgbara Naịjirịa bọọlụ ọzọ.

Mana Kanu Nwankwo kwuru na nke ahụ enweghị ihe o mere.

Nwankwo Kanu

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Nwankwo Kanu mgbe ọ ka nọ n'egwu.

Dịka o si gwa ụlọọrụ ntaakụkọ Goal.com, Nwankwo kwuru na Naịjiria nwere ndị bọọlụ ọka nkụ.

"Anyị agaghị arịọ onye ọbụla arịọ ka ọ gbaara Naịjirịa bọọlụ."

"Ọbụ ndị mmadụ kwesịrị ịrịọ ka ha gbaara Naịjirịa bọọlụ."

"Naịjirịa nwere ndị ma agba bọọlụ ọka nkụ."

"Ndị anyị nwere ga-ezu inye anyị mmeri n'asọmpi ọbụla."

Ịngland ga-ezute Chek Rịpọblik n'abali iri na otu.

Naịjirịa na Brazil ga-ezute n'asọmpi enyi na enyi n'abalị iri na atọ nke ọnwa Ọktoba.

Lee etu mba Kenya si ebuso nrụrụaka agha

Akwụkwọ ego 1000 shillings nke Kenya

Ebe foto si, AFP

Nkọwa foto, Akwụkwọ ego 1000 shillings nke Kenya

Gọọmentị Kenya ekwuola na atụmatụ ha wepụtara iji wepụ akwụkwọ ego ochie otu puku shilling maka iji gbochie nrụrụaka, gara nke ọma.

Ha kwuru na ihe ruru mmadụ pasentị iri itoolu na asaa eweghachila nke ha, nke pụtara na onye ọbụla ka ji akwụkwọ ego otu puku shilling nke ochie ugbua, jizi akwụkwọ nkịtị.

"Anyị agaghị ekwe nkwa anyị agaghị emezunwu"

Ngige

Ebe foto si, Ngige twitter handle

Minista na-ahụ maka ọrụ bụ Chris Ngige ekwuola na gọọmentị etiti agaghị ekwe nkwa ha agaghị emezunwu.

O kwuru nke a ebe ọ na-arịọ ka ndị ọru nabata atụmatụ gọọmentị wepụtere iji tinye ego n'ụgwo ọnwa.

Ngige sị na atụmatụ ahụ dị mma maka ha mefee oke, ọ bata n'ịchụ ndị mmadụ n'ọrụ.

Nke a na-abịa dịka otu NLC bụ ndị na-elekọta ndị ọrụ na-akwado ịgba abụbụ ọrụ n'izu abụọ na-abịa.

President Cyril Ramaphosa meet President Muhammadu Buhari for Abuja

Ebe foto si, Twitter

Nkọwa foto, President Cyril Ramaphosa meet President Muhammadu Buhari

Onyeisiala mba Saụt Afrịka bụ Cyril Ramaphosa ekwuola ihe gọọmentị ya bu n'uche maka ụmụ Naịjirịa bi na mba ahụ.

O kwuru na ọ ga-anwa ike ya niile iji hụ na mwakpo Xenophobia ga-abịa na njedebe.

Okwu ya nke a sị na mkparịtaụka ya na Onyeisiala Muhammadu Buhari na ndị ntaakụkọ nwere na Pretoria n'ụbọchị Tọzde.

Okwu ụgha na Facebook

Cambridge Analytica bụ ụlọọrụ mba Britain na-ahụ maka ichekwa ozị

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Cambridge Analytica bụ ụlọọrụ mba Britain na-ahụ maka ichekwa ozị

Facebook amalitela iwepu akara ndị ha sị na ekesa asị na intanetị, ọkachasi ndị nọ na United Arab Emirates, Ijipt nakwa Naịjirịa.

Facebook sị na akara ndị ha wepụru bu nke ndị mmadụ hiwere iji na-aghọrị ndị mmadụ site na-ikesasị akụkọ ụgha.

Na mba ofesi

Skip X post, 1
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 1

Onyeisiala mba Cameroon bụ Paul Biya enyeela iwu ka atọghapụ mmadụ nari atọ na iri atọ no n'ụlọ mkpọrọ.

Ndị a atọghapụrụ so n'ime ndị si mpaghara ọdịda anyanwụ mba ahụ eji maka ọgbaghara metutara mwereonwe ha.

N'Egwuregwu,

Skip X post, 2
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 2

Chukwuebuka Enekwechi abụrụla onye Naịjirịa mbụ ruru agba nke ikpeazu na asọmụnpị ịtụ ọkpụ okwute Bekee kpọrọ "shot put".

Enekwechi tụtara centimetre iri abụọ na ọma iji tozue n'asọmpị IAAF a na-agba na Qatar.

Gee Nkeji ebe a

Aha nkeananụānụ, Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile