Xenophobia Attacks: Anyị na ndị South Africa bụ nwanne - Nuella Njubigbo Chikere

- Onye dere ya, Jessica Nwankwo
- Ndị mere akụkọ a, Broadcast Journalist, BBC Igbo, Lagos
- Oge e ji agụ akụkọ nkeji 1
Nuella bịara n'ụlọọrụ BBC Igbo sonye na mkparịtaụka a kpọrọ 'Gịnị na-afịọ' ebe ọ nọ kwuo uche ya gbasara okwu a kpụ n'ọnụ, ndụ ya nakwa ihe na-eme na Nollywood.
Ọ zakwara ajụjụ ndị ọzọ gbasara ezinaụlọ ya dịka akụkọ na-efegharị maka di ya bụ Tchidi Chikere.
Mgbe a jụrụ ya ajụjụ gbasara kepukepu na di ya gbaghapụụ onye ọ na anụbu lụwa ya, ọ sara sị, "unu ga-akpọta Tchidi n'onwe ya jụọ ya maka nke ahụ".
N'akụkọ gbasara Xenophobia, o kwuru na ọ bụ ihe mwute na ndị Afrịka niile kwesiri ịbụ nwanne anaghị ahụ onwe ha etu ahụ.
"Ya bụ ihe jogburu onwe ya ka o kwukwara" ka Nuella kwukwara.
Content is not available
View content on FacebookBBC anaghị ahụta maka ọdịnaya nke saịtị ndị dị na mpụga.sEnd of Facebook post
O ji kwa ohere ahụ zara ọnụ ndị ibe ya na-eme ihe ejiije na Nollywood gbasara ebubo mmefu akụ onye ọzọ a na-ebo ha.
Ọ kọwara na ndị ọrụ ejije nwekwara aka ọrụ dị icheiche ha ji enweta ego n'akụkụ nke Nollywood ha na-eme.
"Ọ bụghị mmadụ niile ga-agwa gị ọrụ ndị ha na-arụgasị n'akụkọ iji kwalite ego ha" ka Nuella gwara anyị.
Gee ihe ndị ọzọ o kwuru na mkparịtaụka ya na BBC Igbo ebe a.









