South Africa Xenophobia: Mwakpo 'Xenophobia' ataala isi mmadụ ruru 600 kamgbe 2006

Ebe foto si, Getty Images
N'ime ụbọchị ole gara aga ndị ngagharịiwe malitere ọgbaaghara na Johannesburg bụ isi obodo azụmaahịa mba Saụt Afrịka, mebisie ụgbọala ma na-ezụ ngwaahịa nke ndị mbịambịa nwe.
Ndị ọrụ gọọmentị mba Saụt Afrịka na-ekwu na ọ bụ ndị ohi na ọ bụghị mwakpo ịkpaoke agbụrụ.
Agbanyeghi nke a, gọọmentị Naịjirịa akpọọla onye na-anọchite anya Saụt Afrịka na Naịjirịa, kwuo na ọ bụ azụmaahịa ụmụafọ Naịjirịa ka ha na-awakpo.
Kedụ etu mwakpo ndị mbịarambịa si malite nakwa etu o si akawanwe njọọ?
Agbanyeghị na ọtụtụ ndị Saụt Afịrịka na-ekwu na ọ bụ iwe n'ihi ihe na-esiri ha ike na-akpata ụdịri omume a, ya bụ ihe a abụghị ihe taa.
"Xenophobia" Saụt Afịrịka
Xenophobia bụ ogbugbu mmadụ makana ọ bụ onye mbịarambịara. Ihe a dị n'ọtụtụ mba, mana ọ bụ Saụt Afịrịka ka ọ bụ akụkọ kwamgbe na nsonso a. Ebe a ka ọkachasị taa akpụ.

Ebe foto si, MARCO LONGARI
Na mba, ndị kachasị buo ibu bụ ndị isi oji. Ndị tara ezigbote ahụhụ n'aka ndị ọcha kpasịrị ha oke agbụrụ site n'ọchịchi nchịgbụ akpọrọ "apartheid" na Bekee.
Ugbua, ọ bụ ndị isi oji bụ ndị obi na-agbawa makana ndị si mpaghara Afịrịka ọzọ nọ na mba ahụ arụ ọrụ ma na-azụ ahịa.
N'ime afọ iri gara aga, ọtụtụ ndị isi oji si Naịjirịa, Zambia, Malawi na ọtụtụ mba ndị ọzọ anwụọla na mwakpo ndị a.
Agbanyeghi na goomenti Saụt Afịrịka na-akatọ mwakpo ndị a, ma na anwụchị ndị aka ha dị na ya, ọ ka na-eme kwamgbe kwamgbe.
N'ọnwa Mee 2008
Ndị ntaakụkọ kọwara ihe mere n'obodo Johannesburg n'ime afọ gara aga dịka "agha".
Ọgbaghara dara ebe ahụ gburu mmadụ 62 ma chụpụ mmadụ 6,000 n'ụlọ ha bi.
Ndị uweojii jidere mmadụ 200 kpara ajọ ike dịka iwakpo nwaanyị n'ike na ohi na ya bụ ọgbaghara.

Ebe foto si, EPA
Nwakpo nke a metụtara ndị Zimbabwe karịa mana ometụtakwara ndị Naijirịa.
Maach 2012
Agbanyeghi na mwakpo abataghi n'oge a, Saụt Afịrịka rịọrọ Naịjirịa mgbaghara etu ha ji chụla ndị Naịjirịa dị 125 n'ihi okwu akwụkwọ "Yellow Fever" ha sị bụ nke adịgboroja.
Naịjirịa sị na ọbụ oke agbụrụ mere Saụt Afịrịka jiri mee ihe a.

Ebe foto si, AFP
Eprel 2015
Ihe ruru mmadụ ise nwụrụ na obodo Durban mgbe ndị Saụt Afịrịka nwakporo ndị mbịarambịa dịka eze ndị Zulu bụ Goodwill Zwelithini sị ka ndị si esi laghachi mba ha.
Agbanyeghi na o mechara sị na ndị mmadụ ghọtaghiere ya, ndị mmadụ ji okwu ya ahụ kpaa ume iji wakpo ndị agbataobi ha.

Ebe foto si, Reuters
Ọgọst 2018
Ndi uweojii na Soweto sị na mmadu atọ lara mmụọ n'ọgbaghara metụtara ụlọ ahịa ndị mbịarambịa.
Ọtụtụ ndị ihe metụtara bụ ndị si mba Somalia.
Akụkọ sị na okwu bidoro mgbe otu onye Somalia gbagbụrụ otu onye Saụt Afịrịka bịara izu ohi n'ụlọ ahịa ya.

Ebe foto si, AFP










