Ndị igwe mmadụ agbaala nwa Naịjirịa ọkụ na Sawụtụ Afịrịka

Ụgbọala a gbara ọkụ

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Ndị Sawụtụ Afịrịka na-ebuso ndị si mba Afịrịka ndị ọzọ agha

A gbaala nwa Naịjirịa ọzọ ọkụ n'obodo Rustenburg dị na mba Sawụtụ Afịrịka dịka igwe mmadụ ahụ a gbasịrị ụgbọala ya ọkụ.

Onyeisi otu ụmụ Naịjirịa bi na Sawụtụ Afịrịka bụ Adetola Olubanjo kwuru nke a.

Ihe a mere ọhụrụ a na-egosị na agha ndị mmadụ na Sawụtụ Afịrịka na-ebuso ndị Naịjirịa bi n'obodo ha.

Ndị uweojii na Sawụtụ Afịrịka ekwukwala na ihe ahụ mere bụ eziokwu ebe ha kwuru na e nwere ebe abụọ ndị a na-amaghị gbara ụgbọala ọkụ.

Ndị na-eme ngagharị gbasara ya bụ ogbugbu ahụ ha na-eme

Ebe foto si, Getty Images

Ha kwuru na n'otu nime ụgbọala ahụ a gbara ọkụ, otu nwoke gbalahụrụ ha mana o merụrụ ahụ nke ukwuu dịka a kpọrọ ya ọkụ mana o mesiri nwụọ n'ụlọọgwụ.

Ogbugbu a na-abịa n'ihe na-erughi mkpụrụ ụbọchị iri e gburu ThankGod Okoro n'obodo Florida West Rand dị na Johanisbọg.

Ndekọ na-egosi na e gbuola ụmụ Naijirịa ruru mmadụ 117 na mba Sawụtụ Afịrịka kamgbe ọnwa Febuwarị afọ 2016.

Akara ntụ-ntụ

Akụkọ ndị ga-amasị gị:

Akara ntụ-ntụ