Anne Njemanze sị na ọ ga-amasị ya ịlụ di nke ugboro atọ ma mụọ nwa ọzọ

Anne Njemanze
Nkọwa foto, Anne Njemanze so mee ihe nkiri a kpọrọ "Domitila"
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 1

Nwaada Anne Njemanze bụ onye na-eme ejije na Nollywood ekwuola na ọ dị njikere ịnabata nwoke ọzọ na ndụ ya dịka di.

Na mkparịtaụka ya na BBC Igbo nwere n'ụbọchị Fraịde, 23 Ọgọst, afọ 2019, Anne kọwara etu ije alụmdinanwunye ya si gaa.

Skip Facebook post

Content is not available

View content on FacebookBBC anaghị ahụta maka ọdịnaya nke saịtị ndị dị na mpụga.s

End of Facebook post

O kwuru na o ji anya ụmụaka lụọ di mbụ ọ lụrụ bụ Segun Arinze, nke ha mechara gbasaa mgbe ha mụtara otu nwa nwaanyị.

Anne bụ onye e ji aha 'Domitila' mara kwuru na agbanyeghi na ọ mụọla ụmụ abụọ, na ọ dị njikere ịlụ di ma ọ hụ nwoke dị mma.

Anne Njemanze na Chimezie Ucheagbo
Nkọwa foto, Anne na onye ntaakụkọ BBC Igbo mere mkparịtaụka ebe o kwuru ihe dị ya n'obi ma gbakwaa egwu ukwu ndị Owere

O kwuru na obi ga-adị ya mma nke ukwuu ma ọ bụrụ na ọ mụọ ụmụejima tinyere abụọ ndị ọ mụrụla amụ.

Anne gara n'ihu dọọ ndị na-achọ alụmdinanwunye aka na ntị ka ha saa anya ha mmiri n'ịhọrọ onye ha ga-alụ.

Anne malitere ime ejije n'ime ihe karịrị afọ 20 gara aga, ebe o mere ihe onyonyo dịka 'Rattle Snake', 'Domitila' dgz.

N'ime di abụọ ọ lụrụla, Anne mụtara ụmụaka abụọ; otu nwoke na otu nwaanyị.

Akụkọ ga-amasị gị:

Ihe nkiri a ga-amasị gị:

Aha onyonyo, Anyị alụọla afọ 57 mana anyị anaghị atọ ka shuga mgbe niile