Igbo Marriage: Ihe ndị mere ụmụntorobia Igbo anaghị alụ di na nwụnye n'oge
Content is not available
View content on FacebookBBC anaghị ahụta maka ọdịnaya nke saịtị ndị dị na mpụga.sEnd of Facebook post
O were ewu na ọkụkọ anya na Ndigbo so n'agbụrụ anaghị alụkarị di na nwunye n'oge na Naijiria.
Ị na-ajụ ihe butere ya?
Ndị ọbịa tụnyere ọnụ na mkparịtaụka banyere okwu a na Facebook Live BBC Igbo hiwere ụbọchị Fraide gụnyere Chisom Ojukwu bụ onye MC, Anita Joseph, onye ihe nkiri na ọkachamara n'ihe gbasara mmekọrịta mmadụ na ibe bụ Obioma Ogakwu, rụtụrụ aka n'ụfọdụ ihe.
Lee ihe ndị ha rụtụrụ aka ebe a:
1. Apụghị apụ.
Nne na nna Igbo na-apa ụmụnwaanyị ka akwa, ha agaghị ekwe ka nwata nwaanyị toruola afọ iri abụọ biri onwe ya.
Chisom Ojukwu jụrụ sị "Ọ bụrụ na nwaanyị enweghị ohere pụọ apụọ, ọ bụ n'ime ụlọ ka m ga-achọta ya?"

2. Ihe e ji alụ nwaanyị n'ala Igbo karịrị akarị.
Obioma Ogakwu rụtụrụ aka na "Ndị be anyị kwesịrị ka e wetulata ihe dị na 'list' e ji alụ nwaanyị. O kwesịrị ka ọ gbadata ka e were nyere nwoke aka."
Ogakwu rụtụkwara aka n'obodo ndị merela nke a.
3.Ịhụnanya na-ahụzị ụzọ

Ogakwu kwuru na "ego ekwesịghị ịkwụsị gị ịlụ nwaanyị mana ọ bụrụ na nwaanyị ị chọrọ ịlụ, na anya ya dị n'ego, ọ gaghị eme."
Mana Ojukwu rụtụrụ aka na "anaghị ahụkarị ụmụnwaanyị chọrọ ikwado nwoke na-agba mbọ mana ọ hụbeghị ego."
4. Ihe isi ike
Ojukwu na-eti mkpụ na "Obodo siri ike" nke mere na ụmụokorobia ga-agụcha akwụkwọ ha agaghị enweta ọrụ ma ya fọdụ inweta ego iji lụọ nwaanyị oge ha tozuru ya.









