Nwoke okwesịrị inyere nwunye ya aka n’ezinaụlọ?

Nwoke na-asa efere

Ebe foto si, Getty Images

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 2

BBC Igbo jụrụ ma nwoke o kwesịrị inyere nwunye ya aka ịrụ ọrụ n'ụlọ ha, ụfọdụ kwere, ebe ndị nke ọzọ ekweghị.

Ọ bụghị ihe mara ndị mmadụ ahụ na mba Afrịka ka nwoke bụ dibia ụlọ na-arụ ụfọdụ ọrụ dị n'ime ụlọ ya na nwunye ya bi.

Mgbe mbụ, a na-ewe ya na ọrụ ndị dịka isi nri, ịza ụlọ, ịsa efere, iku nwa, ịsa akwa nakwa ndị ọzọ, abụghị ọrụ nwoke na-arụ n'ezinaụlọ, ọkachasị na mba isi ojii Afrịka.

Maka na ndị Afrịka na-eme alụmdinanwunye ebe nwunye ga-ewe di ya dịka 'chi', tụmadụ ndị Igbo.

Mana ugbua, okwu dị ka ọdagharịala, maka na ọtụtụ ụmụnwaanyị ugbua na-ele anya na di ha ga-enyere ha aka n'ụlọ.

Kaosiladị, ụfọdụ ụmụnwoke anaghị eche ka a gwa ha agwa maọbụ rịọ ha biko tupu ha rụọ ọrụ ndị ahụ akpọpụtara n'elu, ebe ụfọdụ nwere ike iwe ya ka mkparị.

Nwoke na-asụ nri

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Mgbe gboo n'ala Igbo, nwaanyị ga-esicha nri bunye di ya ka o rie, di ya agaghị etinyere ya aka

Ka BBC Igbo jụrụ ndị mmadụ "Nwoke o kwesịrị inyere nwunye ya aka ime ihe ndị dịka isi nri, ịza ụlọ, ịsa efere, n'ezinaụlọ?" Ha zara azịza dị iche iche.

Chioma Osuala kwuru sị "onweghị ihe dị njọ dị na nwoke inyere nwunye ya aka. Ma na ọdịghị mma ka nwunye ya were ya ka ihe mkparị."

Nwoke ku nwa ya

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Mgbe gboo, ọ bụbụ ọrụ nwaanyị ịlekọta ụmụaka n'ezinaụlọ

Chukwuogo Umejiaku sị "Ọ bụghị iwu, onye chọọ o mee".

Okechukwu Mba kwuru sị, "Ana m emebu ya mbụ tupu nke nwaanyi abata. O nwebeghị ihe m hụtara ga-eme ka m kwụsị inyere ya aka kama agwa ya."

Gụọ ihe ndị ọzọ kwuru maka ya ebe a:

Ị nwekwara ike tinye ọnụ gị n'okwu a.

Nwoke o kwesịrị inyere nwunye ya aka n'ezinaụlọ?

Aha onyonyo, Ego nwunye gi na-akpata ọ ga-eme ka ị lakwuru ya n'obodo ọzọ
Akara ntụ-ntụ

Akụkọ ndị ga-amasị gị:

Akara ntụ-ntụ