Edochie si na ọjị bụ ihe eji anabata ndi obịa
Ịgọ ọjị ma ọbụ ikpe ekpere ọjị bụ nnukwu emume ndị Igbo na-eme. Onye Igbo ọ bụla kwenyere na ọjị bụ ihe eji anabata ndị obịa na omenala Igbo.
Pete Edochie kọwara na nkọwa ihe ọjị putara bụ: Ọ - Omenala, J - Jikọrọ, I - Igbo.
Nke a mere BBC Igbo jiri ga n'ulo ya bụ nnukwu onye echichi ka ọ goro anyị oji iji were mepee ngalaba ntaakụkọ ọhụ bụ BBC Igbo service.
Nkata anyi na Pete Edochie ga na abịara unu na nkeji na nkeji.