BBC Igbo ebidola ọrụ ha na Naịjirịa

Ihe a ọ bụkwa BBC a ma ama?
Mgbe ọtụtụ n'ime anyị hụrụ mgbasaozi ọrụ BBC, anyị ekwenyeghị. Ụfọdụ sị, "Taa, Ụgha!" "Ezigbo aghụghọ." Ụfọdụ asịkwa, "Ewo!" "Ọ bụkwa BBC n'ezie?"
Anyị cheburu echichie, wee si ka anyị "gbakwa mbọ ka e lee ihe ọ ga-apụta".
Mgbe o dooro anyị anya na ọ bụ eziokwu, ọtụtụ echeghị na ha ga-akpọkwa anyị. BBC kwa?
Ụlọọrụ nke ụwa niile ma ama na mgbasaa akụkọ ziri ezi?
Ha agaghị anabata ndị dịka anyị n'ọrụ.
Nkwa kwụrụ ọtọ
Dịka BBC anaghị alaghachị azụ na nkwa ha ịnabata ndị si ebe ọbụla, ọ bụkwa etu BBC Igbo dị.
Anyị sị ọtụtụ ebe, dị icheiche.
Okwu a bụkwa ihe na-edukwa anyị.
Ụlọọrụ BBC Igbo so n'otu ime ụlọọrụ asụsụ isii a malitere n'Afrịka makwa bụrụ otu n'ime ụlọọrụ asụsụ iri na abụọ ọhụrụ so na BBC World 2020 nke ọchịcụhị ndị Britain jiri nde narị iri na iteghete kwalite.
Igbo e ji eme ọnụ
Asụsụ Igbo bụ asụsụ mara mma n'ọnụ bụkwa asụsụ ụda, gwamgwamgwam, nke ilulu na-eso okwu juru n'ime ya! "Igbo si na ilulu bụ mmanụ Igbo ji eri okwu".
Igbo bụ asụsụ agba puruiche.
Anyị na-atụ anya n'iji hụ na anyị gosiputara ma kwalite agba di icheiche mere ka Igbo bụrụ asụsụ mara ezigbo mma, ma nọkwa n'ọkwa ya dịka otu n'ime isi asụsụ iri na otu dị na Naịjirịa.
Anyị bụ otu ndị gbasiri ike, n'omume ma n'akọ na uche.
Ndị na-agba ntaakụkọ n'ụzọ ziri ezi dịka ọ di na BBC kwa ụwa niile n'iji kọọrọ akụkọ ndị Igbo, n'olu Igbo makwa mekọta omenala Igbo na omenala mgbasa ozi site n'igwe mgbasa ozi ọhụrụ.
BBC n'anya anyị n'oge izizi
Mgbe anyị bịara ọhụrụ na BBC, ihe anyị buru ụzọ ghọta bụ na BBC nọ n'ụwa nke onwe ya, atụmatụ ebe igwe di ichiiche n'ụzọ ọrụ ndị ntaakụkọ puruiche.
N'ụlọọrụ nke Legọs, ebe ndị si mpaghara Naijirịa na-arụkọta ọrụ dịka etu anyị siri bikọta ọnụ dịka ndi agbataobi n'obodo Naịjiria.
Ebe a ka BBC Pidgin, BBC Igbo na BBC Yoruba na-arụkọta ọrụ.
Anyị dịka ndị si n'otu ezinụlọ
BBC dịka nnekwu na-elekọta ụmụ ya.
Ha nyere anyị nnukwu nnabata mgbe anyị bidoro ọrụ ebe a.
N'agbanyeghị na anyị na-asụ asụsụ dị icheiche, anyị bụ otu.
Na BBC, anyị na-arụkọta ọrụ dịka otu.
Ndị Yoruba na Pigdin sokwa n'asụsụ atọ a malitere nke ga-efenye ndị nkiri anyị na Naịjirịa na mpaghara ọdịda anyanwụ Afrịka nke ga na-arụ site n'otu ụlọọrụ.

Ebe foto si, BBC Igbo
Adimiche ndị otu kwesịrị ịbụ nsogbu bụ ngozi, dịka anyị ji ezigbo ọrụ, nkwanyere ugwu, ihunanya na nkwenye mee ngwa ọrụ anyị.
Ezigbo akọ ziriezi
Dịka nkwado kwesiri ekwesi, BBC jiri aka ha zụọ anyị n'ụzọ ndị ntaaakụkọ ha. Nke a ka anyị ga-eji ekele ha.

Akụkọ ndị ga-amasị gị:

Ọ bụ oge ọmụmụ etu anyị ga-esi gbasaa akụkọ n'asụsụ anyị.
Ndị nkuzi si BBC London bịara were aka anyị ma zikwa anyị ụzọ anyị kwesiri ji rụọ ọrụ.
Ha gbara mbọ hụ na onye ọbụla ghọtara ihe a na-akuzi.
Nke a bụ mbụ
Nke a ga-abụ nke mbụ anyị ga-anụ akụkọ Igbo kwụrụ ọtọ nke ya na-agbakwasaghị n'ụgha ga-amasị ndị ntoroọbịa na ụmụnwaanyị.
Dịka asụsụ ndị ọzọ so anyị bụ Yoruba na Pidgin, anyị enwela ohere ịkọwapụta akụkọ anyị ka o siri dị, ebe ndị na-ekiri maọbụ na-ege anyị bụ isi-ahụrụ-kwawa-okpu n'ihe ọbụla anyị na-eme.











