Ị mara ihe ọfọ bụ n'ala Igbo?
Ọfọ bụ osisi bara oke uru n'ala Igbo. Ọ bụ osisi jikọrọ Igbo ma mee ka Igbo guzosie ike.
Ọfọ bụ osisi pụrụiche maka na ndị Igbo na-akwanyere ya ugwu nke ukwuu. Ndigbo nyere ọfọ ikike dị egwu dịka ikike e ji ekwu eziokwu, ikike e ji ahụ na anaghị emegbu mmadụ.
Ọfọ bụ ihe a na-ahụ anya a na-eji na-egosipụta eziokwu maọbụ nkwekọrịta n'etiti ndị Igbo.
E nwere osisi a na-kpọ osisi ọfọ mana ọbụghị osisi ọfọ niile ka-eji eme ọfọ.
Osisi a na-eji eme ọfọ ga-eji aka ya daa n'ala mana ọbụghị ndị niile dara n'aka ha ka e jikwa eme ọfọ.
Ọ bụ nke jiri aka ya dara onwe ya kpọwa ụzọ abụọ, otu isi ya che n'ọwụwa anyanwụ, otu isi eche isi n'ọdịda anyanwụ, oge ahụ, a mara na ọ bụ ọfọ daziri adazi.
BBC Igbo gbara ndị mmaọdụ ajụjụọnụ ka ha kọwa ihe ọfọ bụ na ihe ọ pụtara n'ala Igbo.