Ndi uwe ojii: Oke bụrụ ọgwụike a furuefu

Ebe foto si, Getty Images
Ka ọ dị be oke, ka ọdị be ọgịnị. N'obodo Kwale nke mba Kenya, ndị uweojii atọ boro oke na ọ kpụrụ ọgwụike akpọrọ 'Bhang 540' nari ise na iri anọ nke e dokwara n'ogige ha maka iji mee ihe akaebe n'ụlọikpe.
Ndị uweojii atọ aha ha bụ Inspetọ Ken Olonde, onye bụ onye nchọpụta, AP Inspectọ Patrick Baya na Sagent Hamisi Komboaha bụ ndị akaebe n'ikpe ụmụnwaanyị anọ e jidere maka ibu ọgwụike ruru 1,710 site n'obodo Migori ga Ukunda nke dị na Kwale. Ndị uweojii a bụ ndị nwụchiri ụmụnwaanyị ndị a.
Mgbe ọ na agba ndị uweojii a ajụjụọnụ, onye ọkaiwu nọchitere otu na ndị eboro ebubo bụ Abdull Aminga jụrụ ndị uweojii ahụ ka ha kọwaa ihe mere na agba ọgwuike ahụ fọrọ sọọsọ 1,170.
Ndị uweojii ahụ kwuru na oke banyere n'oge ndị uweojii Kwale ebe e dotere agba ndị ahụ ma taa ha.
Mana ihe gbakwojuru ndị biara n'ụlọikpe ahụ nke onye Okaikpe Paul Mutai nọ n'isi ya bụ na onweghị ogehre dị na igbe anọ ahụ ebe ọgwụike ahụ dị.
Ọ bụ n'ọnwa Julai afọ garaaga ka ha nyụchiri Pauline Moraa, Elizabeth Atieno, Nancy Auma, na Mercy Achieng.






