Oji otu ụkwụ agba egwu
Ọtụtụ ndị mmadụ na Naịjira nwere ọrụsị na-eju n’okporoụzọ na-arịọ arịrịọ, mana Doris ekwenyeghi na nke a.
Ọ gwara BBC Igbo na ya agaghị esonye na ndi na-arịọ arịrịọ maka na Chukwu goziri ya.
Doris kọwara na ọ bụ ọgba tum tum kụrụ ya oge ọ bụ nwata ma gbajie ya ụkwụ nke mere na ndị dibia Bekee kwuru ka e bee ya ụkwụ.


O kwuru na ọ gbawara ya obi mana ya chọpụtara na ya bụ onye a goziri agozi maka na o nwere ndị enweghi ụkwụ maọbụ aka, mana ya nwere otu ụkwụ na aka abụọ.
Doris si na olileanya ya bụ ịbụ onye a ma ama n’ihe nkiri site n’ime ihe onyonyo nakwa na ịgba egwu nke ụkwụ ya anaghịakwụsị ya ime.
O mela ihe onyonyo ruru mkpụrụ anọ ebe ọ na-esonyekwa na ihe onyonyo egwu.


