Aghọgburu nwa m wee mịa ya ọbara - Oriaku Adesanya
Ọriakụ Nene Adesanya kọwara BBC Igbo etu Paul Achegbulu jiri ghọrịgbuo nwa ya nwoke ma mịrị "pint" ọbara anọ n'ahụ ya.
Nne kwuru na nwa ya nwoke dị afọ iri na asaa bụ onye lechara ule WAEC nke afọ a ka otu nwoke hụrụ n'ebe ọ na-ekiri bọọlụ kpọrọ ya gaa n'ụlọ Paul Achegbulu bụ onye mịrị ya ọbara.
O kwuru na ọ mịrị nwa ya "pent" ọbara anọ n'ime otu ọnwa nke mere nwa ya jiri daa dịka o si n'ụlọ Achegbulu na-apụta.
Nene kwuru na ọ bụ ndị enyi nwa ya kpọrọ ya gawa n'ụlọọgwụ tupu ọ na-ata ozi ihe na-eme.

Akụkọ ndị ga-amasị gị:
