IPOB: Okwu Miyetti Allah bụ ịma aka mgba

Ebe foto si, Getty Images
Otu na-agba mbọ maka nnwereonwe Biafra bụ Ipob ekwuola na okwu Miyetti Allah bụ otu na-anọchite ndị ọchị-ehi kwuru bụ okwu ha chọrọ iji maja ma yie ndị Igbo na ndị ọzọ sị ọwụwa-anyanwụ bị n'ugwu-awụsa egwu.
N'ozi nke odeakwụkwọ mgbasa ozi otu Ipob bụ Emma Powerful zitara BBC, Ipob kwuru na okwu ahụ bụ okwu dị ime ma marakwa ọgọdọ n'ihi ọ bụ mba ọgụ etinyere ọnụ n'ime akpa were na abaa.
Ha kwuru na ha agaghị agba nkịtị ka o mezuo n'ihi na ha dị njikere ịwanye ndị ọbụla wakporo ndị sị ọwụwa anyanwụ na ọdọ-ahịa ha ji ọkụ n'aka.
"Anyị chọrọ ime ka odoo anya na iko ndị ọbụla mekatara wakpo ndị Igbo ọbụla maọbụ ahịa ha dị n'ugwu-awụsa ji manye ka anyị ga-eji manyere ha."

Akụkọ ndị ga-amasị gị:
N'ọsịsa ha nyere n'ụbọchị Wenezde banyere mkpebi ndị gọvanọ ọwụwa-anyanwụ na ha agaghị enye ha ala maka iwu ọdọ-ehi, otu Miyetti Allah kwuru na ọ tụrụ ha na anya na ndị gọvanọ nwere ụdị mkpebi ma kwuo na o kwesiri ka ha bụrụ ndị na-atọ ezi mkpụrụ dịka ndị Igbo bikwa na mpaghara ndị ọzọ na Naijiria.
Ndị otu Ipob kwuru na mkpebi ndị Gọvanọ ọwụwa-anyanwụ bụ iji gbochie ọgbaghara ma bụrụkwa ihe kwesiri na otu nọchitere ndị ugwu ( Arewa) na ndị chọrọ udo na Naijiria kwadoro.




