Daalụ maka isonye na mgbasaozi anyị taa
Ekele anyị na-agara gị maka isonyere anyị.
Ụbọchị nta ka a chụọ n'owere nchị.
Ụbọchị a nụrụ egbe mbụ ahụ malitere agha Biafra nke a lụrụ rue afọ atọ.
Chimezie UcheAgbo
Ekele anyị na-agara gị maka isonyere anyị.
Ụbọchị nta ka a chụọ n'owere nchị.
Taa bụ afọ 51 kamgbe egbe mbụ bidoro agha Biafra dara.
Otutụ mmadụ ọkachasị ndị ntorobịa ka kwuru na ha na-achọ agha mana ndị hụrụ agha achọghị iji ntị nụ ya.
Ndị okenye Igbo ekwuola ka ndị niile na-achọ Biafra bịakọta ọnụ ka e jiri nwayọọ na-achọ ya karịa tinguo zọgbuo.
Onye oti egwu a ma ama bụ Illbliss nwere kwuru ka Biafra bụrụ inyere nwanne gị aka dịka onye Igbo ma hụụ nwanne gị n'anya.
Ụfọdụ ndị ọnụ na-eru n'okwu dịka nwaada Chimamanda Ngozi Adichie etinyela ọnụ n'okwu Biafra.
O kwetara n'ezie na a na-emegbu ndị igbo na Naịjirịa mana echiche ya bụ na nkewa agaghị ebi nsogbu ahụ.
Ọtụtụ ndị Igbo apụtala kwuo na ihe kpatara agha Biafra na Naịjirịa akwụsịbeghi maka na ọnọdụ ndị igbo adịbeghi mma.
Ndị igbo na-ebe nwịị maka na mmegbu butere agha Biafra ka na-aga n'ihu.
Ndị Igbo kwuru na ọ na-abụ e buru ozu onye ọzọ, ọ dịka e bu ukwu nkụ.
Ọtụtụ Ndị igbo na-akpọ ka e kewapụta Biafra maọbụ e nwee agha ọzọ, mana otu onye hụrụ agha nke mbụ mara ihe ọ hụrụ.
Okey Ndibe bụ onye hụrụ agha Biafra dịka nwantakịrị ka chetara ihe ọ hụrụ.
Ndị hụrụ agha Biafra achọghị ịhụ ya ọzọ maka ụdị ihe ha gabigara.
Mana ọtụtụ ndị ntorobịa na-ekwu na ha chọrọ agha ọzọ.

Ebe foto si, Getty Images

Ebe foto si, Getty Images
Ka a lụsịrị agha Biafra, gọọmenti Naịjirịa kwuru na o nweghi onwe meriri maọbụ onye e meriri nke a kpọrọ 'No victor, no Vanquish" na Bekee.
E bidoro atụmatụ a kpọrọ '3 Rs' iji we mezie ihe e mebiri n'agha. 'R' ndị a bụ n'olu Bekee: 'Reconcialition, Reconstruction na Rehabilitaion'
Ihe e nyere ndị Igbo bụ "pound iri abụọ" agbanyeghi ego ole ọbụla i nwere n'ụlọ akụ.
Ndị igbo kwuru na ihe a mere ndị Igbo jiri daa ogbenye wee bido ụwa n'isi.

Ebe foto si, AFP

Ebe foto si, Evening Standard
Chukwuemeka Odumegwu Ojukwu duru ndị igbo n'agha Biafra.

Ebe foto si, Getty Images
Otu ihe ịtụ n'anya n'agha Biafra bu na agbanyeghi na e nwere ihe a kpọrọ agha ime ụlọ bụ 'Cold War' na Bekee na mbaụwa oge ahụ, mba Briten an Russia kwụnyere ndị Naịjirịa megide ndị Biafra ebe Frans na Izrel kwụnyere ndị Biafra.
Ụfọdụ mba ndị ọzọ kwadokwara Biafra site n'izite nri na ngwọagha nakwa nnu na ihe ndị ọzọ oge agha.

Ebe foto si, Getty Images
Ụfọdụ ndị hụrụ agha nọ na BBC Igbo ugbua na-ekwu ihe ha hụrụ oge agha.
Oge agha Biafra bidoro, ndị agha Biafra juru ụgbọala ruru otu narị wee gafee oshimiri Naịja banye n'Asaba ebe ha bidoro inata mpaghara ahụ.
Ha natara Asaba, Wọrị, Benin n'ụzọ Legos mana ha laghachiri azụ.


Chukwuemeka Odumegwu Ojukwu bụ onye ndu ndị Igbo n'oge agha gbalara n'Okịgwe dị n'Imo steeti ebe ọ rụrụ ebe nchekwa a kpọr bọnka Ojukwu.
Ebe ahụ ka ọ nọ na-eme mgbasaozi Biafra n'igwe redio a kpọrọ Radio Biafra.
Lee anya ka ị hụ ihe dị n'ime bọnka Ojukwu.
Agha tisara ezinaụlọ, tisaa obodo tisaa ala Biafra niile.
Ndị mmadụ gbara ọsọ na-eleghi anya n'azụ.
Ọ dịka onweghi ebe nchekwa dị maka ndị bi na mpaghara ugwu gbara ọsọ gbalata ala Igbo maka mmemina bidoro ebe ahụ n'afọ 1966 ebe e gburu bido na mmadụ puku asatọ rue otu narị puku ọtụtụn'ime ha bụ ụmụaka.
Mana na 1967, nchekwa adịghịkwa n'ụlọ maka na ndị agha Naịjirịa ejula ebe niile n'ala Biafra.

Ebe foto si, Getty Images
Ndị ndekọ kwuru na ihe ruru malite na mmadụ puku narị ise rue na otu nde ụmụ Biafra nwụrụ site n'agụụ n'oge agha ahụ.
Nke a bụ maka na e gbochiri ụzọ e si ebubatara ụmụ Biafra nri nke mere na ọtụtụ ụmụaka nwụrụ site n'ọra kwashiọkọ ebe ndị ọzọ ndị okenye nwụrụ n'agụụ.
Nke a agụnyeghi ndị nwụrụ n'agha ahụ nke e kwuru ruru otu narị puku mmadụ.

Ebe foto si, Getty Images
Ndị agha natara ọchịchị n'aka Tafawa Balewa nke mere e ji tinye Major General Thoma Umunnakwe Aguiyi-Ironsi n'ọchịchị.
Mana ọchịchị ya anọteghi aka ebe ndị agha nakwara ya ọchịchị n'ike ma gbuo n'ọnwa Julai afọ 1967.
Ọnwụ ironsi na ndị Igbo ndị ọzọ e gburu na mpaghara ugwu mere Chukwuemeka Odumegwu Ojukwu jiri kwubie mba Biafra ụbọchị May 30 1967.

Ebe foto si, Getty Images
Egbe mbụ a gbara malitere agha Biafra n'afọ 1967 bụ n'obodo Bekwarra dị na Krọs Rịva steeti ka a gbara ya.
Ndị agha Naịjirịa oge ahụ agbaala ala Biafra gburugburu ebe mkpamkpa nọ na-akpa na mpaghara ugwu.

Ebe foto si, Getty Images
Anyị na-anabata unu na mgbasaozi a anyị na-eme taa.
Mgbasa ozi a bụ gbasara agha Biafra nke bidoro ụbọchị taa afọ 51 gara aga.