Enyi azọgbuola ndị na-ese foto na Bauchi

Enyi

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Enyị azọgbuola ọtụtụ ndị mmadụ na mpaghara ụwa dị iche iche
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 1

Enyi nọ n'ogbe ụmụanụ nke Yankari dị na Bauchi steeti azọgbuola otu nwata na otu okenye.

Ndị ọrụ ngalaba nchekwa ụmụ anụ na Yankari kwupụtara nke site n'ọnụ onyeisi ha bụ Habu Mamman, ma kwuo na ihe a mere mgbe ndị a na-ese ọtụtụ enyi pụtara n'obodo foto.

O kwuru na nke a mere n'obodo Bajama bụ ebe enyi ndị a gara mkpagharị n'isi ụtụtụ, mgbe ndị obodo hụrụ ha n'obi ụtọ were ọsọ gara ise ha foto.

Dịka ndị mmadụ gbara enyị ndị a gburugburu, enyi ndị a were iwe tisasịa ndị mmadụ, onye ọbụla gbara ọzọ ma otu nwata akpọrọ Fa'izu Chiroma Musa dị afọ itoolu dara n'ala.

Enyị ahụ rịkwara sịrị Musa n'elu ma zọgbuo ya. Mana nke emeghị ka ndị mmadụ kwụsị isogharị enyi ndị n'ọdụ.

Dịka otu nwoke akpọrọ Haruna Abubakar gara enyi ndị nso ka o sete foto, otu n'ime enyi ndị a kuturu ya n'ala ma kagbuo ya.

Enyi

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Ndị mmadụ na-ahụta enyi dịka eze ụmụanụ niile

Ọ bụla ndị ọrụ nchekwa ogbe ụmụanụ ndị a bịara jisie ike chụba enyi ndị ahụ mgbe ọtụtụ oge gachara.

Gọvanọ Bauchi steeti bụ M.A Abubakar etiela ezinaụlọ ndị nke a metụtara n'obi ma kwuo na-ekwesiri ịhụta ihe ndị a dịka anụ ime ọhịa.

Skip X post
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post

Akara ntụ-ntụ

Akụkọ ndị ga-amasị gị:

Akara ntụ-ntụ