Nwamba buru amụma na Argentina ga-emeri Naịjirịa anwụọla

Baidian'er

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Ndị Naịjirịa na-eweso Baidian'er ezigbo iwe

Nwamba ahụ na-ahụ ụzọ gbara ama na otu Super Eagles nke Naịjirịa agaghi eru agba nke anọ n'asọmpị iko mbaụwa na Russia anwụọla.

Ndị na-ele ya anya kwuru taa na ọ bụ oti gburu nwamba a aha ya bụ Baidian'er.

N'elu sosial midia na mba China, puku karị puku mmadụ apụtaala na-ebe akwa n'ihi na ọnwụ nwamba a metutara ha n'obi.

Baidian'er bụ nwamba na-agagharị n'ulọ ndebe ihe ochie nke akpọrọ Palace Museum, ebe a ka ha nyere ya nrị n'efere abụọ.

Ha ga-atudo ọkọlọtọ -- bụ ihe Bekee kpọrọ flag -- nke ala ọbụla na-asọmpi n'akụkụ efere abụọ a.

Efere ọbụla Baidian'er si na ya rie ga-abụ mba ga-emeri n'asọmpị ahu.

Baidian'er gbaziri nke ọma n'asọmpi isi agbara n'iko mba ụwa.

Mana mgbazi o mere na Argentina ga-emeri Naịjịrịa bụ nke ikpeazụ o mere.

Mgbaama ihe ọjọọ

Lee anụmanụ ndị ọzọ na-ahụ ụzọ nakwa gbazie nke ọma anwụchaala.

Paul

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Anụmaanị dị iche iche dika Paul na-agbazie asọmpi iko mba ụwa

Na Japan, Rabio bụ anụ mmiri ahụ Bekee kpọrọ octopus na-agba ama maka onye ga-emeri asọmpị ọbụla nwuru oge onye nwere ya rere ya.

Onye zụrụ Rabio jie nwere mee nrị akpọrọ sashimi n'ala ha.

Ị chetara Paul?

Paul bụkwa anụ mmiri ọzọ bụ octopus na Bekee.

Ọ bukwa anamaanụ na-agbazịe nke ọma n'asọmpi iko mba uwa nke garaaga.

Paul nwụrụ na ọnwa ọktoba nke afọ 2010.

Akara ntụ-ntụ

Akụkọ ga-amasị gị

Akara ntụ-ntụ