Ndị na-apụ na APC bụ akwụna ndọrọndọrọ ọchịchị -Joe Igbokwe

Ebe foto si, Getty Images
Ndị otu pati APC ekwuola na ha anaghị atụfụrụ ndị kewapụrụ na patị ha ọnụ maka na ha adịghị mkpa ọbụla.
Onye kwuru nke a bụ onye nkwuchiteọnụ APC na Legos steeti bụ Joe Igbokwe.
Igbokwe gwara BBC Igbo na pati ha anaghị ekwu ihe ọbụla gbasara ndị ahụ maka na ha achọghị inye ha ohere iche na ha bara uru maọbụ na ha dị mkpa.
Cheta na otu pati nọ n'ọchịchị na Naịjirịa a na-akpọ All Progressives Congress (APC) kewara ụnyaahụ ebe e kewapụtara otu a kpọrọ R-APC nke Buba Galadima bụ onyeisi ha.
Ndị kpokobara otu ọhụrụ ahụ bụ ndị obi adịghị mma nọ na APC nke ọtụtụ n'ime ha nọ n'ụlọomeiwu.
Onyeisi otu ọhụrụ ahụ bụ Galadima gwara ndị ntaakụkọ n'Abuja ụnyaahụ na ihe ha jiri kewapụta otu ọhụrụ ahụ bụ na otu pati APC adaala.
N'okwu ya, ọ kọwara APC dịka; "Ha anaghị eme nke ọma cha cha, ha agaghị emeli ihe ga-egosi ezi ọchịchị.
"Ọ na-ewute anyị na anyị na-ekwu na karịa afọ atọ, a tufuola olileanya anyị. Ndị APC nọ n'ọchịchị amaghị ihe ha na-eme maka na ha ji onye erughi eru achị na-agaghị enyeli ụmụ Naịjirịa ihe ha chọrọ n'ezi ọchịchị.
"Karịa, ha tinyere onye aka ike na-anaghị erubere iwu isi ma na-enupu isi nye iwu Naịjirịa cha cha.
"O nweghi ike ichekwa ụmụ Naịjirịa ma nye ha ihe na-edozi ndụ ma na-eme ka nkewa na ịma mmadụ bawanye ụba nke na-ekweghizi anyị nnabata. Ndị APC eweghizi ike ime ihe ha kwere ụmụ Naịjirịa na nkwa.
"Onweghi kwanụ ihe gosiri ikike n'etiti ndị ndu anyị imezi patị anyị ebe ndị mepụtara pati anyị na-eme ka ndị Naịjirịa ji ha ụgwọ vootu."
Galadima bụ onye ekwetabughi n'ụfọdụ ihe n'ọchịchị Buhari kwuru na ọgbakọ pati APC mere na ngalaba dị icheiche na Naịjirịa n'oge na-adịghị anya gbasara agbasa maka na "e ji aka ike mee ya."

Ebe foto si, @AsoRock
Galadima bụ onye bubu odeakwụkwọ pati Congress for Progressive Change (CPC) bubu pati onyeisiala Muhammadu Buhari bere arịrị na gọọmenti APC bụ "nnukwu ọdachi" karịa gọọmenti nke ha nọchiri."
O kwukwara na pati ahụ na-enwu ọkụ maka na e nwere ọtụtụ ikpe nọ n'ụlọikpe n'ala niile nke na-anwale ọgbakọ ha mere na steeti niile.
O kwuru na nsogbu dị na pati APC mere ọtụtụ ndị mmaọdụ jiri mee ọgbakọ nke ha oge a na-eme ọgbakọ pati ahụ na steeti dị icheiche ruru 24 dịka: Abia, Adamawa, Bauchi, Bayelsa, Benue, Borno, Cross River, Delta, Enugu, Imo, Jigawa, Kaduna, Kano, Katsina, Kebbi, Kogi, Kwara, Lagos, Niger, Ondo, Oyo, Rivers, Sokoto na Zamfara.
Otu ọhụrụ R-APC gụnyere ndị nọbu na pati APC gụnyekwara ndị si otu NPDP, CPC, ANPP, ACN na ndị ọzọ.

Ihe APC na-ekwu maka ya
Onye nkwuchiteọnụ APC na Legos steeti Joe Igbokwe gwara BBC Igbo na ndị ahụ na-apụ bụ ndị a na-achụ maka mpụ chọrọ ka a kwụsị nyocha ha ma na onyeisiala agaghị akwụsị.
O kwuru na ndị ahụ chọrọ ka ha jide ndị APC na njọ mana APC adịghị ka patị ndị ọzọ; "Onweghi onye ga-ejili anyị na njọ."
N'okwu Igbokwe; "Agaghị na akwagharị anyị aka nri aka ekpe, elu na ala, ihu na azụ, APC abụghịkwa PDP."
Oge BBC Igbo jụrụ ya na ndị ahụ sikwa pati ndị ọzọ banye APC, o kwuru; "Ama m nụ, ha abụzị akwụnakwụna, ị gaa ebe a, ị gaa ebe a, ị nọrọ, oge niile, ị na-agbagharị."
Igbokwe kwuru na ọ bụ eziokwu na APC dịka pati ọbụla chọrọ mmadụ mana ha achọghị "Ndị ohi na ndị ama."
N'okwu ya; "Ndị ohi na ndị ama agahị egosi gị ụzọ ị ga-esi, ha bụ ndị kpuru isi, kedụ ka onye kpuru isi ga-esi gosi gị ụzọ ị ga-esi?"
Igbokwe kwenyesiri ike na ọpụpụ ndị ahụ agahị emetụta ha na ntuliaka 2019.










