Abaribe kwuru na 'Buhari adịghị ike ọrụ'
Akụkọ ndị kachasị mkpa mere taa n'ichafu:
Okwu Sịnetọ Abaribe gwara Onyeisiala Buhari
Ndị Ụlọomeiwu ukwu nwere ọgbaghara n'etiti ha taa mgbe Sịnetọ Enyinnaya Abaribe nke Abia Steeti kwuru na onyeisiala Mohammadu Buhari adịghị ike ọrụ.
Abaribe rụtụrụ aka n'okwu onyeisiala kwuru na Lọndọn na ọ bụ ndị si mba Libịa butere ogbugbu dị n'etiti ndị ọchị ehi na ndị ọrụugbo.

Ebe foto si, Getty Images
INEC ekwupụtala ngwa ha ji eme ntuliaka 2019
Onyeisi ụlọọrụ INEC bụ Mahmood Yakubu ekwuola na ụlọọrụ ahụ agaghị eji ngwa electronic eme ntuliaka afọ 2019, kama ha ga-eji technụzụ maka ịgụkọ na ngọsịpụta ntuliaka ahụ.
Yakubu kwuru nke a na mmechi ọgbakọ emere maka iji technụzụ eme ntuliaka na Mba Afrịka niile.

Ebe foto si, Getty Images
Akụkọ ndị ga-amasị gị:
Okwu Emmanuel Macron gbasara mwakpo Sirịa
Onyeisiala mba Fransị bụ Emmanuel Macron ekwuola na onwere ihe ngosi na gọọmenti mba Sirịa jiri ngwagha kemịkal wakpoo obodo Douma.
Macron kwuru na ọ ga-ekpebi mgbe ọ ga-eji ngwaagha ụgbọelu wakpọ Sirịa na nzaghachị.

Ebe foto si, AFP
N'egwuregwu
CSKA Moscow ga-ele Arsenal ọbịa n'ukwu abụọ nke asọmpi Uefa Europa n'abalịa.
Cheta n'ụkwụ nke mbụ, Arsenal jiri ọkpụ anọ asatara otu merie ndị CSKA Moscow n'asọmpi ahụ.

Ebe foto si, Getty Images
Nkeji nke mgbede a
Gere akụkọ ndị a n'otu nkeji.
Ihe onyonyo taa
Kelechi Amadi-Obi bụ onye ose foto ama ama gwara anyị n'ime onyonyo a, ihe ị kwesiri ị ma, ma mee maọbụrụ na ị chọrọ ka ị dịka ya dika onye osefoto.











