Kedu ihe mere ndị egwuregwu Afịrịka ji agbafu n'ofesi?

Ebe foto si, Getty Images
Ụnyaahụ bụ ụbọchị 11 n'ime ọnwa Maachị, ndị otu mba kamerụn kwuru na ha na-achọ ndị egwuregwu ha a ruru 8 so ga Australia maka egwuregwu Commonwealth.
Ha kwukwara na ọ dịka ndị a "gbafuru" ma kwuo na ha agwala ndị uweojii mba Australia maka ihe a mere.
BBC Igbo kpọrọ ndị egwuregwu dị icheiche maka ị chọpụta ihe mmere ọtụtụ ndị egwuregwu na-agbafụ oge niile ha gara ala bekee maka i so n'asọmpị egwuregwu ọbụla.
Onye ọgba bọọlụ Super Eagles n'oge gara aga bụ Emmanuel Babayero gwara BBC na ihe a na-eme maka ndị a ahụghị ala nna ha n'anya.

Ebe foto si, Getty Images
N'ọnụ okwu ya: "gọọmentị ala dị icheiche n'Afịrịka kwesiri ị na tinye n'ime obi ndị mmadụ ihunanya gbasara ala ha."
Mana Enefiok Bassey bụ onye nkuzi ndị obu igwe nwere atụmatụ ọzọ ọ sị bụ ihe patara ihe a.
O kwuru n'ugbua ndị egwuregwu n'Afịrịka na-ata ezigbo ahụhụ.
Bassey kwuru na: "ọtụtụ n'ime ndị egwuregwu a enweghị ego ị rị nri ọbụla, ya mmere oge ọbụla ha nwere ohere ị ga ala bekee maka egwuregwu ọbụla ha na-agbafu."
Usoro dị mma ị ga-esị eme ya
Otu onye na-agbasa ozi gbasara ihe egwuregwu bụ Niran Adesanya kwuru na onye egwuregwu ọbụla chọrọ ịnọchite anaya mba ọzọ, nwere ike ime ya site na n'usoro igafe nke Bekee kpọrọ "defection".
Adesanya kwuru na: "ihe a ga-abụ nkwerikọta otu egwuregwu ala ha na ala ndị ọzọ nwere. Ọ ga-abụkwa nke a tinyere aka n'akwụkwọ. Ihe a bụ ihe ha na-eme eme."

Akụkọ ndị ga-amasị gị:









