Ntuliaka ime ụlọ APC ataala isi mmadụ abụọ

Ndị Ekiti pụtara maka ntuliaka

Ebe foto si, Abdullahi Garba Birnin Kudu

Nkọwa foto, Ndị nọ ebe e mere ntuliaka ahụ n'Ekiti
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 1

Ogbaghara pụtara na ntuliaka ime ụlọ APC mere eriele isi mmadụ abụọ, otu na Legos nke ọzọ na Delta steeti.

Akụkọ ka na-apụta maka onye nwụrụ na Legos ebe otu nwoke bụ Jeremiah Ojeveta n'azọ ọkwa Chairman na Delta nwụrụ site n'ọgbaaghara taa.

A kagbukwara ntuliaka nke APC mere n'Ekiti maka iji wepụta onye ga-anọchite anya ha n'ọzịzọ ọkwa gọvanọ steeti ahụ n'ọnwa Julai.

Akụkọ so ntuliaka a bụ na ọgbaaghara dapụtara dịka ndị omekome ji egbe dabatara n'ebe ahụ, ebe ụfọdụ mmadụ na-alụ ọgụ.

Dịka ụlọọrụ ntaakụkọ Cable siri kọwa, ụfọdụ ndị n'azọ ọkwa nnọchite anya a n'ime otu APC were iwe si n'ebe a na-eme ntuliaka pụọ, dịka kọmitii chịkọtara ntuliaka ahụ na-ekwu na o nweghi onye meriri.

Otu APC mere ntuliaka imeụlọ na mpaghara dị icheiche na Satọde maka ịhọpụta ndị ga-achị wọọdụ ga n'ala Naịjirịa.

Skip X post
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post

Kọmiti na-achịkọta emume a na ndị niile na-azọ ọkwa ahụ kwekọrịtara n'ime onwe ha ịkagbu ntuliaka a.

Ọgbọ ebe emere ntuliaka ahu mmiri dọ na ya

Ebe foto si, Abdullahi Garba Birnin Kudu

Nkọwa foto, Ọ fọdụrụ ka ebugharịa ụbọchị ntuliaka a maka oke mmiri zoro n'ụtụtụ
Akara ntụ-ntụ

Akụkọ ga-amasị gị

Akara ntụ-ntụ

Ebe foto si, zz