Akụkọ ndị dị mkpa na mgbede a: ọgbaaghara dị na Delta steeti ugbua
Akụkọ ndị dị mkpa n'abali a:

Ebe foto si, @officialAPCNG
Otu nwoke anwụọla na Delta steeti ebe a na-eme nzụkọ otu ndọrọndọrọ APC.
Akụkọ na-eru anyị ntị bụ na a sụ gburu Jeremiah Ojeveta so na ndị na-azọ ọkwa chairman n'agba Ughelli ka nzụkọ ahụ na-aga niru.
Na APC ọzọ
Ntuliaka jisiike na-aga n'ọgbakọ APC nke Ekiti maka ị ma onye ga-anọchi anya ha ntuliaka nke ọkwa Gọvanọ n'abịa n'ọnwa Julai.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post
Oke mmiri ozuzo meburu ka ọ ga-akwasa ntuliaka a.
Na mba Ofesi

Ebe foto si, Reuters
Agbaala otu nwata nwaanyị dị afọ iri n'isii ọkụ ebe awakpochara ya na India.
Ụmụ nwoke abụọ a tụrụ aka na ha wakporo ya mere nke a maka iwe ihe nne na nna nwata nwaanyị ahụ jiri gwa ndị isi na ọ bụ ha wakporo nwa ha.
Egwuregwu

Ebe foto si, Getty Images
Otu bọọlụ Stoke city apụọla na asọmpị Premier League.
Nke a mere ebe otu Crystal Palace meriri ha n'asọmpị ha gbara taa. Cheta na Stoke City nọrọ na Premier League ihe ruru afọ iri kemgbe 2008.
Gee akụkọ kachasị mkpa na mgbede a:











