Gọọmentị mba Burundi agbachile ụlọọrụ ntaakụkọ BBC

Ebe foto si, Getty Images
Ụlọọrụ na-achịkọta mgbasa ozi na Burundi bụ NCC n'aha ịchafụ kwuru na ha mechiri ụlọọrụ BBC maka ebubo ị da iwu mgbasa ozi.
Ha kwuru n'ime akwụkwọ ha depụtara na BBC kpọpụtara otu onye na-akparị ala Burundi n'elu otu ihe emume ha.
Ụlọọrụ ntaakụkọ ọzọ ha mechiri bụ Voice of America maka ị gbasa ozi na-atụmatụ iwu ala Burundi machiri amachi.
N'ime akwụkwọ ahụ ha dọkwara ụlọọrụ ntakụkọ bụ Radio France International aka na ntị ha kpachara anya maka ụzọ ha sị enyocha akụkọ ha na-agbasi.
Nke a na-abịa ebe ọ fọrọ izuụka tupu Burundi eme ntụliaka ị mara ma a ga-adọtị oge onyeisiala Burundi ga-anọ n'ọrụ.
Lee akwụkwọ ahụ edepụtara n'asụsụ French:
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post
Onyeisi BBC n'Afịrịka bụ Solomon Mugera ekwupụtala okwu gbasara akụkọ a.
Mugera sị na mgbachị a adịghị BBC mma n'obi, ọ sị "gọọmentị Burundi agwala anyị maka otu ajụjụ ọnụ anyị mere n'elu igwe okwu ndị French amasịghị ha"
Ọ sị na ha ga-eme nyocha ma zakwa gọọmentị Burundi aziza maka okwu a nakwa "o nwee akụkọ anyị mebiri iwu anyi ga-enyocha ya ọfụma"

Akụkọ ga-amasị gị











