Ndị ntaakụkọ Naịjirịa e nwerela onwe ha?

Ebe foto si, Getty Images
Ụfọdụ ndị ọrụ mgbasa ozi na Naịjirịa ekwuola ha e nwechaghị onwe ha n'ọrụ ntaakụkọ.
Ụbọchị atọ n'ime ọnwa Mee, ọbụla bụ mgbe eji echeta nwere onwe ndị ntaakụkọ na mbaụwa niile.
Ọ bụkwa ubọchị dị otua ka eji echeta ndị dika Ahmad Shah, onye ntaakụkọ BBC egburu ebe ọ na-arụ ọrụ ya dịka onye mgbasa ozi na-azọ nwere onwe ndị ọzọ.
Onye mgbasa ozi ka na-eto bụ Christian Agadibe kwuru na ya bụ ọru kwuru na ọtụtụ ihe dị iche dị na mgbasa ozi mgbe gboo na nke ụgbụa.
O kwuru na nke kachasị nke bụ otu ụzọ mgbasa ozi ọhụrụ akpọrọ Soshal midia si enyere ya na ndị otụ ya aka n'igbasa ozi ka eme ka ihe na-emebi ihe n'obodo pụta ihe.
Agadibe kwukwara na ihe kachasị ya mkpa ụgbua dika onye mgbasa ozi bụ ka ndi nwee ụlọ ọrụ mgbasa ozi nwee ihe ndị oyibo kpọrọ 'insurance' maka onye ọbụla na-arụrụ ha ọrụ.
Gere ihe okwuru ebe a n'uju:
N'otu aka ahụ onye ọkachamara na mgbasa ozi bụ Maazi Okey Ifionu na-ekwu na onyeisiala Naijịrịa bụ Muhammadu Buhari anaghị akwado ndị ntaakụkọ.

Ebe foto si, Getty Images
O kwuru na ọtụtụ ndị mgbasa maọbụ mmadụ kwuputere uche ha maka ọchịchị abaala nga maọbụ nwee mmegide site n'aka ndị na-akwado Buhari.
Ọ dụrụ ndị mgbasa ozi na-etolite ka ha ga -azụgharịa onwe ha n'ihe gbasara kọmpụta,ka ha nwee ike runwoo n'ụlọ ọrụ mgbasa ozi ndị agbara ọhụrụ.
Gere ihe okwuru ebe a n'uju:
Lee ihe anọ na-akpa ndị mgbasa ozi Naịjirịa.
1.Ugwọ ọnwa.
Ha na-ayọ ka etinyere ezigbo ego na nke ha na anata maka oke ọrụ na-eyi ndụ egwu ha na-arụ.
Ha chọkwara ka akwụsị iji ha ụgwọ.
2.Nchekwa.
Ndị mgbasa ozi chọrọ ka enye ha ezigbo nchekwa nke a nakpọ "insurance" n'olu bekee.
Ọtụtụ n'ime ha na-ekwu na ha ga-iweta ufọdụ akụkọ, ha amaghị ihe ga-eme ndụ ha nakwa nke ndị be ha.
3.Nwere onwe.
Ha chọrọ nwere onwe n'igbasa ozi ga-edozi obodo ma kpụghe ihe ọjọ na-eme ebe ahụ.
4.Nkwụsị mmerụaka.
Site na mmerụaka dị n'etiti ndị nọ na ọchịchị ụlọ ọrụ mgbasa ozi,ndị na-etolite na-ekwu na ọ naghi enye ha ohere eme mgbasa ozi ziri ezi maka na ndị isi ha na ndị nọ na gọọmentị na-adị na mma.

Akụkọ ndị ọzọ ga-amasi gị:











