Naanị onuku ga-ekweta na Buhari emela ọfụma - Obasanjo

Ebe foto si, Getty Images
Onye chịburu Naịjirịa bụ Olusegun Obasanjo agọnarịala ịkwado Onyeisiala Buhari Muhammadu.
Okwuru na naanị ndị bụ onuku ga-ekwete na Buhari emela ọfụma n'obodo Naịjirịa.
Obasanjo kwuru nke a iji gọnarị akụkọ na-agagharị na sọshal midia na ya na-etozi Buhari n'ihe ọ na-arụ.
O boro okwu a n'isi ndị na-edufu Buhari nakwa ndị na-achọ ka ọ banye ọchịchị n'ụzọ ọbụla.
Obasanjo kwuru na kama ndị na-akwado Buhari ga-agba mbọ dozie akụnaụba obodo, ha na-ebugharị okwu ụgha.
N'okwu ya,"Agaghị m akwado ọdida. A tụgharịbeghị m n'akwụkwọ m degara Buhari n'ọnwa Jenụwarị 23 nke afọ a."
Ndị obodo ma na m kwuputara maka ụbịam, ebighi n'udo, ya na ihe dika mgbasa Naịjirịa nke adighi ike ọchichị Buhari butere.
"Aga m na-ekwuputa ihe dị n'obi m. Onweghị okwu ụgha ọbụla nwereike ikwusị ndị Naịjirịa ịchọta ọnye ọchịchị ọhụrụ."

Gbasara nzukọ Donald Trump na Buhari mere n'oge na-adighị anya,Obasanjo kwuru na ọ huru isiokwu ato ndị a:
- Ndị mba Amerika ga na-ewetu aka n'izụta mmanu agbịdị n'aka Naịjirịa nke o na-enweghị ihe Buhari ga-emenwụ maka ya.
- Ndị mba Amerika ga-atụbata ihe ọkụkọ ubi nke Buhari ga-akwado.
- Ndị ọchịehị na-egbu ụmụ mmadụ na Naịjirịa bụ Gaddaffi zụrụ ha mana onweghi ihe Buhari ga-emenwụ maka ya.









