ILO: Pasent 60 ndị na-arụ ọrụ na-arụ na nke onwe ha

Ụbọchị ndịọrụ

Ebe foto si, @AsoRock

Nkọwa foto, Osote onyeisiala nọnyere ndị ọrụ n'ụbọchị

Nchopụta otu ndịọrụ nke mba ụwa bụ International Labour Organisation na bekee (ILO) n'aha ịchafụ mere, kwuru na ihe karịrị pasenti 60 na ndị na-arụ ọrụ na Naijiria nọrọ onwe ha.

ILO kwuru na ọ bụ ịrụ ọrụ n'ọnọdụ ahaziri ahazi bụ ụzọ kachasị mma.

Nchopụta ahụ nke a kpọrọ: "Ụmụnwaanyị na ụmụnwoke ndị na-arụrụ onwe ha: ihe ọnụgụgụ ya gosiri" gosiri ka ọ siri gbasara akụnaụba obodo na ọnọdụ ndị ọrụ nọrọ onwe ha n'ihe karịrị obodo otu narị.

E wepụ ọrụugbo, ọkara ndị na-arụ ọrụ bụ ndị nọrọ onwe ha.

N'Afrịka, pasent 85.8 ndị na-arụ ọrụ bụ ndị nọrọ onwe ha.

N'Asịa, ha dị pasenti 68.6, na mba ndị Arab pasenti 68.6, na Amerịka, pasenti 40, na mba Europe na sentraalụ Asia pasenti 25.1.

ILO kwukwara na ndịọrụ na-arụrụ onwe ha na mba na-emepe emepe dị pasenti 93.

Ndị ọrụ nọrọ ọnwe ha bụ ụmụnwọke pasenti 63.0 , ebe ndị nwanayị ndị pasentị 58.1.

Akụkọ ga-amasị gị: