Ọ bụghị eziokwu na anyị machiri inye ndị Ọwụwa Anyanwụ akwụkwọ njirimara

Nchịkọta akụkọ ndị kachasị mkpa mere na mbaụwa n'ọnwa Febụwarị 2026.

Nchịkọta

Mkpuchi Na Eme Ozugbo

Michael Ngene, Chinonso Ugorji, Uzoamaka Ewuzie, Ikechukwu Kalu, Michael Ilediagu, Adline Okere, Marvelous Obomanu, Uche Akolisa

  1. Ọ bụghị eziokwu na anyị machiri inye ndị Ọwụwa Anyanwụ akwụkwọ njirimara

    Akwụkwọ Njirimara e ji eje mba

    Ebe foto si, NIS/X

    Nkọwa foto, Akwụkwọ Njirimara e ji eje mba

    Ngalaba na-ahụ maka ọpụpụ na mbata bụ 'Nigeria Immigration Service'(NIS) ekwuola na akụkọ na ụlọọrụ ahụ machiri inye ndị mpaghara Ọwụwa Anyanwụ ohere inweta akwụkwọ njirimara e ji eje mba bụ "okpotokpo asị".'

    Akụkọ fegharịrị na soshal midia ụbọchị Satọde na-ebo eubo na Mịnista na-ahụ maka ihe na-eme n'ụlọ bụ Olubunmi Tunji-Ojo nyere iwu ka a kwụsị ibi akwụkwọ njirimara na steeti nile dị n'Ọwụwa Anyanwụ.

    Mana n'ozi mgbasaozi nke ọnụ na-ekwuru NIS bụ Akinsola Akinlabi binyere aka ma wepụta ụbọchi Satode, o kwuru na akụkọ ahụ bụ " ịlọgharị nhazigharị nke na-aga n'ihu".

    Ozi ahú sírí, "Anya ụlọọrụ 'Nigeria Immigration Service' erutela akụkọ n'ebo ebubo n'intanet na e wez ụgara ndị otu mpaghara ala anyị ka ha ghara inweta akwụkwọ njirimara."

    "NIS na-ekwu hooha n'akụkọ ahụ bụ okpotokpo asị nakwa ịlọgharị nhazigharị gọọmentị na-ahazị etu ezi enweta akwụkwọ njirimara."

    Ozi ahụ kọwara na NIS ahazigharịala ụlọọrụ dị steeti dị n' Ọwụwa Anyanwụ Ugwu nakwa Etitu Ugwu dịka Borno, Yobe,Benue,Kogi,Nasarawa,Niger nakwa Platu na ụlọrụ ha ndị nmba ndị ọzọ dị n'Afrịka, Asia, Yurop nakwa Saụt Amerịka.

    Ọzi ahụ gara n'ihu Nhazigharị ụlọọrụ ha na steeti ise dị n'Ọwụwa Anyanwu iji jikọ ha na ụlọọrụ ha dị na mba Itali, Spen, Greece, Switzerland na Ọstrịa ga -abịa na mmezu n'ọnwa atọ mbụ n'afọ 2026.

  2. E bepụla onyendu ndị ntoroọbịa isi na Riva Steeti, gbahapụ ozu ya n’okeọhịa

    E bepụla onyendu ndị ntoroọbịa isi na Riva Steeti, gbahapụ ozu ya n’okeọhịa

    Ebe foto si, ONELGA Security and Planning Advisory Committee (OSPAC)

    A chọtala ozu onyendu ndị ntoroọbịa Ọmọkụ dị na Riva Steeti bụ Ifeanyị Azuazu n’okeọhịa dị n’Elieta n’okpuru ọchịchị Ogba/Egbema/Ndoni (ONELGA).

    Ndị ọrụ nchekwa ONELGA Security and Planning Advisory Committee (OSPAC) chọtara ozu nwaokoroọbịa ahụ dịka ọ gachara ụbọchị ole na ole ndị ojiegbe a na-enyo enyo tọọrọ ya n’Ọmọkụ.

    Ọ bụ mgbe ọ kụrụ ihe dịka elekere isii nke mgbede n’ụbọchị Tọzde 5 Febụwarị 2026 ka ndị ojiegbe tọọrọ Azuazu oge ha mere mwakpo ọjọọ n’otu ebe a na-aṅụ mmanya dị n’Ogolo Street, na mpụga okporoụzọ Palace Road dị n’Ọmọkụ.

    A gbagbukwara onye enyemaaka Azuazu bụ Chigozie Olowu oge e mere mwakpo ahụ.

    Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị:

    Ndị hụrụ mgbe o mere kwuru na ndị ekperima ahụ ruru mmadụ asaa ji ụgbọala abụo gaa ebe ahụ a na-aṅụ mmanya ma malite ịgba egbe aghara aghara ozugbo ha hụrụ Azuazu.

    Ha sị na ndị ekperima ahụ nyere Azuazu iwu ka ọ banye n’ime ụgbọala ha, dịka ha mechara buru ya gbafuo.

    Oge ọ na-akọwa akụkọ a dịka eziokwu, ọnụ na-ekwuru ndị nchekwa OSOPAC bụ Goodnews Nkem kpughere na a chọtara ozu Azuazu n’okeọhịa dị n’Elieta, dịka e gbupụrụla ya isi.

  3. Ndị ekperima egbuola onye President General n’Anambra Steeti

    A man stands with an arm during the Igboora World Twins Festival 2024, in Igbo-Ora on October 12, 2024. Nigeria's self-proclaimed 'twins capital of the world' Igbo-Ora holds its annual festival to celebrate the town's unusually high incidence of multiple births.

    Ebe foto si, Anambra State Police Command, Getty Images

    Ndị omekome egbuola onye President General ndị obodo Ogidi n’Anambra Steeti nakwa otu onye ọzọ.

    N’ozi ọnụ na-ekwuru ndị uweojii Anambra Steeti bụ Tochukwu Ikenga wepụtara n’ụbọchị Satọde 7 Febụwarị 2026, ọ sịrị na ọdachi ahụ mere n’abalị Fraịde 6 Febụwarị 2026, n’ama egwuruegwu otu ụlọakwụkwọ dị n’Ogidi.

    Ikenga kwuru na a na-enyo enyo na ọ bụ maka nnwuchi nakwa ogbugbu otu onye ekperima a ma ama n’obodo ahụ butere ọdachi a.

    Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị:

    “Ozugbo ndị uweojii nwetara ozi, ha gbapụru ọsọ gaa ebe ahụ ọdachi a mere ma malite ime nnyocha. Ka ọ dị ugbua, ndị uweojii na-agbakọrọ ndị hụrụ mgbe o mere aka iji nwuchie ndị aka ha dị na ya,” ka ozi ahụ kwuru.

    Ndị uweojii kwere nkwa ịgbasị mbọ ike iji hụ na e wetara ikpe ziri ezi, dịka ha gbara ndị mmadụ ume ka ha dere duu ma gbakọọrọ ndị uweojii aka dịka ha na-eme nnyocha.

  4. Mba Tọkị aṅụọla iyi inyere Naịjirịa aka, dịka Amerịka na UN katọrọ mwakpo e mere na Kwara Steeti

    Mba Tọkị aṅụọla iyi inyere Naịjirịa aka, dịka Amerịka na UN katọrọ mwakpo e mere na Kwara Steeti

    Ebe foto si, Getty Images, BBC

    Otu jikọtara mbaụwa bụ United Nations, mba Amerịka na mba Türkiye akatọọla ogbugbu e gburu ndị mmadụ na Kwara Steeti.

    N’ozi dị iche iche ha wepụtara, ha kọwara mwakpo ahụ e jiri gbuo ihe karịrị mmadụ iri asaa na ise ma merụọ ọtụtụ ndị ọzọ ahụ dịka nke “jọgburu onwe ya”.

    Odeakwụkwọ Otu jikọtara mbaụwa bụ Antonio Guterres bipụtara n’akara X ya sị: “Ana m akatọ mwakpo ndị na-eyi ndụ egwu mere na Kwara Steeti dị na Naịjirịa n’ụbọchị 3 Febụwarị”.

    “Ozi nkasiobi m na-agara ezinaụlọ ndị ọnọdụ ahụ metụtara, tinyere ụmụafọ na gọọmenti Naịjirịa. Ọfọ m na-agọ bụ ka ndị merụrụ ahụ gbakee ngwangwa.”

    Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị:

    N’ozi nke ha, ụlọọrụ mba Amerịka dị na Naịjirịa bụ United States Mission in Nigeria sịrị na mba Amerịka “na-akatọ mwakpo ọjọọ e mere na Kwara Steeti dị na Naịjirịa, bụ nke tara isi mmadụ karịrị otu narị na iri isii, dịka a na-amatabeghị kpọmkwem mmadụ ole nwụrụ, ebe a ka na-achọ ọtụtụ ndị ọzọ achọ.”

    Ha kasiri ezinaụlọ ndị ọ metụtara obi ma kwuo na ha nabatara iwu Onyeisiala Tinubu nyere ka e zigaa ndị nchekwa ebe ahụ iji chekwaa ndị obodo, nakwa ntụziaka o nyere ndị ọchịchị etiti na nke steeti ka ha rọpụtara ndị obodo ahụ ihe enyemaka ma hụkwa na e kpere ndị kpara arụ ahụ ikpe.

    N’otu aka ahụ, Gọọmenti mba Tọkị ekwuola na “obi adịghị ha mma” n’ihi mwakpo ahụ ndị na-eyi ndụ egwu mere.

    “Anyị ji olu ike na-akatọ mwakpo ọjọọ a, ma na-ezigakwara ezinaụlọ ndị e gburu egbu na ụmụafọ Naịjirịa niile ozi nkasiobi”.

    “Türkiye ga-aga n’ihu na-akwado Naịjirịa n’agha ha na-ebu megide iyi ndụ egwu,” ka Mịnịstrị mba Tọkị na-ahụ maka mba ofesi kwuru n’ozi ha bipụtara na websaịtị ha.

  5. Onye ọma, ị saala chi?, Ọfọ anyị bụ ka ụbọchị taa maara anyị mma ooo

    Obiụtọ ka anyị ji anabata gị n'ọgbakọ BBC News Igbo taa bụ Satọde 7 Febụwarị, 2026.

    Ọ bụ gị na Chinonso Ugorji ga-anọrị n'ụtụtụ a tupu Uche Akolisa eburu oche n'oge ehihie.

    Biko, sonyere anyị dịka anyị na-ewetere gị akụkọ gbara ọkpụrụkpụ si Naịjirịa, Afrịka na mbaụwa niile.

    Sonyekwara anyị na Facebook, Instagram nakwa Whatsapp Chanelụ anyị maka akụkọ, foto na vidio dị iche iche anyị ji bịa taa.

    Nnọọ!

  6. Mmadụ 31 anwụọla oge ogbunigwe gbara n’ụlọụka Alakụba na Pakịstan

    Ndị ọrụ nchekwa nọ n'ihu ogige ụlọ okpukperechi Alakụba ahụ

    Ebe foto si, Getty Images

    Ihe ruru mmadụ 31 anwụọla oge ogbunigwe gbawapụrụ n’ụlọ okpukperechi ndị Shia dị n’Islamabad, isiobodo mba Pakịstan.

    Osote Kọmishọna Islamabad kwuru na o pekata mpe mmadụ 169 ndị ọzọ merụrụ ahụ.

    Mwakpo ahụ mere na mpaghara Tarlai bụ nke ndị uweojii kwuru na ọ bụ otu onye yi ogbungwe ahụ n’ahụ bịa n’ogige ahụ dịka ọtụtụ ndị mmadụ gbakọrọ ime ekpere n’ụbọchị Fraịde, 6 Febụwarị, 2026.

    Ndị hụrụ oge ihe mere kwuru na ha nụrụ ụda egbe ebe otu onye ọzọ kwuru na ya hụrụ ka ndị ọrụ nchekwa ụlọ okpukperechi ahụ kwatara mgbọ.

    Onyeisiala Pakịstan kọwara mwakpo ahụ metụtara ndị nkịtị dịka mpụ iwu obodo katọrọ.

    Maapụ gosiri ebe ogbunigwe ahụ tiwapụrụ

    Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị:

  7. Ihe mere anyị ji gbachie ọdọụgbọelu dị n'Enugwu - Onyeisi otu ndị ọrụ

    E kwuru na minista na-ahụ maka ụgbọelu na Naịjirịa ekweela nkwa na ya ga-eme ihe ọ kwesịrị ime
    Nkọwa foto, E kwuru na minista na-ahụ maka ụgbọelu ekweela nkwa na ya ga-eme ihe ọ kwesịrị ime

    Onyeisi otu jikọtara ndị ọrụ n’ọdọụgbọelu dị n’Enugwu Steeti bụ Air Transport Senior Service Association of Nigeria (Atsssan) akọwaala ihe mere ndị ọrụ jiri gbachie ọdọụgbọelu dị n'Enugwu Steeti.

    Ikeh Ejike kọwara na ihe na-ese okwu n’etiti ndị ọrụ na gọọmenti bụ na Gọọmenti Etiti chọrọ ire ọdọụgbọelu nke Enugwu steeti mana ha achọghị imere ndị ọrụ ihe ha kwesịrị imere ha.

    N'okwu ya "taa ndị ọrụ gbachiri ọdọụgbọelu dị n’Enugwu mgbe ha nụrụ na gọọmenti etiti chọrọ inyefe ọdọụgbọelu ahụ n'aka ndị nkịtị".

    "Anyị agwala ha ihe ha ga-emere ndị ọrụ tupu nke ahụ emee mana ha na-ezo ezo. Ha na-amighari".

    "Ha emeghị ihe ha kwesịrị ime, nke a mere anyị ji gbachie ọdọụgbọelu taa si na enweghị onye ga-apụ maọbụ bata".

    "Mana mgbe ekwentị malitere dawa aghara aghara, ndị isi anyị gwara anyị ka anyị gbape ya. Nke a mere anyị ji gbape ya".

    "Ọzọ bụ na minista na-ahụ maka ụgbọelu na Naịjirịa ekweela nkwa na ya ga-eme ihe ọ kwesịrị ime," ka Ejike kwuru.

    Lee akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị:

  8. Ndị Sịnetọ kwadoro ka a na-agbasa mpụtara ntuliaka n’ịntaneetị - Victor Umeh

    Ndị Sịnetọ kwadoro ka a na-agbasa mpụtara ntuliaka n’ịntaneetị - Victor Umeh

    Ebe foto si, Victor Umeh

    Onye omeiwu na-anọchiteanya Anambra Central n’Ụlọomeiwu Sịnetị bụ Victor Umeh emeela ka o doo anya na ụlọomeiwu ahụ jiri otu olu kwado ka a na-agbasa mpụtara ntuliaka n’ịntaneetị, ma kwuo na ọ bụghị eziokwu na ndị omeiwu kwadoro naanị “iziga” mpụtara ntuliaka n’ịntaneetị.

    Umeh kwupụtara nke a n’ụbọchị Tọzde 5 Febụwarị 2026 oge ọna-asa ajụjụ n’otu ihe omume a haziri n’ụlọmgbasaozi Channels Television, dịka ọtụtụ mmadụ na-egosi iwe gbasara mmegharị iwu ntụliaka nke Ụlọomeiwu Sịnetị kwadoro ụnyahụ.

    Ọ kọwara na usoro mmegharị iwu a bụ nke were ogologo oge ma bụrụkwa nke e lebaara anya nke ọma.

    Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị:

    Dịka Umeh siri kwuo, usoro ndị a gụnyere ngụpụta nke mbụ na nke abụọ, nnụrụ uche ọhanaeze na mpaghara dị iche iche, ịkpọtụrụ ndị ọnụ na-eru n’okwu nakwa ihe ndekọ si n’aka kọmitii njikọ nke Ụlọomeiwu Sịnetị na Ụlọomeiwu Nnọchiteanya

    Onye omeiwu ahụ kwuru na mmegharị mpaghara 60 nke Iwu Ntuliaka afọ 2022, nke lebara anya n’ịgbasa mpụtara ntuliaka pụtara dịka ihe ọhanaeze chọrọ oge ndị omeiwu mere mkpọtụrụ gburugburu Naịjirịa.

    Victor Umeh kwuru na okwu a bịara dị ezigbo mkpa n’isochi ntuliaka afọ 2023, bụ nke ọtụtụ mmadụ gbara ụkwụ ma mechaa wepụ n’ụlọikpe ruo n’Ụlọikpe Mkpegharị.

  9. Mkparịtaụka ga-amalite n’etiti Amerịka na Ịran

    Onye nnọchite anya pụrụ iche nke mba Amerịka bụ Steve Witkoff (aka ekpe) ga-edu ndị otu mkparịtaụka ahụ, ebe minista mba ofesi Abbas Araghchi ga-edu ndị otu Ịran.

    Ebe foto si, AFP via Getty Images

    Nkọwa foto, Onye nnọchite anya pụrụ iche nke mba Amerịka bụ Steve Witkoff (aka ekpe) ga-edu ndị otu mkparịtaụka ahụ, ebe minista mba ofesi Abbas Araghchi ga-edu ndị otu Ịran.

    A na-atụ anya na ndị isi mba Amerịka na Ịran ga-amalite mkparịtaụka na Oman n'agbanyeghị nsogbu nke kpalitere egwu esemokwu agha n'etiti mba abụọ ahụ.

    Mkparịtaụka a na-abịa mgbe ndịagha mba Amerịka gbakọtara na Middle East iji zaghachi mmegbu siri ike nke Ịran mere megide ndị mere ngagharịiwe megide gọọmentị mba ahụ n'ọnwa gara aga, nke ndị otu ikike mmadụ kwuru na ha gburu ọtụtụ puku mmadụ.

    Ka ọ dị ugbua, inwe obi abụọ gbasara ebe na oke na-eyi egwu imebi mkparịtaụka ahụ, nke so na mgbalị ndọrọ ndọrọ ọchịchị nke ndị na-achọ udo na mpaghara ahụ ji maka ibelata esemokwu ahụ.

    Mba abụọ ahụ anaghị ekwekọrịta n'ọnọdụ ha. Mana olileanya bụ na, ọ bụrụ na mkparịtaụka ahụ gaa nke ọma, o nwereike inwete usoro maka inwe nkwekọrịta.

    Lee akụkọ ọzọ ga-amasị gị ebe a:

  10. Igbo ndị ọma, unu abọọla chi?

    Nnọọ n'ọgbakọ BBC News Igbo taa bụ Wenezde 6 Febụwarị 2026. Anyị na-asị ka ọ dịrị onye obula mma.

    Biko, sonyere anyị dịka anyị na-ewetere gị akụkọ gbara ọkpụrụkpụ si na Naịjirịa, Afrịka nakwa mbaụwa niile.

    Sonyekwara akara Facebook, Instagram nakwa Whatsapp Chanelụ anyị maka akụkọ, foto na vidio dị iche iche anyị ji bịa taa.

    Ya gazie.

  11. A tụọla onye bụbu onyeisi 'NEXIM Bank' nga afọ 490 maka nrụrụaka

    Robbert Orya

    Ebe foto si, EFCC

    Ụloikpe Ukwu nke Abuja atụọla onye bụbụ onyeisi ụlọakụ 'NEXIM Bank' bụ Robert Orya mkpọrọ afọ 490 maka nrụrụaka ego dị ijeri abụọ na ụma( N2.4 Bn).

    Ọkaikpe Jọstịs FE Messiri, onye kpere ikpe ahụ n'akwukwọ nke ngalaba na-ebu agha megide nrụrụaka EFCC gbara, tụru Orya mkpọrọ afọ iri iri maka ebubo 49 EFCC boro ya.

  12. Keir Starmer arịọla ndị Epstein metọrọ mgbaghara maka ị họpụta Mandelson dịka onye nnọchiteanya mba UK n’Amerịka

    Praịm mịnịsta mba UK bụ Keir Starmer

    Ebe foto si, Reuters

    Praịm mịnịsta mba UK bụ Keir Starmer arịọla ndị Jeffrey Epstein metọrọ mgbaghara maka ịhọpụta Peter Mandelson dịka onye nnọchiteanya mba UK n’Amerịka.

    O kwuru na ya ghọtara iwe ndị nnọchiteanya pati Labour ma kọwaa na ya amaghị na ihe Mandelson gwara ya bụ okwu ụgha ma rịọ mgbaghara maka inye ya ọkwa ahụ n’afọ 2024.

    Starmer boro Mandelson ebubo ịtụ asị oge e mere nnyocha tupu a họpụta ya n’ọkwa ahụ.

    Otu onye otu pati Labourkwuru na Keir Starmer nwereike ịgba arụkwaghịm dịka Praịm mịnịsta mba UK.

    Mandelson azabeghị oku niile BBC kpọrọ ya iji nụ ọnụ mmiri okwu ya banyere ebubo ndị a e boro ya.

    Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị:

  13. SEDC ga-ewete mmepe zuru oke n'ala Igbo site ugbua ruo afọ 2050 - Osote Onyeisiala Naịjirịa

    Osote Onyeisiala Naịjirịa bụ Kashim Shettima na ndị gọvanọ Ọwụwa anyanwụ n'oge mmalite ọrụ na mgbape SEDC Vision 2050 n'ala igbo bụ nke e guzobere n’Enugwu.

    Ebe foto si, ENSG

    Nkọwa foto, Osote Onyeisiala Naịjirịa bụ Kashim Shettima na ndị gọvanọ Ọwụwa anyanwụ n'oge mmalite ọrụ na mgbape SEDC Vision 2050 n'ala igbo bụ nke e guzobere n’Enugwu.

    Otu gọọmenti Naijira wepụtara maka mmepe mpaghara ọwụwa anyanwụ Naịjirịa a kpọrọ " Southeast Development Commission (SEDC) e wepụtala atụmatụ ha ga-eji malite oru ha.

    N'ụbọchị atọ na anọ nke ọnwa Febuwari 2026, ka Osote Onyeisiala Naịjirịa bụ Kashim Shettima wuchiri n'isi obodo Enugwu Steeti iji malite ya bụ ọrụ agba nke mbụ ya nke a kpọrọ " Southeast Development Vision 2050"

    Shettima kwuru na ya bụ atụmatụ abụghị naani n'akwụkwọ ka edere ya, kama na ọ bụ ọrụ na amalite ngwa ngwa iji weta mmepe na akụkụ niile n'ọwụwa nyanwụ Naịjirịa.

    Ebe a rụtagasịrị aka bụ ebe gọọmenti na akwado ya bụ mmepe, gụnyere ịgụ-akwụkwọ, azụmahịa, ịzụ ahịa, irụpụta akụrụngwa , okporoụzọ, ịrụ ụlọọrụ mmepụta ihe, iwe ndị mmadụ n'ọrụ, imepe ọdọụgbọmmiri na River Niger Onitsha, irusi ọdụ ụgbọoloko, nakwa ebe ndị ọzọ.

    Lee akụkọ ndị ọzọ ga-amasị

  14. Inec edebanyela aha pati ọhụrụ abụọ

    Joash Amupitan

    Ebe foto si, Inec/X

    Ngalaba na-ahazi ntuliaka na Naijiria bụ 'Independent National Electoral Commission' (INEC) edebanyela aha pati ọhụrụ abụọ.

    Ha bụ otu 'Democratic Leadership Alliance' (DLA) na otu ' Nigeria Democratic Congress' (NDC).

    Onyeisioche Inec bụ Joash Amupitan bụ onye gbara ama n'ọgbakọ ya na ya ndị otu ndọrọndọrọ ọchịchị nwere n'Abuja ụbọchị Tọzde.

    Amupitan kwuru na ndebanye ahụ gbasoro usoro kwesịrị dịka Inec nwetakwara akwụkwọ ozi 171 n'aka otu chọrọ ihiwe pati nke ha.

  15. Ndị uweojii anwuchiela otu nwaanyị n’Anambra Steeti maka ebubo ire nwaodibo ya ọkụ

    Ndị uweojii anwuchiela otu nwaanyị n’Anambra Steeti maka ebubo ire nwaodibo ya ọkụ

    Ebe foto si, Anambra State Police Command

    Ndị uweojii Anambra Steeti anwuchiela otu nwaanyị dị afọ iri abụọ na itoolu a na-enyo enyo maka ire nwaodibo ya ọkụ.

    Ọ bụ n’ụbọchị Wenezde 4 Febụwarị 2026 ka Mịnịstrị na-ahụ maka agụmaakwụkwọ kpụgaara Edeh Osinachi n’ụlọorụ ndị uweojii dị n’Awka maka imetọ nwaodibo ya dị afọ iri na asaa.

    Nke a dị n’ozi ọnụ na-ekwuchitere ndị uweojii n’Anambra Steeti bụ Tochukwu Ikenga wepụtara n’ụbọchị 4 Febụwarị 2026.

    Ikenga kwuru na nnyocha ndị uweojii mere chọpụtara na ọ bụ mgbe nkụzi na ọmụmụ na-aga n’ihu ka a hụrụ ọnya ndị ahụ n’ahụ nwata nwaanyị ahụ.

    Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị:

    “Oge a gbara ya ajụjụ, o kpughere na ọ bụ onye nlekọta ya buteere ya mmerụahụ ndị ahụ, maka na ya weere ekwentị nne ya ukwu kpọọ mmadụ na-agwaghị ya agwa,” ka ndị uweojii kwuru.

    Dịka nwata ahụ siri kwuo, nne ya ukwu bụ Osinachi jiiri iwe ree ya ọkụ igwe n’ahụ iji nye ya ntaramaahụhụ.

    “Oge ndị uweojii gbara nwaanyị ahụ a na-enyo enyo ajụjụ, o kwetara na ọ bụ ihe mere eme,” ka ozi ahụ kwuru.

    Ndị uweojii kelere ụlọakwụkwọ ahụ maka ilebara ụmụakwụkwọ ha anya, ma kwee nkwa na ha ga-eme nnyocha miri emi gbasara okwu ahụ iji weta ikpe ziri ezi.

  16. Ndị ojiegbe egbuola ọtụtụ mmadụ na Naịjirịa

    Ndị ikwu na ibe gara ekpere iji kwanyere ndị nwụrụ anwụ ugwu n’Ọktoba 12, 2019, mgbe ndị ojiegbe a na-enyo enyo na ha so n'otu Islamic State West Africa Province (ISWAP) wakporo obodo Tungushe, gbuo otu onye soja na mmadụ atọ bi na ya.

    Ebe foto si, AFP via Getty Images

    Nkọwa foto, Ndị ikwu na ibe gara ekpere iji kwanyere ndị nwụrụ anwụ ugwu n’Ọktoba 12, 2019, mgbe ndị ojiegbe a na-enyo enyo na ha so n'otu Islamic State West Africa Province (ISWAP) wakporo obodo Tungushe, gbuo otu onye soja na mmadụ atọ bi na ya.

    Ọtụtụ mmadụ anwụọla n'ọgbaaghara na mwakpo ndị ojiegbe wakporo obodo abụọ dị na steeti Kwara nke dị na ọdịda anyanwụ Naịjirịa, dịka ndị ọchịchị na ndị otu ikike si kwuo.

    Ndị mwakpo ahụ gbakwara ụlọ ahịa na ụlọ obibi tinyere ebe obibi onyeisi ọdịnala ahụ ọkụ, nke mere ka ndị bi na Nuku na Woro si n’obodo ahụ gbapụ, dịka onye omeiwu obodo Saidu Baba Ahmed gwara BBC Hausa.

    Ndị ọchịchị ekwuola na ọ bụ otu ndị omekome mere mwakpo ahụ ma ziga otu ndịagha n'ogbe Kaiama nke dị na Kwara steeti.

    Mwakpo nke Tuzde, bụ otu n'ime ọtụtụ ndị ọzọ mere na Naịjirịa n'ime ụbọchị ole na ole gara aga, bịara dịka minista nchekwa mba ahụ gwara ụlọmgbasaozi BBC na obere ọnụọgụgụ ndịagha Amerịka nọ na mba ahụ iji nyere aka n’inwete ozi ndị mkpa na ọzụzụ.

    Onyeisiala Naịjirịa bụ Bola Tinubu boro otu jihadist Boko Haram ebubo maka mwakpo ahụ.

    Mana onye omeiwu mpaghara ahụ bụ Mohammed Omar Bio kwuru na Lakura, otu ndịagha nnupụisi ha na otu Islamic State na-arụkọ ọrụ, kpara nkpankpa ahụ, dịka Associated Press si kwuo.

    Aka na-achị Kwara steeti ahụ bụ Gọvanọ AbdulRahman AbdulRazaq kwuru na "e gbuchapụrụ mmadụ iri asaa na ise na mgbukpọ nke aka nkịtị".

    Lee akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị:

  17. Igbo ndị ọma, ụtụtụ ọma nu.

    Anyị na-asị unu nnọọ n'ọgbakọ BBC News Igbo taa bụ Tọzde 5 Febụwarị 2026.

    Ekpere anyị bụ ka ụbọchị taa mịtara anyị niile mkpụrụ ọma.

    Biko, sonyere anyị dịka anyị na-ewetere gị akụkọ gbara ọkpụrụkpụ si na Naịjirịa, Afrịka nakwa mbaụwa niile.

    Sonyekwara akara Facebook, Instagram nakwa Whatsapp Chanelụ anyị maka akụkọ, foto na vidio dị iche iche anyị ji bịa taa.

    Udọ dịrị gị.

  18. E gbuola nwa Gaddafi bụbu onyendu mba Libya a chuturu n'ọchịchị

    Saif al-Islam Gaddafi nọ n'oche ebe ndịagha gbara ya gburu gburu

    Ebe foto si, Reuters

    A gbagbuola Saif al-Islam Gaddafi bụ nwa Muammar Gaddafi bụbu Onyendu mba Libya dịka akụkọ si kwuo.

    Akụkọ banyere ọnwụ nwamadị a dị afọ iri ise na atọ bụ onye a na-ahụta dịka onye nọchiri anya nna ya pụtara ihe mgbe ndị ndọrọ mba ahụ kwupụtara ya na Tuzde.

    Ọkaiwu ya gwara ụlọọrụ ntaakụkọ AFP na ọ bụ ndịagha mmadụ anọ bịara gbagbuo ya n’ụlọ ya dị n’obodo Zintan, mana o dobeghi anya onye dunyere ndị ahụ.

    Mana nwanne ya nwaanyị gwara ndị ntaakụkọ Libya TV na ọ nwụrụ n’okeala mba ha ndị Ọjerịa.

    Saif al-Islam Gaddafi ka a na-ahụta dịka onye kachasị nwee ngabasị ma kachasị ukwuu na mba ahụ kamgbe nna ya chịrị Libya site n’afọ 1969 ruo mgbe e wepuru ya n’ọchịchị ma gbuo ya n’afọ 2011.

    A mụrụ ya n’afọ 1972, ọ gbara nnukwu mbọ na nkwụrụ onwe mba Libya site na mba ndị ofesi malite n’afọ 2000 ruo mgbe ọchịchị kụrụ afọ n’ala.

    Dịka a chutuchara nna ya n’ọkwa, onyeagha weere ọchịchị n’oge ahụ tụrụ Saif al-Islam Gaddafi nga – ma boo ya ebubo ịhazi ngagharịiwe megide gọọmentị n’obodo Zintan ruo ihe chụwara afọ isii.

    Ụlọikpe mbaụwa chụburu ịma ya ikpe mpụ megide ikike dịịrị onye maka ọrụ ọ rụrụ n’ịkpagbu ndị na-eme ngagharịiwe n’afọ 2011.

    A mara ya ikpe ọnwụ n’azụ maka ọrụ ọ rụrụ maka nke ahụ n’ụlọikpe dị na Tripoli dị na mpaghara ọchịchị mba United Nations na-akwado.

    Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị:

  19. Ihe mere ndịagha mba Amerịka jiri wuchie na Naịjirịa

    Ndịisi ndịagha Naịjirịa na onyendu ndịagha mba Amerịka

    Ebe foto si, US Africom/X

    Mịnịsta na-ahụ maka nchekwa na Naịjirịa bụ Ọchịagha Christopher Musa ekwuola na ọ bụ eziokwu na obere ọnụọgụgụ ndịagha mba Amerịka na-arụ ọrụ na Naịjirịa.

    O kwuru na ndịagha mba Amerịka ga-enye “aka zụọ ma kwadoo ndịagha anyị maka ịrụ ọrụ”.

    Mịnịsta akọwaghị kpọmkwem ọnụọgụgụ mmadụ ole mejupụtara ndịagha mba Amerịka ahụ, mgbe ha batara Naịjirịa nakwa ogige ebe ha nọ.

    Ndịagha mba Amerịka na Naịjirịa arụkọọla ọrụ ọtụtụ ugboro kamgbe ọtụtụ afọ, nke gbakwasịrị ụkwụ n’iwulite Naịjirịa n’ọnọdụ nchekwa ibuagha megide iyi ndụ egwu na nkekọrịta amamihe. Ndịagha mba Amerịka ngalaba Afrịka a kpọrọ US Africa Command (Africom) azụọla ọtụtụ ndịagha Naịjirịa n’ụzọ dị iche iche. Onyeisi ngalaba ndịagha Africon bụ Ọchịagha Degvin R. M. Anderson gwara ndị ntaakụkọ n’ụbọchị Tuzde na ọ bụ Naịjirịa kwuru ka e zitere ha ndịagha mba Amerịka maka nkekọrịta amamihe.

    “Mmekọrịta anyị na Naịjirịa bụ ihe iji maatụ banyere ndị nwere mmasị ma chọọ amamihe naanị ndịagha mba Amerịka nwereike inye, bụ nke anyị ga-enye ka ịhụ na ọ bịara na mmezu,” ka o kwuru.

    Naịjirịa na Amerịka welitere aka na mmekọrịta ha kamgbe ọnọdụ nchekwa bịara dị njọ nke gụnyere ndị otu na-eyi ndụ egwu Jihadist, ntọrị mmadụ nakwa ndị ekperima. Nsogbu nchekwa mere ka anya mbaụwa ndị ọzọ bata na Naịjirịa, nke mere mba Amerịka jiri tụọ ogbunigwe n’ogige ndị ekperima dị na mpaghara ugwu n’ụbọchị Ekeresimesi afọ 2025.

    Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị: