Izite ndịagha, mmachi 'visa' na ụzọ ndị ọzọ Amerịka nwere ike isi taa Naịjirịa ahụhụ dịka mba 'e kwesịrị ilebara anya'

Ebe foto si, Bola Tinubu/Getty Images
Kemgbe Onyeisiala Amerịka bụ Donald Trump majara Gọọmenti Naịjirịa ma kwuo na Amerịka ga-ezite ndịagha ịbịa gboo ọgụ n'ebubo mgbusịsị a sị a na-egbusịsị ndi ụka Kraịst, egwu malitere ịma ewu na ọkụko ka oyi ụgụrụ.
Ụfọdụ na-ekwu na-agọ na ebubo ahụ bụ ụgha, ebe ụfọdụ gụnyere ndị ụkọchukwu na ndị e gbufuru ndị ezinaụlo ha na mwakpo dị iche iche ọkachasị n'Ugwu Awụsa gwara Kọmitii Ụlọomeiwu Amerịka n'ụbọchị Tọzde na ọ bụ ihe mere kpọmkwem.
Ndị ọkachamara n'okwu gbasara ọchịchị obodo kwuru na Amerịka na atụle ụzọ dị iche iche ha ga-esi so okwu a.
Lee ụfọdụ ihe a na-ele anya Amerịka nwere ike ime Naịjirịa:

Ebe foto si, Bola Tinubu/ Getty Images
1. Inye Naịjirịa ajọ aha
Igbo si na ezi aha ka ego. N'otu aka ahụ, ajọ aha na-ebute nleda anya.
Mkpọputa Amerịka kpọpụtara Naịjirịa dịka mba a na-elebara anya bụ inye Naịjirịa ajọ aha.
Ọ ga-ewetụ etu mba ndị ọzọ si ahụta Naịjirịa na mbaụwa ma meekwa ka enwetụ mgbanwe n'etu gọọmenti si elegara mkpesa metụtara okpukperechi.
Chris Smith, bụ omeiwu mba Amerịka na-anọchite New Jersey kwuru dịka ọ na-ekele Donald Trump maka itinye aha Naịjirịa na mba ndị e kwesịrị ilebara anya n'okwu e nweghị ikike iso okpukperechi masịrị onye sịrị: "ụkwụ a Trump zọrọ dị nnukwu mkpa n'idozi ihe mebiri dịka ọchịchị Joe Biden mere ka obi sie ndị a na-agbasa oziọma asị ike."
Ngalaba mba Amerịka na-ahụ maka ikike onye ikpere chi masịrị ya bụ 'United States Commission on International Religious Freedom' (USCIRF) kwuru na kpọpụta a bụ iji hụ na e nwere ikike mmadụ ikpere chi masịrị ya" na-enweghị tigbuo zọgbuo."
2. Mmachi ndị ọchịchị gọọmenti (Visa ban)

Ebe foto si, Getty Images
Iwu 'International Religious Freedom Act of 1998 nke mba Amerika, mpaghara 604 (Section 604) kwuru na 'agaghị anabata onye ọbụla na-arụrụ gọọmenti mba ọzọ maọbụ onye ọ na-alụ maọbụ ụmụ ya,(n'Amerịka) aka ya dị na mmekpahụ megidere ikike okpukperechi masịrị onye ọnwa 24", ya bụ, afọ abụọ ya bụ ihe mechara.

Ebe foto si, Max Menkiti
Dịka otu onye ọkachamara n'okwu ọchịchị bụ Maxwell Menkiti si kwuo,
" Ihe a na-elekarịa anya nwere ike ime bụ na ha(Amerịka) ga-amachi ụfọdụ ndị ọchịchị Naijiria aka ha ndi na mkpagbu metụtara okpukperechi ịbata Amerịka."
3. Mkpachi akụnaụba ndị ọchịchị
Ọ bụghị naani ịmachi ndị ọrụ gọọmentị dara mba n'ọnụ ịhụ na ndị mere mpụ megide okpukperechi lara na-enweghị ntaramahuhụ ọbụla,
Menkiti kwukwara na Amerịka nwekwara ijichie ego maọbụ akụnaụba ndị aka ha dị n'ihe na-ebe na Naijiria nwere na mba Amerịka.
4. Ịkwụsị enyemaka ebere

Ebe foto si, Aminu Abubakar
Kwa afọ, Naijiria na-anata nde kwuru nde dọla dịka ego enyemaka n'aka Amerịka iji kwado ihe dị iche dịka agụmakwụkwọ, ahuike, nchekwa na ihe ndị ọzọ.
Ụdị enyemaka nwere ike ibelata maọbụ kwụsị.
Dịka Menkiti sị kọwaa ya, "Ndị omeiwu Amerịka na-agba mbọ ịhụ na enyemaka ha ga-enye Naijiria ga-agbado ụkwụ n'etu Gọọmentị Tibubu si gaa n'ihu ichekwa obobo nakwa ikpee ndị aka ha ndị n'ogbugbu ndị mmadụ ikpe ma nye ha ntaramahụhụ kwesịrị ha.
Cheta n'afọ 2014, oge ọchịchị Gọọdluck Jonathan, Gọọmentị Amerịka jụrụ inye Naijiria nkwado ngwaagha.
Amerịka jụrụ inye Naijiria ngwagha kara aka n'ihi ebubo na ndịagha NAijiria na-akpagbu ikike dịịrị onye nke ndị mmadụ.
4. Mwakpo ndịagha Amerịka

Ebe foto si, Getty Images
Ụzọ ọzọ Amerịka nwere ike isi taa Naịjirịa ahụhụ bụ site na izite ndịagha ha.
Onyeisiala Amerịka bụ Donald Trump eyielarị egwu na ya ga-eme nke a maka ịdajụ ogbugbu ọ sị a na-egbusịsị ndị ụka Kraịst.
Otu onye ọnụ na-eru n'okwu bụ Dennis Ekemezie kwuru na 'E nwere ike inwe mbata ndịagha Amerịka na Naijiria ịbia gboo ọgụ."
"Eji m n'aka na ị ma Na Trump enwetala nkwado Ụlọomeiwu Amerịka."

Ebe foto si, Dennis Ekemezie
Mana ọ bụghị mmadụ niile kwadoro nke a.
Ndị akwadoghị ya na-ekwu na ọ nwere ike ibute nsogbu dịka ọ dara na Libya, Iraq, Afganistan nakwa mba ndị ọzọ ebe Amerịka garala ọgụ ikpe udo mana tigbuo zọgbuo akawanye njọ.
Ụfọdụ ndị omeiwu Amerịka akwadoghị Trump na nke ahụ.
Sarah Jacobs bụ onye omeiwu mba Amerịka kwuru na mmaja Trump majara na ya ga-eziga ndịagha na Naịjirịa bụ "ikwu okwu ataghị ya eze".
Ọ sịrị, "Iziga ndịagha na Naịjirịa megidere iwu. Ụlọomeiwu enyeghị nkwado ọbụla ka ndịagha gaa chekwawa ndị ụka Kraịst na Naịjirịa."








