O megidere iwu etu mba Amerịka si ebubata ndị ekperima mba ofesi n'ime mba ndị dị n'Afrịka?

Ụgbọelu mba Amerịka nọ n'okporoụzọ na-achọ ifepu.

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Ụgbọelu ndịagha bụ ihe e ji ebubata ndị a chụpụrụ na mba Amerịka, gụnyere mba Honduras n'ọnwa Jenụwarị
    • Onye dere ya, Priya Sippy
    • Ndị mere akụkọ a, BBC News
  • Oge e ji agụ akụkọ nkeji 7

Gọọmentị mba Amerịka elekwasịla mba Afrịka anya dịka ebe ha ga-ebubata ndị mbịarambịa a tụrụ mkpọrọ na mba Amerịka.

Dịka e bugala ọtụtụ ndị ọzọ na mba dị n'etiti nakwa mpaghara Saụt Afrịka n'ụbọchị 12 Julaị, e bugakwara ụmụnwoke si mba ọzọ dịka mba Mezico, Myanmar na Yemen gawa mba Eswatini na Saụt Sudan. E bulatara otu nwafọ Sudan n'obodo ya.

Mba Amerịka na-agwa mba Afrịka ndị ọzọ ka ha nabata ndị ọzọ ha chọrọ ịchụ mbụ ndị mba nke ha si ekweghi anabata ha, dịka ndị ọrụ mba Amerịka si kwuo.

Nkwa Onyeisiala mba Amerịka bụ Donald Trump kwere n'ịchụpụ ndị si mba ọzọ nwetere nkwado dịka ọ na-eme achụmnta vootu n'afọ gara aga. Mana ngalaba United Nation na-ahụ maka ikike dịịrị onye kwuru na atụmatụ ịkpọlata ndị mmadụ na mba na-abụghị ebe ha si adịghị mma - ma kwuo na ọ nwereike imegide iwu na-achị mbaụwa.

Ịkpọlata ndị mmadụ na mba na-abụghị ebe ha si o megidere iwu?

Ịkpọlata ndị mmadụ na mba na-abụghị ebe ha si nwereike ịbụ ihe iwu kwadoro - mana ọ ga-abụ n'ụfọdụ ọnọdụ ndị dị aṅaa.

"A ga-ahụta ihe gbasara ịkpọlata mmadụ na mba na-abụghị ebe o si dịka ọnọdụ ịgba ọsọndụ a kpọrọ 'asylum'," dịka Ọkammụta Ray Brescia nke ụlọakwụkwọ iwu Albany dị n'Amerịka si kwuo.

"E nwere iwu na-achị mbaụwa nke kwuru na i kwesighi ịkpọlata mmadụ na mba ebe o si ma ọ bụrụ na ha gaghị enwe nchekwa n'ebe ahụ, nke bụ na mba ọzọ nwereike ịnabata ma chekwaa ndị a," ka o kwuru.

Iwu abụghị naanị na mba ebe onye ahụ si kama mba nke ọzọ ebe e nwereike ịkpọga ya.

Ọ bụrụ na mba ahụ enweghi nchekwa, ịchụlata ha nwereike imegide iwu na-achị mbaụwa - dịka mgbe Ụlọikpe Kachasị na mba Briten gbochiri atụmatụ gọọmenti ha ịchụlata ndị gbara ọsọndụ gawa mba Rwanda n'afọ 2023.

Ọ dị mkpa isoro usoro iwu kwadoro.

Ndị mbịarambịa ga-enweriri ohere ịma aka ma ọ bụrụ na ebe a chọrọ ịkpọga ha dị ọjọọ nye ha, site n'ihe akaebe nke otu a ma ama dịka United Nation na mba Amerịka gosiri.

"Ụlọikpe kwesịrị inyocha ikike ndị mbịarambịa nwere, ma a ga-akpọchi ha, ụdịrị ụlọ ebe a ga-edosa ha," ka Dkt Alice Edwards nke ngalaba United Nations na-ede akụkọ banyere nwuchi na ịta ndị mmadụ ahụhụ si kwuo.

Mana ọ na-ara ọtụtụ ndị mbịarambịa ahụ inwete nkwado iwu a n'oge.

"Ọ na-ewe nnukwu ịgba mbọ nakwa ọkaiwu ga-agbasi mbọ ike ngwa ngwa," ka Ọkammụta Brescia kwuru.

"Usoro ụzọ iwu nwereike ọ gaghị erute onye ọbụla aka."

Mkpọlata ndị mmadụ na mba Eswatini na Saụt Sudan ọ dara iwu na-achị mbaụwa?

Gafere Ọkwa azụmahịa WhatsApp ma gaa n'ihu na-agụ
Anyị nọ na WhatsApp

Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.

Pịa aka ebe a ka i soro anyị

Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị

"Ha dara iwu a n'ezie n'ụzọ abụọ," ka Ọkammụta David Super nke ngalaba iwu na mahadum Georgetown kwuru.

"O nweghi ihe akaebe gosiri na Amerịka na-enye ndị mmadụ ohere ịma mkpọlata ha aka, ha ekwesighi ịkpọga ndị mmadụ na mba ebe e nwereike ịkpagbu ha."

"Mba Saụt Sudan na Eswatini nwere agwa dị aṅaa n'etu ha si eme banyere ikike dịịrị onye," ka ọ gwara BBC.

Mgbe a chọrọ ịkpọlata ndị mbịarambịa gawa na mba Saụt Sudan n'ọnwa Mee, a gbara akwụkwọ n'ụlọikpe dị na mba Amerịka mgbe ụgbọelu ha fepucharala.

Ọkaikpe kpere ikpe kwuo na ịkpọlata ndị a megidere iwu ya sị na e kwesịrị inye ndị mbịarambịa ohere ịma mkpọga ha na mba ọzọ aka.

E bugara ụgbọelu bu ndị a gawa na Djibouti na mpaghara East Afrịka ebe tinyere ụmụnwoke ndị a n'ime mkpo igwe 'container' dị n'ụgbọmmiri dịka a na-ekpe ikpe ha.

E buuru ikpe ahụ gawa n'Ụlọikpe Kachasị bụ nke kwere ka mkpọlata ndị a gaa n'ihu maka ọ kọwaghị ma mba Saụt Sudan na Eswatini ọ bụ ebe nwere nchekwa ndị mbịarambịa ịnọ.

"Ihe anyị hụrụ na nke yiri ya bụ na ọtụtụ oge a naghi enye ndị mmadụ ohere inwete enyemaka iwu mgbe ha chọrọ ya, ebe ikpe na-anaghị amalite ngwa ngwa," Dkt Edwards kwuru.

"N'okwu nke a, adịla mbụ buru ha na-aga n'ogige ndịagha mba Amerịka, nke ahụ bụ ezigbo nsogbu."

Ọ gbakwụnyere na ụlọikpe kwesịrị isepu aka na ndọrọ ndọrọ ọchịchị, ọkachasị mgbe o metụtara ikike dịịrị onye.

Ọkammụta Brescia dọrọ aka na ntị na mkpe a Ụlọikpe Kachasị nyere nwereike ịbụ nsogbu n'ọdịnihu.

"Nke a nwereike ime ka gọọmenti na-achị gbapụ ya ọsọ tupu ndị mmadụ inwete ohere ịga n'ụlọikpe," ka o kwuru.

Nchekwa ọ dị na Eswatini na Saụt Sudan?

Ọ bụghị naanị na a naghị enye ndị mbịarambịa ohere isoro ụzọ iwu, kama a na-ebuga ha na mba ndị na-enweghi ezi nchekwa - nke a megidere iwu na-achị mbaụwa.

Ngalaba ụlọọrụ mba Amerịka na-adọ aka na ntị megide ime njem gawa mba Saụt Sudan, kwuo na iyi ndụ egwu gụnyere mpụ, ntọrị mmadụ na ọgbaghara ndị bu egbe dị ebe ahụ. Na mbido afọ a, e kwuru na mba a kachasị daa ogbenye n'ụwa nọzi n'ọnọdụ ịbanye n'ibuagha.

"E nwere ezigbo banyere irubeisi isi n'iwu na mba Saụt Sudan - mwakpo na-adapụtakaarị na ọgbaghara na-aga n'ihu ugbua," ka Dkt Edwards kwuru.

A sị na a kpọchiri ndị a ịkpọlatara na mba Saụt Sudan n'ụlọmkpọrọ dị na Juba, ebe a ma ama maka ọnọdụ ọjọọ ya dịka otu onye ọkachamara bụ Agel Roch Machar si kwuo. Gọọmenti ekwubeghi ebe ndị a nọ nakwa oge ole ha ga-anọ n'ụlọmkpọrọ.

Thabile Mdluli looking at the camera. She is wearing a burgundy-coloured top.
Thabile Mdluli
"We don't foresee they will stay long enough to be integrated into society"
Thabile Mdluli
Eswatini government spokesperson

N'Eswatini, obere mba ala gbara gburu gburu dị n'ọchịchị mpaghara Saụt Afrịka kwuru na ndị a kpọlatara na mba ha nọ n'ụlọmkpọrọ ma kwuo na a ga-akpọghachị site n'enyemaka otu na-ahụ maka ime njem n'ụwa bụ 'International Organization of Migration' (IOM).

Ngalaba mba Amerịka kwuru na ụlọmkpọrọ mba Eswatini ejubigala oke, ezigbo ikuku anaghị abata na ya, e nweghi ezi nri nakwa ọnọdụ ahụike adịghị mma ebe ahụ.

"Anyị echeghi na ha ga-anọte anya ebe ahụ iji nabata ha n'ime ọhanaeze," Ọnụ na-ekwuru gọọmenti Eswatini bụ Thabile Mdluli gwara BBC, na-ekwughi oge ole ndị a ga-anọ na mba ha, ma ha ọ ga-ebuzo nọzuo ụbochị ha na mkpọrọ.

Gọọmenti mba Amerịka kwuru na ndị ha kpọlatara na mba Eswatini mere arụ dị "oke egwu" gụnyere idina nwata n'ike, igbu mmadụ nakwa mwakpo n'ike.

Nkatọ na-arị ibe ya elu n'Eswatini.

Pati kachasị na-ama gọọmenti aka na mba ahụ bụ 'People's United Democratic Movement (Pudemo)' kwuru na nkwekọrịta mba abụọ ndị a bụ "ịtụ mgbere mmadụ e weere n'ụdọ mkpọlata ndị mmadụ."

Onye na-ebuagha maka ikike dịịrị onye bụ Lucky Lukhele kwuru na mba a ekwesighi ịbụ "ebe a na-ebusa ndị ekperima."

Ọkammụta Super kwuru na ọ bụrụgodi na mba Amerịka dara iwu na-achị mbaụwa, na ọ gaghị anata ntaramahụhụ ya maka na ha anaghị anabata ọtụtụ ụlọikpe mbaụwa.

"Ọ dịzi ka o nwere ozi a na-ezi kwuru na ị bịa na mba Amerịka na a ga-akpasị gị agwa na-adịghị mma," ka o kwuru.

Ịkpọlata mmadụ na mba na-abụghị ebe o si na-etinyekaarị onye ahụ n'ọnọdụ izendụ na-enweghi ezi nkwado ọbụla, ka Dkt Edwards kwuru.

"Atụmatụ a adịghị mma."

O kwuru na otu na-ahụ maka ikike dịịrị onye anaghị achọ ikpochi mkpọlata ndị mmadụ kama naanị nke megidere ikike dịịrị mmadụ.

N'afọ 2017, mba Izrel kpọlatara ọtụtụ ụmụafọ mba Afrịka gawa na mba Rwanda na Yuganda nke ha kpọrọ atụmatụ onye chọrọ. Nyocha BBC mere mechara chọpụta na a kpagburu ọtụtụ n'ime mgbe ha rutere.

Kedụ uru mba ndị a ga-erite na ya?

Ihe niile dị na nkwekọrịta banyere ịkpọlata ndị a ka bụ ihe zoro ezo.

Nwada Mdluli gwara BBC na ihe mere mba Eswatini jiri nabata ndị a kpọlatara "ka bụ ihe nzuzo ugbua".

Mana mba Eswatini na Saụt Sudan kwuru na ọ bụ maka ezi mmekọrịta ha na mba Amerịka.

Ọkammụta Brescia kwuru na ụfọdụ mba na-atụ ụjọ na mba Amerịka nwereike imegwara ha ma ọ bụrụ ha jụụ, dịka mmachi inye ha akwụkwọ ịbata (visa), ibuli ụtụisi ngwaahịa.

N'ọnwa Eprelụ, Amerịka kwuru na ọ ga-anapụ ụmụafọ Saụt Sudan niile akwụkwọ visa mgbe mba ahụ jụrụ ịnabata nwafọ ha e si mba Amerịka kpọlata.

O doghi anya ma nke a ọgbanweela dịka ha malitere ịnabata ndị a chụlatara site n'Amerịka.

Onye ọkachamara n'okwu ndọrọ ndọrọ bụ Machar kwuru na mba Saụt Sudan kwenyere na nke a maka na ha chọrọ ka mba Amerịka bulie mmachị ha tinyere n'isi Osote Onyeisiala ha bụ Benjamin Bol Mel.

Gọọmenti Amerịka tinyere mmachi n'isi Bol Mel n'afọ 2021 maka ebubo nrụrụaka bu nke ha nwogharịrị ya n'afọ a.

N'ọnwa Julaị, Mịnịsta mba Saụt Sudan na-ahụ maka mmekọrịta mba ndị ọzọ bụ Semaya K. Kumba zutere ngalaba na-ahụ maka ikike dịịrị onye n'Amerịka.

Mana mba ndị ọzọ dịka Naịjirịa na-esi ọnwụ n'ịnabata ndị a akpọlatara.

"Anyị nwere ọtụtụ nsogbu cheere anyị aka mgba," Mịnịsta na-ahụ maka mba ndị ọzọ na Naịjirịa bụ Yusuf Tuggar kwuru n'ọnwa Julaị, ka ọ jụrụ ịnabata ụmụafọ mba Venezuela e si Amerịka na-ebubata Naịjirịa.

Dkt Edwards kwuru na ụdịrị nkwekọrịta na-enwe ihe onyinye na-eso ya n'azụ.

"N'oge gara aga, nkwekọrịta ịkpọlata ndị mmadụ na mba na-abụghị ebe ha si, a na-enwe ihe onyinye ọkpụrụkpụ ego, onyinye ngwaagha na ihe ndị ọzọ na-eso ya," ka o kwuru.

N'ọnwa Maachị, akụkọ kwuru na Trump ga-akwụ mba El Salvador ego dị nde dọla isii ($6m) maka ịnabata ụmụafọ mba Venezuela e si Amerịka kpọlatara ha.