Ụlọnnọchiteanya Amerịka akọwaala ihe mere ha ji anapụ ndị Naịjirịa 'visa'

Ebe foto si, AFP via Getty Images
Ụlọnnọchiteanya mba Amerịka dị na Naịjirịa enyela nzaghachi gbasara akụkọ kwuru na ha na-anapụ akwụkwọ njem 'visa' ndị ha nyereburu ụfọdụ ụmụafọ Naịjirịa na-ebughị ụzọ nye nkọwa ọbụla maka ya.
Akwụkwọ akụkọ Guardian nke Naịjirịa sịrị "naanị ihe a gwara ndị a napụrụ akwụkwọ njem ha bụ na ozi ọhụrụ ha nwetara bụ ihe mere e ji napụ ha visa."
Ọnụ na-ekwuru ụlọnnọchiteanya Amerịka gwara onye ntaakụkọ BBC na ọ bụ eziokwu na ngalaba na-ahụ maka ihe ndị na-eme n'Amerịka nwere ikike ịnapụ ndị mmadụ akwụkwọ njem, mana ha ji ozi niile ha nwetara eme nke ugbua "n'ogogo a hụbeghị ụdị ya mbụ".
Dịka o siri kwuo, "nke a bụ iji chekwaa okeala Amerịka niile nakwa obodo niile e nwere n'ime mba ahụ."
Ozi ahụ si n'aka ọnụ na-ekwuru ụlọnnọchiteanya mba Amerịka sịrị na "ọchịchị Donald Trump na-echekwa mba Amerịka na ụmụafọ ha niile site n'ijigide ogogo kachasị elu maka nchekwa mba na ọhanaeze site n'usoro e si enye akwụkwọ njem."
Ka o siladị, otu onye nwetara akwụkwọ njem n'oge gara aga gwara onye ntaakụkọ BBC na ọnọdụ ahụ emetụtaghị ya.
Kemgbe ọchịchị nke ugboro abụọ ya malitere, Onyeisiala Trump ewepụtala ụfọdụ atumatụ tara akpụ maka ndị mbịarambịa si mpaghara Afrịka.
Ha gụnyere ịmachi akwụkwọ njem, ibelata oge akwụkwọ njem na ibuli ọnụego e ji enweta akwụkwọ njem.
Visa Amerịka: Ihe abụọ mere mba Amerịka jiri belata oge visa ụmụafọ Naịjirịa

Ebe foto si, Getty Images
Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.
Pịa aka ebe a ka i soro anyị
Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị
Gọọmenti etiti nke Naịjirịa ekwupụtala ihe abụọ mere mba Amerịka jiri belata ogologo oge akwụkwọ visa a na-enye ụmụafọ Naịjirịa chọrọ ịga mba Amerịka.
E kwuru na mkpebi gọọmentị Amerịka bụ maka na ọnụọgụgụ nke ụmụafọ Naịjirịa gara mba ahụ nke nọfere ogologo oge visa ha na-arị elu, dịka onye ndụmọdụ pụrụ iche nke Onyeisiala Bola Tinubu bụ Bayo Onanuga, siri kwuo.
Onanuga kwukwara na mba Amerịka kwuru na ọ dị oke mpka inweta ntụkwasị obi na ndekọ ndị dị otu ahụ.
Ọ gara n'ihu kọwaa na nhazigharị usoro inye ụmụafọ Naịjirịa visa Amerịka sonyere n'usoro nkwụghachi ụgwọ visa zuru ụwa ọnụ, nke a na-enyocha mgbe niile ma na-agbanwe ugboro ole onye ahụ nwereike iji visa ahụ banye mba Amerịka na ogologo oge visa ahụ ga-anọ.
Na nzaghachi, Onyeisiala Bola Tinubu gwara ụlọọrụ gọọmenti etiti niile ka ha hụ na ha na-erubeisi zuru oke n'ọrụ mba ụwa nke Naịjirịa.
Ọ gwara ụlọọrụ ndị ahụ ka ha jikọọ aka ọnụ na-ọrụ ịchọpụta njirimara nke ndị mmadụ na-achọ visa n'ụlọọrụ nnọchiteanya dị na mba ọzọ.
Onyeisiala gwara ụmụafọ Naịjirịa niile ka ha kwanyere iwu mbata na ọpụpụ nke mba ọbụla ha gara ugwu iji kwado ikike na ihe ugwu enyere ha n'okpuru iwu nke ikike ndị ahụ.
Cheta na gọọmenti mba Amerịka kwupụtara n'oge na-adịbeghị anya, na ha ga-enye ndị na-achọ akwụkwọ visa n'ala Naịjirịa visa ọnwa atọ nke ha ga-eji banye mba Amerịka otu ugboro kama inye ha visa afọ ise na ịbanye mba ahụ ọtụtụ ugboro bụ nke a na-emekarị.
Ọ bụ ezie na ụlọọrụ nnọchi anya mba Amerịka dị na Naịjirịa na mbụ kwuru na mkpebi ya gbadoro ụkwụ na nkwụghachi ụgwọ, o mechara kwuo na mkpebi a sonyere na nke zuru ụwa ọnụ iji nyochaa usoro visa ya n'ụwa niile.
Ihe mere anyị jiri belata etu anyị si enye ụmụafọ Naịjirịa visa - Mba Amerịka

Ebe foto si, Getty Images
Ngalaba na-ahụ maka ihe na-eme n'obodo na mba Amerịka ewepụtala usoro ọhụrụ ga-ebelata etu esi enye akwụkwọ njem 'visa' n'ọtụtụ mba nke gụnyere Naịjirịa.
Iwu akwụkwọ njem ọhụrụ a, nke ngalaba ahụ kwuru na ọ ga-amalite ozugbo, ga-emetụta visa abụghị maka ndị mbịarambịa na visa abụghị maka ndị nnọchiteanya.
Ozi nke Ngalaba a wepụtara na weebụsatị ya n'ụbọchị Tuzde 8 Julaị 2025, kwuru na mba Amerịka ga na-enye ụmụafọ Naịjirịa akwụkwọ njem ga-abụ naanị ọnwa atọ nakwa ohere ịbanye n'Amerịka otu ugboro.
Ha gara n'ihu kwuo na iwu ọhụrụ a nke a kpọrọ "iwu nzaghachi" bụ iji kwụghachi ụmụafọ Naịjirịa ihe mba Naịjirịa na-eme ụmụafọ Amerịka na-achọ akwụkwọ njem visa.
Ngalaba ahụ kwuru na ọ bụ usoro na-aga n'ihu nke e nwereike innyocha maọbụ gbanwee oge ọ bụla.
Kedụ ndị iwu ọhụrụ a ga-emetụta?
Ọtụtụ ụmụafọ Naịjirịa nọ n'egwu ugbua dịka a na-ekwu na mgbanwe a ga-emetụta ọtụtụ ụmụakwụkwọ Naịjirịa, ndị na-achụnta ego, ndị njem nlegharị anya, n'ezinụlọ ndị na-aga Amerịka ugboro ugboro maka ebumnuche dị iche iche.
N'ime ihe niile a, Ngalaba ahụ kwuru na iwu ọhụrụ a, agaghị emetụta ụmụafọ Naịjirịa ha nyeburu akwụkwọ njem "visa" ịbata Amerịka tupu 8 Julaị 2025, bụ ụbọchị e kwuru na iwu ọhụrụ a ga-amalite.
Ọzọ, iwu a ga-emetụta ndị na-achọ visa abụghị maka ndị mbịarambịa na visa abụghị maka ndị nnọchiteanya.
Kedụ maka ụmụakwụkwọ?
Otu nwakwụkwọ nwetara akwụkwọ njem "visa" nke Amerịka ọhụrụ na Naịjirịa nke a chọghị ka anyị kpọọ aha ya, gwara BBC na mgbe ọ gara inweta akwụkwọ njem visa ahụ, na ụlọọrụ nnọchiteanya mba Amerịka na Naịjirịa nyere ya akwụkwọ njem (visa J1) nke afọ abụọ.
O kwuru na onye ọrụ ụlọọrụ nnọchiteanya mba Amerịka na Naịjirịa gbara ya ajụjụ ọnụ kọwara ya na iwu ọhụrụ a pụtara na "ọ ga-eji visa ahụ banye Amerịka naanị otu ugboro".
O kwukwara na onye ahụ ga-abanye n'Amerịka n'ime ọnwa atọ malite n'ụbọchi e nyere ya visa ahụ, ma ọ bụrụ na o meghị njem n'oge ahụ, onye ahụ ga-etinye akwụkwọ maka inweta visa ọhụrụ.
"Ọzọkwa, ọ bụrụ na onye ahụ hapụ Amerịka mee njem, ọ ga-etinye akwụkwọ maka inweta visa ọzọ n'ihi na ọ bụ ohere otu ugboro ka akwụkwọ njem ya nyere ya ịbanye Amerịka."
Amerịka emegharịala usoro iwu eji enye ụmụafọ Gana akwụkwọ njem 'visa'
Gọọmenti mba Amerịka emegharịala usoro iwu eji enye ụmụafọ Gana akwụkwọ njem 'visa' dịka ha belatara ogologo oge ụmụafọ Gana abụghị ndị mbịarambịa ga-anọ na ugboro ole ha nwereike iji akwụkwọ njem ha banye na mba Amerịka.
Dịka usoro iwu ọhụrụ nke ụlọọrụ nnọchiteanya gọọmenti Amerịka siri kwuo, ụmụafọ Gana na-achọ akwụkwọ njem visa ọkacha ndị na-achọ akwụkwọ njem nlegaharị anya na nke ndị na-azụahịa a kpọrọ B1/B2 visa maọbụ F1 visa, ka a ga na-enye akwụkwọ njem visa ọnwa atọ na ịbanye mba Amerịka otu ugboro.
Ha gara n'ihu kwuo na mgbanwe ndị a ga-emetụtakwa ụmụakwụkwọ si Gana.
N'okpuru iwu ọhụrụ a, ndị chọrọ visa ụmụakwụkwọ (F1) ga-enweta visa ha ga-eji banye mba Amerịka naanị otu ugboro n'ime ọnwa atọ, n'agbanyeghị ogologo oge ha nwere ịgụ akwụkwọ n'Amerịka.








