Ụmụnwaanyị hapụ nụ nwoke ọbụla na-eti gị ihe - Otiegwu Amarachi Joy
- Onye dere ya, Uzoamaka Ewuzie na Donald Wogu
- Ndị mere akụkọ a, Senior Journalist and Video Journalist
- Ebeg o si, Legọs
Otiegwu ụka a ma ama na Naịjirịa bụ Nwada Amarachi Joy Mbakwe enyeela ụmụnwaanyị na-alụ di ọkachasị ndị ha na di ha na-enwe nsogbu ndụmọdụ pụrụiche banyere ịgba alụkwaghịm.
Na mkparịtaụka ya na BBC Igbo nwere, nwada ahụ bụ onye Imo Steeti, n'okpuruọchịchị Njamba, kwuru na ya malitere ibugha n'ezinaụlọ ya n'afọ 2005 ọ lụrụ di.
"Ọ bụrụ na mụ azọpụtaghị ndụ m, agaara m anwụ tupu Otiegwu Osinachi. A naghị akwado ịgba alụkwaghị mana ihe ọbụla nwereike ime mmadụ e jiri aka kụgbuo gị hapụ onye ahụ zọpụta ndụ gị," ka o kwuru.

Otiegwu Amarachi bụ onye e ji egwu "Favour Room" nke ya na onye bụbu di ya a kpọrọ Blessed Samuel gụrụ n'afọ 2006 wee maara, gara n'ihu kwuo na ọ bụrụ na ya azọpụtaghị ndụ ya, na ya gara anwụ tupu Otiegwu Osinachi.
Nwada Amarachi kọwara na ọ bụ ọtụtụ ihe ụmụnwaanyị na-amụ nwa na-ahụ ebe ahụ a na-ede 'Labour room' kpalitere egwu 'Favour Room' iji gbaa ụmụnwaanyị na-amụ nwa ume ka ha kpọọ ije ịmụ nwa ihe ga-amara ha mma.
Amarachi bụ onye gụrụ egwu a na-akpọ 'Akaraka m' tupu ọ gụọ 'Favour Room', gwara BBC na ya na e nweta egwu na nrọ ma ọ na-ekpe ekpere.
O kwuru na o tikwara egwu ọhụrụ atọ gụnyere "Chi Ndị Amụma", "Onye dika Chi" na "How Beautiful Jesus Can Be".
O kọwara na Chi Ndị Amụma na-egosipụta na e nwere ọtụtụ ndị oziọma Chineke na ụkọchụkwu n'ụwa taa mana ha niile na-arụ ọrụ dị ka echiche nke Chineke siri dị.
N'aka nke ọzọ, Onye dika Chi bụ egwu nke na-efe ma na-eto aha Chineke, na-ebuli aha ya elu n'ebe kachasị elu.
O kwukwara na egwu 'Beautiful Jesus' na-egosipụta isi ihe niile banyere Kraịst gụnyere obi ọma ya, ihụnanya na aja ya, nke bụ ebe ịma mma ya dị.

Ebe foto si, Evang Amarachi Joy/Facebook
Amarachi bụ onye e ji ịgụ egwu n'ọgbakọ mmemme dị icheniche gụnyere agbamakwụkwọ, oliliozu na mmemme ndị ọzọ maara, kwuru na ezinaụlọ ya na nke onye omee ejije bụ Chief Imo na-adị na mma nke ukwuu.
O kwukwara na ya na Chief Imo na-arụkọ ọrụ itiegwu dịka ha abụọ gụrụ egwu ọhụrụ a maara dịka 'Kele Chukwu'.



