Ihe Chinyere Udoma kwuru gbasara ịgba alụkwaghịm

Aha onyonyo, Etu Lucky Dube siri kpalite mmụọ m ịgụ egwu ụka - Chinyere Udoma
    • Onye dere ya, Chinonso Ugorji na Donald Wogu
    • Ndị mere akụkọ a, Journalist and Video Journalist
  • Oge e ji agụ akụkọ nkeji 4

Otu n'ime ndị a ma ama na-eti egwu ụka na Naịjirịa, ọkachasị na mpaghara Ọwụwa anyanwụ bụ Chinyere Udoma akọwaala etu Lucky Dube siri kpalite mmụọ ya iti egwu.

Nwaanyị ahụ a mụrụ na Nnokwa ma lụọ ya n'Ado dị n'Anambra steeti kwuputara nke a oge BBC News Igbo gbara ya ajụjụ pụrụiche.

Ọ sịrị "Lucky Dube kpalitere mmụọ m ebe ọ dị ukwuu. Anaghị m ege etu egwu ya si ada kama ihe m na-ege bụ ahịrị egwu ya".

"Ọ na-abụ m na-ege egwu ya oge ụfọdụ, m malite ịkwa akwa. Ndị mmadụ na-ajụ ihe mere egwu na-abụghị egwu ụka ji eme ka m na-akwa akwa. Ọ bụrụ ma gị tọọ ntị n'ala nụrụ ihe Lucky Dube na-agụ n'egwu ya, ị ga-achọpụta na e nwere ihe dị omimi egwu ya na-akọwa karịa ụda ya," ka Udoma gwara anyị

O kwukwara na ndị ọzọ soro kpalite mmụọ ya iti egwu bụ Onyeka Onwenu na Sunny Okosun.

Chinyere Udoma kọwara ihe o chere mere ndị na-eti egwu ji akpọ ya 'Odudu Woman'.

Ọ sịrị, "ikekwe ya abụrụ maka na eburu m nnukwu ibu. Oge ụfọdụ, ana m echekwa na ọ bụ maka na ha chere na m nwere ego. Alụrụ m ọgụ ya, ike agwụ m, m malitezie ịza ya ka udo dị."

Ụfọdụ mmadụ chere na ọ bụ onye na-eme mpako mana nwaanyị ahụ malitere iti egwu kemgbe ihe karịrị afọ iri atọ na ise (35) kwuru na ọ bụghị nganga ka ọ na-eme kama ọ na-ere ure n'ime Chineke maka ọtụtụ ihe ọma Chukwu meere ya.

Gafere Ọkwa azụmahịa WhatsApp ma gaa n'ihu na-agụ
Anyị nọ na WhatsApp

Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.

Pịa aka ebe a ka i soro anyị

Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị

Ochie dike ahụ na-eti egwu sịrị na ọ naghị ede egwu kama ọ bụ mmụọ nsọ na-enye ya egwu ma na-enyekwa ya ntụziaka gbasara oge ọ ga-ewepụta ha. Nke a ka o kwuru mere egwu ya niile ji apụ iche.

Udoma rụtụkwara aka n'ụdịrị egwu ha na-etipụta n'oge ochie na ndị nke ha na-etipụta n'oge ugbua.

N'okwu ya: "Etu mbụ anyị si etipụta egwu bụ ya bụ abụ ofufe, nke ndị ụka Anglịkan na-akpọ ofufe nro, abụ otuto. Ị ma na ịgụ egwu dị iche n'ịbụrụ Chineke abụ. Ọ bụ oge ahụ ka egwu nwere ihe ọ na-akọwa, nke bụ na ị na-agụ ya, eluigwe emeghee".

O kwuru na ụdịrị egwu ha na-eti ugbua bụ nke ha ji adọtara Chukwu ọgbọ nke dị ugbua.

Ọ sịrị "oge ụfọdụ m na-ajụ ma ọ bụzikwa egwu ụka ka anyị na-eti. Mana ọ tọkwara ụtọ ma bụrụ nke na-enye ụmụ ọgbara ọhụrụ ọṅụ pụrụ iche. N'uche m, ihe ọbụla a ga-eme iji dọtara ha Chukwu, ana m akwado ya".

"Ihe anyị na-emezi bụ ịkpatụ aka n'ụda egwu anyị, ọ bụghị ozi anyị na-ezi n'ime ya. Anyị na-eme ya ka ọ dabara ọgbọ dị ugbua, ka ha nwee ike jiri ya bịaruo Chukwu nso," ka Udoma kọwara.

Chinyere Udoma kọwara ihe o chere mere ndị na-eti egwu ji akpọ ya 'Odudu Woman'.
Nkọwa foto, Chinyere Udoma kọwara ihe o chere mere ndị na-eti egwu ji akpọ ya 'Odudu Woman'.

Chinyere Udoma kwukwara okwu gbasara onye ya na ya sooro mepụta ụfọdụ egwu bụ Ndidiamaka.

Ọ kọwara na Ndidiamaka bụ ezigbo enyi ya ma bụrụkwa onye ya na ya na-emekọta ihe egwu mana ọ naghị eti egwu.

"N'oge mbụ, mmadụ nwereike tipụta ọtụtụ efere egwu mana ihu ya pụta na ha niile, ọ gaghị ere ahịa. Mana i were foto onye ọzọ tinye n'ihu efere egwu gị ndị ọzọ, ndị mmadụ azụrụ ya na-amaghị na ọ bụ gị tipụtara ha".

"Ebumnobi anyị n'oge ahụ bụ iji foto ndị ọzọ wepụta egwu dị iche iche ndị m tipụtara. Ọ bụ di Ndidiamaka nwe ụlọọrụ na-ekesara m egwu oge ahụ nke mere o jiri gbaa mbọ itinye nwunye ya ka ihu ya nwee ike pụta n'egwu m," ka Odudu Woman kọwara.

Gbasara ịgba alụkwaghịm, Chinyere Udoma kwuru na ọ naghị akwado nkewa n'etiti di na nwunye, ọkachasị oge ha mụrụ nwa.

"N'uche m, akwadoghị m ịgba alụkwaghịm mana ọ bụrụ na ị chọpụta na nke gị adabaghị, aga m asị ka ị pụta. Ọ ka mma ka mmadụ abụọ ahụ dị ndụ kọọ ka ha na ije siri gaa" bụ ndụmọdụ Chinyere Udoma.

Chinyere Udoma oge ọ na-eti egwu

Ebe foto si, Chinyere Udoma/Facebook

Nkọwa foto, Chinyere Udoma kwuru na Ndidiamaka bụ ezigbo enyi ya ma bụrụkwa onye ya na ya na-emekọta ihe egwu mana ọ naghị eti egwu.