Ọ bụ agwa nne m ka m na-eṅomi - Sister Nkechinyere
- Onye dere ya, Chinonso Ugorji na Donald Wogu
- Ndị mere akụkọ a, Journalist and Video Journalist
Sampson Obumnaeme Oranugo e ji 'Sister Nkechinyere Nwaobasi' mara bụ nwaafọ Naịjirịa na-emepụta nkenke ejije ntọọchị a maara dịka skit n'asụsụ Bekee ma bụrụkwa onye na-eti egwu.
Na mkparịtaụka ya na BBC nwere, Oranugo kọwara na ya bụ nwaafọ Anambra steeti mana a mụrụ ya n'Aba dị n'Abịa steeti.
Ọ kọwara na ime ihe ịkpaọchị bụ akaraaka Chineke jiri gọzie ya mana ebe o siri nweta mkpali mmụọ maka ụdị nkenke ejije ọ na-eme bụ site n'ụlọụka Cherubim and Seraphim nne ya na-akpọ ya aga oge ọ bụ nwata.

Nkechinyere ọ na-aza n'ejije ya bụ aha onye agbataobi ha, dịka o siri kwuo. Ọ sịrị na ọ maghị na ejije ịkpaọchi ya ga-abụ ihe a ma ama n'ihi na ebumnobi o jiri malite bụ ime ndị mmadụ obiụtọ.
Dịka Oranugo siri kwuo, ọ bụ nne ya ka ọ na-eṅomi n'ejije ịkpaọchi ya n'ihi na ọ bụ ụdị agwa ọ na-egosipụta mgbe ọ na-ebu amụma.
Ọ sịrị na ya malitere ime ejije oge ọ dị naanị afọ iri mana ọ malitere ịgụrụ ndị na-emepụta ejije egwu n'afọ 2008.
Ọ gwara anyị na ya na-akwado ihibe ebe ọ ga na-azụpụta ndị nwere mmasị ime ejije, ịgụ egwu nakwa ọnatarachi ndị ọzọ.
Ọ gwara ndị na-emepụta nkenke ejije ka ha ghọta ihe mere Chukwu ji nye ha onyinye amara o nyere ha.
Ọ kọwara na ọ dị ezigbo mkpa ịghọta ụdị ozi ha na-agbasa site n'ejije ha.



