Nne na nna m chere na m na-eme ihe abaghị uru oge m malitere ime ihe ngosi - Marahchi

- Onye dere ya, Chinonso Ugorji na Donald Wogu
- Ndị mere akụkọ a, Journalist and Video Journalist
Amarachi (Marahchi) a maara dịka Ada Igbo Niile bụ nwaada na-eme ihe ngosi, Bekee kpọrọ content creation.
Na mkparịtaụka ya na BBC Igbo nwere, ọ kọwara na ya bụ nwaafọ Ihuokpara dị n'Okpuruọchịchị Nkanu East n'Enugwu steeti mana a mụrụ ya n'Anambra steeti.
O kwuru na ya malitere ime ihe ngosi oge Gọọmenti Naịjirịa gbachiri obodo niile n'ihi ntiwapụ ọrịa covid-19. Dịka o siri kwuo, ọ bụ n'ọbaozi TikTok ka ọ malitere ime ihe ngosi ya tupu ọ banye Facebook, Instagram na ndị ọzọ.
Ọ kọọrọ anyi na nne na nna ya akwadoghị ya oge ọ malitere ọhụrụ n'ihi na ha chere na ọ na-eme ihe enweghị isi mana ọ bụzi oge otu ihe ngosi ya gbasara ebe niile nke mere ndị mmadụ jiri kpọọ ha site na mba ofesi, ka ha malitere inye ya nkwado.
Amarachi kwuru na ụdị ihe ngosi ọ na-eme bụ okwu ọnụ dịka ọ na-enweta mkpalite mmụọ site n'ihe ndị na-eme gburugburu ya, ihe ndị ọ na-ahụ na ihe ndị ọ na-anụ.
Ọ sịrị na a ma ya ama na Legọs steeti nakwa n'ala Igbo niile.
O jikwa ohere ahụ kwuo na ọ bụ asị na ya na otiegwu a ma ama bụ Anyidons na-eme ọyị maọbụ na-akwadokwa ịlụ di na nwunye.
O nyere ndị na-eme ihe ngosi, ọkachasị n'ala Igbo ndụmọdụ ka ha kwalite ogogo ihe ndị ha na-eme ka ọ dịrị ka nke ndị ogbo ha n'obodo ndị ọzọ mepere emepe.
O nyekwara ndị na-amalite ime ihe ngosi ndụmọdụ ka ha mara ihe ha na-eme n'ihi na ọ bụghị na a ma mmadụ ama bụ isiokwu kama, ihe e ji mara onye ahụ.



