Akwamozu nne Obi Cubana gbanwere ndụ m - Anyidons

Aha onyonyo, Ihe mere m ka kụchara egwu n'akwamozu mama Obi Cubana - Anyidons
Akwamozu nne Obi Cubana gbanwere ndụ m - Anyidons
    • Onye dere ya, Michael Ngene na Amaka Bassey
    • Ndị mere akụkọ a, Journalist na Video Journalist
    • Ebeg o si, Legọs

Ifeanyi Dons Frank onye a maa dịka 'Anyidons Onye Ichaka' bụ ezi nwaafọ Igbo na-eti egwu highlife.

N'afọ a bụ 2024, Anyidons mere ncheta afọ iri kemgbe o bidoro iti egwu highlife. Ọ bụ onye bidoro wube enwu n'akwamozu mama Obi Cubana n'afọ 2021.

Na mkparịtaụka Anyidons na Michael Ngene na Amaka Bassey nke BBC Igbo nwere, o kwuru ka njem egwu highlife ya si bido, ebe ọ nọ ugbu a tinyere nzukọ ya na Obi Cubana.

"Obi Cubana gbanwere ndụ m, ọ bụ E-money mere ka nzukọ mee" Na mkparịtaụka a, Anyidons gwara anyị ihe mere e ji akpọ ya 'Onye Ichaka'.

"Mgbe m bidoro tibe egwu highlife, enweghị onye na-ayọọ Ichaka ka m si chọọ, ọ bụ ya mere m ji bido nyọba Ichaka" Kirie mkparịtụka a ugbua.

Anyi dons nakwa Obi Cubana

Ebe foto si, BBC/Anyidons Instagram