Flavour N'abania: Ihe jikọrọ mụ na Chidimma Ekile

Ebe foto si, Flavour/Youtube
- Onye dere ya, Adline Okere
- Ndị mere akụkọ a, Editor, BBC Igbo
- Oge e ji agụ akụkọ nkeji 2
Flavour Nabania bụ onye ọgụ egwu amaama. Ezigbo aha ya bụ Chinedu Izuchukwu Okoli, mana ndị mmadụ na-etu ya 'Ijele' na 'Flavour of Africa' dịka aha otito ya.
Ọ bụ onye Umunze nke dị n'Orumba Saut, n'Anambra state, mana amụrụ ya n'Enugu, ọ bụkwanụ ebe a ka ọ nọ too.
Na mkparịtaụka ya na BBC Igbo nwere n'ụbọchị Tọzde, ọ kọwara ọtụtụ ihe, nke otu n'ime ha bụ ihe gbasara ya na otiegwu ọzọ bụ Chidimma Ekile.
Cheta na ọtụtụ asịrị efesaala na mmadụọ abụọ a na-eme ọyị nwoke na ọyị nwaanyị.
Mana Flavour kọwara na ya na Chidimma dị na mma, mana adịmnamma ha bụ naanị maka iti egwu.
O kwuru sị: "Ihe jikọrọ mụ na Chidimma bụ egwu."
"Oge anyị susuru ọnụ n'onyonyo, ọ bụkwa egwu, n'ihi na egwu anyị tiri n'oge ahụ bụ egwu ịhụnanya."
"Isusu ọnụ ahụ dịka ime ejije iji gosipụta ihe anyị na-agụ na ya bụ egwu."
"Ọ dị ka oge mmadụ nwụrụ n'ime ejije (film). Onye ahụ anwụghị n'eziokwu maka na ị ga-ahụkwa ya na onyonyo ọzọ."
Lee etu ya bụ mkparịtaụka si gaa:
Content is not available
View content on FacebookBBC anaghị ahụta maka ọdịnaya nke saịtị ndị dị na mpụga.sEnd of Facebook post
Flavour bụ gbazuoagụ n'ihe gbasara iti egwu.
Ọ tiela egwu ụka, egwu ọdịnala, egwu oringo, egwu agbamakwụkwọ, na ọtụtụ ụdị egwu ndị ọzọ.
Mana ụfọdụ na-ekwu na e ji egwu dị aṅaa mara ya, egwu ndị dịka; 'pantị nọ n'ilo', 'ala dara ada adago' na ndị ọzọ.

Ya na ndị ọtiegwụ ndị ọzọ agụọla egwu, ndị dịka Chidimma, Zoro Swagbag, Phyno, Ụmụ Obiligbo na ndị ọzọ.

Ebe foto si, Flavour/YouTube
Na mkparịtaụka Flavour na Jessica Nwankwo, onye ntaakụkọ BBC Igbo nwere, ọ gwara ya ihe ndị dị aghaa dịka:
- Flavour kwuru na ọ bụ n'aka onye na-ere ụlọ ka o si nweta aha ya 'Flavour'
- Na mbido, nne ya akwadoghi ya igu egwu
- O si n'ụlọ gbapụ sonyere
- O sonyere ndị ukwe n'ụlọụka ha mgbe ọ dị afọ iri
- O bidoro ịgụ 'Business management' na UNN mana o kworo maka egwu chịsa ọwa n'igu akwụkwọ mahadum ya.
- Ịlụ nwaanyị bụ eze aga-echi echi. Ọ kpokuru ụmụnwaanyị ka ha detawa akụkọ.
Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị:












