Buchi: Ihe ndị ị maghị maka otiegwu ụka a

Aha onyonyo, Buchi: Ihe ndị ị maghị maka otiegwu ụka a

Buchi Atuonwu, onye a maara dịka "Buchi" bụ otiegwu ụka ama ama na Naijiria nakwa mbaụwa.

Mana ọtụtụ amaghị na nwa amadị a bụ onye Oboro n’Abia steeti, bụ onye nkuzi mahadum ma bụrụkwa onye derela ọtụtụ akwụkwọ.

Ọtụtụ amaghịkwa na Buchi bụ onye na-akwa akwa nke a maara dịka "fashion designer" na Bekee.

Ọ bụkwa onye otu nzuzo tupu o chegharịa ma jirizie egwu na-agbasa oziọma.

Na mkparịtaụka ya na BBC Igbo nwere, Buchi onye e ji egwu ‘Mma Mma” mara, tupenyere ụmụ Igbo azụ etu ije ya na iti egwu siri bido.

Lee ya n’uju: