Ike Ekweremadu: Ndị gbagharịrị akwụkwọ ewepụtala ikpe n'ụlọikpe

Ike Ekweremadu

Ebe foto si, Ike Ekweremadu

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 5

Ụlọikpe mba Jamini agbaala ama na ndị gbagharịrị akwụkwọ na mkpebi ha nyere n'okwu ịwakpo Ike Ekweremmadu ewepụla ya bụ akwụkwọ ha gbara n'ụlọikpe.

Cheta na ụlọikpe dị na Jamini taburu mmadụ anọ a nwuchiri site na ịda ha nha ma manye ha ịrụ ọrụ akwụ ụgwọ abalị 20 maka ịwakpo Ekweremadu oge ọ gara mmemme iri ji na n'obodo Nuremberg dị na mba ahụ.

N'ọsịsa ajụjụ anyị zigara ha banyere etu okwu siri kwụrụ n'ikpe ahụ, ojeozi ụlọikpe ahụ bụ Corinna Rathke gwara BBC Igbo , "Ihe anyị ga-agwa ụnụ bụ na e wepụla akwụkwọ mgbagha mkpebi niile e nyere na ikpe ahụ. ebe nha ahụ a dara ka kwụchịm."

A nwụchiburu ndị e chere na ha bụ ụmụ afọ Igbo nọ na mba Jamini bụ wakporo Ekweremadu ma tie ya ihe n'afọ 2019.

Ndị ụlọikpe ahụ ekweghị agwa BBC Igbo aha ndị ha nyere ntaramaahụhụ maọbụ gbaa foto ha n'anwụ dịka o megidere iwu mba ahụ.

Ụlọikpe dara mmadụ anọ wakporo Ekweremadu nha na Jamini

Ekweremadu

Ebe foto si, Ike Ekweremadu

Nkọwa foto, Ekweremadu bụbu osote onyeisi Ụlọimeiwu Ukwu

Otu ụlọikpe dị na mba Jamini adaala mmadụ anọ wakporo onye omeiwu bụ Ike Ekweremadu n'afọ 2019 nha.

N'ozi ha ziteere BBC Igbo ha kọwara na e nyochara ihe mere ọfụma tupu a kpụpụ ndị a ụlọikpe ma daa ha nha.

Ozi ahụ kwukwara na mmadụ abụọ n'ime ndị ahụ na-eme mkpesa maka nha a dara ha.

A mabeghi nha ego ole a dara ndị a mana ozi ahụ kwuru na ọ bụ ụbọchị iri abụọ ka ha ji akwụ ya bụ ụgwọ.

Mgbe BBC kpọtụrụ Ekweremadu ịnụ olu ya gbasara okwu a, onye na-ekwuchitere ya bụ Uche Anichuwku tinyere ọnụ n'okwu a.

O kwuru si, "achọghị m ikwu ihe ọbụla gbasara ya bụ okwu".

Cheta na ndị uweojii n'obodo Nuremberg na Jamini nwụchiri mmadụ anọ maka ebubo mwakpo Ike Ekweremadu n'emume iri ji na mba ahụ.

Anyị na-enyocha ndị wakporo Ekweremadu

German Police/Ekweremadu

Ebe foto si, German Police/Ekweremadu

Ndị uweojii mba Jamini ekwuola na ha amalitela inyocha mmadụ anọ maka ihe mere Ike Ekweremadụ n'obodo Nuremberg oge ọ bịara njem n'ala ahụ na nsonso a.

Maazị Robert Sandmann, onyeisi nchọpụta ndị uweojii na Jamanị, bụ onye gwara onye ntaakụkọ BBC Igbo nke a.

Ọ sị na ndị mmadụ wakporo ma tie Ekweremadu bụ Sinetọ na-anọchite anya Enugwu West n'ụlọomeiwu ihe na Nuremberg, mba Jamini ebe ọ gara Iri Ji ndị Igbo nọ na mba ahụ.

Na nzaghachi ozi BBC Igbo zigara ha, ndị isi ụlọọrụ ndị uweojii dị na Mittelfranken, Nürnberg kwuru sị:

"N'ezie ihe dịka ihe i kwuru mere n'elekere atọ nke ehihie n'ụbọchị 17 nke ọnwa Ọgọstụ, afọ 2019 na Nuremberg dị na Schmausenbuckstraße.

"Ndị uweojii gbalịrị ichekwa onye o metụtara ma duru ya gaa n'ụgbọala ya ma sorokwa dulaa ya n'ụlọoriri na nkwari ebe o hiri na Nuremberg.

"Oge ọ na-ala site n'ebe a nọrọ mee emume, a tụrụ akwa n'ụgbọala onye ihe metụtara.

"Ka nke a na-eme, ndị uweojii nyere iwu ka ndị a si ebe ahụ pụọ dịka ha bidorola nnyocha mmadụ anọ."

Ekweremadu bụ onye gbaburu ama ihe mere ya n'ozi si n'aka ọnụ na-ekwuru ya bụ Uche Anichukwu.

Ọ bụ ndị Ipob wakporo m - Ekweremadu

Ekweremadu

Ebe foto si, Getty Images

Ọ sị na Ndigbo nọ ebe ahụ nabatara ya nke ọma rue mgbe ndị sị na ha bụ ndị Ipob bịara bute ọgbaghara ma kwuo na onweghi na emume ahụ agaghị adịzi.

"A chọrọ m ka m rịọ ha mana mgbe ha bidoro ịkpa agwa dị aghaa, e siri m ebe ahụ pụọ site na enyemaka ndị uweojii."

Ihe onyonyo dị na Facebook na-egosi etu ndị mmadụ si kụsasịa emume iri ji ndị Igbo bi n'obodo Nuremberg dị na Jamanị na-eme.

Ụfọdụ ihe onyoonyoo a gosikwara ka ndị a wakporo otu onye ha na-akpo "Ekweremadu" bịara ya bụ emume.

Ihe onyoonyoo a malitere igosi ebe otu nwoke yi uwe isi agụ ojii na achọ ụzọ ịba n'ụlọ emume a ka ọtụtụ mmadụ na-awakpo ya ma gbochiere ya ịba n'ime ụlọ ahụ.

Nwoke ahụ mechara dabanye n'ime ụgbọala ya gbalaga ọsọ.

Skip X post
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post

Nchọpụta BBC Igbo bụ na obodo Nuremberg bụ ebe ehiwere emume akpọrọ "Igbo Cultural Festival" nke afọ 2019.

Ike Ekweremadu, bụ omeiwu na-anọchịte Enugwu West so na ndị a na-ele anya ha na ya bu emume dịka ụlọ ntaakụkọ African Courier siri dee.

Facebook ndị Igbo Jamanị dekwara na ọ bụ ya bụ isi oche na ya bụ emume.

Onye omeiwu na-anọchịte Awgu, Oji River na Aninri n'ụlọ Omeiwu obele bu Toby Okechukwu gwara BBC Igbo na ya so Sịnetọ Ekweremadu ga ya bu emume.

"Ọ bu ndị Ipob mere ihe a. Ka anyị ruru ebe ahụ, anyị hụrụ ha, wee gaa kelee ha."

Maazị Okechukwu sị na ọ bu mgbe ha na-achọzị ịbanye ebe a na-eme ya bụ emume "ka ndị Ipob ahụ bidoro kpawa agwa ha aghọtaghị."

"Ha malitere tụwa Sịnetọ Ekweremadu akwa na ihe ndị ọzọ."

Omeiwu Okechukwu si na Sịnetọ Ekweremadu rapụrụ ebe ahụ, mana ndị uweojii mechara bịa jide ụfọdụ n'ime ndị kpara agwa a.

Ọ jụkwara ihe mere ndị Ipob ga-eji sị na Ekweremadu bu onye iro ha.

"Ha echefuola na Maaazị Kanu gara be Ekweremadu inye ya ekele maka mbọ ọ gbara mgbe o nọ na mkpọrọ dịka atọhapụrụ ya?"

N'ịgba akaebe ihe Maazị Okechukwu kwuru, ihe onyonyo dị na Facebook gosiri na ụfọdụ so eme mwakpo a yi ọkọlọtọ Ipob.

Mana ọkaiwu Paul Achara, onye ya na Nnamdi Kanu na-arụkọ, gwara BBC Igbo na ndị Ipob agaghi emenwu ụdịrị ihe a.

Otu onye so mee mwakpo na Nuremberg
Nkọwa foto, Otu n'ime ndị no mgbe mwakpo a na-eme dịka ihe nkiri siri gosi yi okọlọtọ Ipob n'uwe ya

Agbanyeghị nke a, Paul Achara bụ onye ya na Maazị Kanu na-arụkọ gwara BBC Igbo na aka Ipob adịghị n'ihe a mere.

"Na mmadụ yi ejirimara Ipob abụghị na onye ahụ onye Ipob."

N'aka nke ọzọ, o kwekwara nkwa na Ipob ga-eme nchopụta ihe mere.

"Yabụrụ na ndi otu anyị mejọrọ, Ipob ga-arịọ mgbaghara dịka anyi mere mgbe ụfọdụ n'ime ha gara ụlọ ụka kpaa agwa ezighi ezi."

Ipob na onwe ha na-eme emume igosi nka metụtara agha Biafra na Naijirịa na obodo Eliza.

Ndị a kpara mkpa mkpa na-ekwu n'ime iho onyonyo ndị a na ndị na-eme emume iri ji a na Nuremberg adịghị eche maka ihe na-emegasi n'ala nna ya.

Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị: