Enugu International Airport: A ga-emechi ọdụ ụgbọelu Enugwu n'Ọgọst 24

Akanu-Ibiam Airport Enugwu
Nkọwa foto, Akanu Ibiam Airport Enugwu
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 3

Ngalaba na-ahụ maka njem ụgbọelu na Naijiria amaala ọkwa na ha ga-emechi okporoụzọ ugbọelu nke dị na ogige "Akanu Ibiam International Airport" Enugwu bido n'abalị iri abụọ na anọ nke ọnwa Ọgọst.

Nke a bụ iji ruzie okporoụzọ ahụ ma tinyekwa ihe ndị ọzọ ga-ewelite ọnọdụ nchekwa n'ogige ụgbọelu a.

Amatabeghi izuụka maọbụ onwa ole ọ ga-ewe iji ruzie okporoụzọ ụgbọelu ahụ.

Mana Henrietta Yakubu, bụ onye binyere aka n'akwụkwọ ozi nke Faan wepụtara kwuru na a ga-eme ka ọha obodo mata ma oge ruo.

FBI

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, FBI

Akụkọ na-ekusa na soshal midia Naịjirịa bụ na aka ndị uweojii nzuzo mba Amerịka bụ FBI akparala otu nwa afọ Naịjirịa si na nwata kpaa ego.

Skip X post
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post

BBC ka na-eme nnyocha ịmata nke bụ eziokwu mana ọtụtụ ndị mmadụ na-ekwu na ọ bụrụ eziokwu, o bụkwa agwa ọzọ so emebi aha obodo Naịjirịa.

Akụkọ na-abịa.

Udo alọghachila na Sudan

Protest leader Ahmed al-Rabie (2nd-R) alongside Lt-Gen Abdel Fattah Abdelrahman Burhan (C), head of Sudan's ruling Transitional Military Council during the signing ceremony in Khartoum on August 17, 2019, accompanied by General Hamdan Daglo "Hemeti" (2nd-L), TMC deputy chief and commander of the Rapid Support Forces paramilitaries, Ethiopian Prime Minister Abiy Ahmed (L), and Chadian President Idriss Deby (3rd-L)

Ebe foto si, AFP

Na mba ofesi, e nweela nkwekọrịta pụrụ iche n'etiti ndị agha na ndị nkịtị na mba Sudan, nke ga-enye aka maka ịhazi ntụliaka n'obodo ahụ iji mee ka ndị nkịtị lọghachi n'ọchịchị.

Onyeisi ndị agha bụ Abdel Fattah Abdelrahman Burhan na onye ndu ndị na-eme ngagharịiwe bụ Ahmed al-Rabie binyere aka n'akwụkwọ nkwekọrịta a.

Cheta na ọgbaaghara malitere na mba Sudan n'ọnwa Disemba 2018 mgbe ndị mmadụ bidoro ngagharịiwe iji chutuo Omar al-Bashir bụ onye chịrịla obodo ahụ afọ iri atọ.

N'ọnwa Eprel afọ a ka ndị agha chụturu Al-Bashir, mana ngagharịiwe malitekwara ọzọ mgbe ndị agha ahụ jụrụ ịhazi ntuliaka ma nyefee ndị nkịtị ọchịchị.

Liverpool na Arsenal emeriela

Sadio Mane

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Sadio Mane

N'egwuregwu, ndị otu egwu bọọlụ Arsenal na Liverpool agụrụla mmeri nke abụọ ha na asọmpị "English Premier League" nke afọ a dịka ha dulara otu egwu bọọlụ Burnley nakwa Southampton.

Otu egwu abụọ a ji ọkpụ goolu abụọ asatara otu wee nweta mmeri n'ụbọchị Satọdee.

Aubameyang celebrates

Ebe foto si, PA Media

Nkọwa foto, Alexandre Lacazette na Pierre-Emerick Aubameyang

N'asọmpi ndị ọzọ, Bournemouth gbara Aston Villa 2-1, Everton tuuru ugo n'aka ndị Watford site n'ịgba ha 1-0.

Norwich mere ihe ịtụnanya mgbe ha gbara Newcastle 3-1, ebe Brighton na West Ham gbara ọnyụpa 1-1.

Manchester City na Tottenham na-achịpụ ya ugbua ịmata aka ga-agbaji aka.

Okwu dị n'etiti Nigeria na P&ID

Mohammadu Buhari

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Ọtụtụ mmadụ kwuru na njem Buharị na Benue abiaghi no oge

Gọọmentị etiti ekwuola na ha ga-aga n'ụlọikpe mkpegharị maka mkpebi ụlọikpe Briten sịrị ha kwụọ ụlọorụ Process and Industrial Development (P&ID) ego dị ijeri dọla itoolu ($9bn).

Ọkaiwu gọọmentị bụ Dayo Apata n'ozi ya sị na gọọmentị agwaala ndị ọkaiwu ka ha gbaa akwụkwọ megide ikpe e kpere na Lọndọn.

Apata kwuru na nsogbu a bụ nke gọọmentị nọ ugbua ritere n'aka gọọmentị gara aga.

Ụlọọrụ P&ID sị na ha na gọomentị etiti nwere nkwekọrịta ịrụrụ ha okporo mmanụ gaasị n'afọ 2010 mana gọọmentị emezughi nkwa nke ha.

Na ọ bụ n'ihi nke mere ha ji kpọpụ gọọmentị n'ụlọikpe.

Ikpe maka ụgbọmmiri mmanụ Iran

Ụgbọmmiri Grace 1

Ebe foto si, Reuters

Ụlọikpe mba Amerịka enyela ikike ka e jide ụgbọmmiri bu mmanụ ndị mba Ịran n'agbanyeghi na otu ọkaikpe na Gibraltar sị ka a tọhapụ ya.

Ụgbọmmiri a kpọrọ Grace 1 bu barelụ mmanụ dị nde abụọ na ọma ka e jidere n'Ọnwa Julaị mgbe e che na ọ na-aga mba Syria na nzuzo.

N'egwuregwu

Athletic Bilbao na Barcelona

Ebe foto si, EPA

Barcelona ewerela njọahịa gbapee asọmpi La Liga nke afọ a dịka Athletico Bilbao ji otu ọkpụ goolu merie ha ụnyaahụ.

Aritz Aduriz nyere goolu dị egwu iji nye Athletico Bilbao mmeri a.

Nkeji

Aha nkeananụānụ, Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile