Mpụ njeri $2.1: Ụlọikpe akwụsila ikpe Dasuki

Ebe foto si, AFP
Ụlọikpe ukwu dị na Federal Capital Territory a kwụsịla ikpe onye bụ buru onye ndụmọdụ n'ihe gbasara nchekwa obodo bụ Sambo Dasuki,
rue mgbe ndị Ụlọikpe Supreme ga-eme mkpebi dịka ha tinyere akwụkwọ.
Onye ọkaiwu Dasuki gwara ụlọikpe na ya bụ akwukwọ o tinyere n'ụlọikpe a nke ekwuru na a ga-elebara anya n'ọnwa March 2 ga-emetuta ikpe a n'uloikpe nta n'ụzọ na-ezighị ezi.
Onye ọkaiwu a,aha ya bụ Adeola Adedipe , kwukwara na ya bụ akwụkwụọ etinyere n'ụlọikpe Supreme bụ iji hụ na gọọmentị kwenyere na mkpebi ụlọikpe na mbụ n'itọhapụ Dasuki.
Dasuki na-agwa ụlọikpe Supreme ka ha kwusi ikpe a na-ekpe ya n'ihi na onweghị ikike zuru oke ikpe ya ikpe n'ụlọ ikpe nyere nkpebi nke gọọmentị na-ekwenyeghị na ya.
N'izaghachị ,onye ndụmọdu ikpe a bụ ọkaiwu, Atolagbe Olowaleke gwara ụlọikpe ka eleghara ya bụ akwụkwọ ọkaiwu Dasuki tinyere anya.
Na nkpebi ya, ọkaipke ukwu n'ikpe a bụ Hussein Baba-Yusuf, kwetara n'ihe Ọkaiwu Dasuki kwuru si na- iga n'ihụ n'ikpe a ga-egbochi i nweta ikpe ziri ezi.




