Enugu Airport: A ga-ewepụ "International" na Akanu Ibiam Airport?
Maka Akun Ibiam Airport Enugwu,

Gọọmentị Enugu steeti emechiela ahịa Orie Emene na ọdụanụ dịketere ọdọugboelu Akanu Ibiam International Airport dị n'Emena.
Nke a mere ka Federal Airports Authority of Nigeria (FAAN) dọchara aka na ntị na ha nwere ike imechi ya bụ Ọdọugbọelụ maka ọnọdụ nchekwa ya.
Mịnịsta na-ahụ maka ihe gbasara mbata na mfepụ ụgbọlelu Naịjirịa bụ Hadi Sirika ekwuola na gọọmenti etiti nwereike ịkwụsị mfepụ na mbata ụgbọelu si mba ofesi n'ọdọ ụgbọelu Akanu Ibiam dị n'Enugu.
O kwuru na ọ bụ maka ihe ndị ekwesiri ịrụzi ebe ahụ ana-arụbeghị nwereike ibute ọdachị.
Gọọmenti Enugwu steeti amapụtakwala ego a ga-eji bugherie Orie Emene.
Ndi uweojii anwuchiela ndị omekome n'Anambra

Ebe foto si, PA
Ndị uweojii n'Anambra steeti adọọla ọhaneze aka na ntị maka enyị amaghị ama a na-emeta na facebook.
Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii na steeti ahụ bụ Haruna Mohammed kwuru nke a mgbe ha zọrọ ndụ otu nwoke ndị omekome tọọrọ n'Ogidi, okpuruọchịchị Idemili North.
Minista Austria agbaala arụkwaghị m

Ebe foto si, Getty Images
N'ofesi e, Minista mba Austria bụ Heinz-Christian Strache agbaala arụkwaghị maka ebubo ngarị eboro ya.
Ebubo ahụ kwuru na ahụrụ Strache ebe ya na onye mba Russia na ekwe ọnụ ihe ọ ga-akwụ ya ma ọ nyere ya aka merie ntuliaka na-abịanụ na abalị iri abụọ na isii nke onwe Mee a.

Ebe foto si, Reuters
N'egwuruegwu ekpuwele Bayern Munich okpueze nke Bundusliga nke ugboro asaa taa mgbe ha ndị Eintracht Frankfurt kwakọrịtara mkpị n'agba nke ikeazụ ehihie Satọde.
Bayern ji ọkpụ ise chara acha asatara otu were napụ Frankfurt ya bụ iko ma rọọ ya anya nkarị.
Gee Nkeji
Osinbajo ajaala Rochas Ike

Ebe foto si, BBC/Gettyimages
Osote onyeisiala Naịjirịa bụ Yemi Osinbajo akọọwala Gọvanọ Imo steeti bụ Rochas Okorocha dịka onye etu o si eme ihe na-agbagọjụ anya.
O kwuru na ọ bụ makana ọ naghị eme nkpọtụ iji gosi iheọma omerela ndị Imo steeti kamgbe afọ asatọ ọ chịgoro steeti ahụ.
O kwuru nke a mgbe ọ gara ịmepe ụfọdụ ihe ndị Rochas rụrụ ndị Imo steeti.
N'ofesi,

Ebe foto si, AFP
Mba Australia atụwala vootu ha taa bụ ụbọchị iri na asatọ nke ọnwa May .
Na mba ahụ ọ bụ iwu na ị ga-atụrịrị vootu .Ihe karịrị mmadụ nde iri na isii denyere aha n'akwụkwọ maka ịtụ vootu.
N'egwuregwu,

Ebe foto si, Getty Images
Agba nke ikpeazụ nke iko FA ga-adị kpọkpọ dịka Mancity ga-ezute Waford n'ama egwuregwu Wembley n'elekere ise nke mgbede taa.
Mancity mabute iko nke a, ọ ga-eme ya iko atọ ha mabuterela n'izu egwuregwu a.











