Port Harcourt Airport: Agbapeela ụlọ nlabata ọhụrụ

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 2

Akụkọ dị mkpa taa

Mgbape ọdọụgbọelu na Portharcourt

ọdọụgbọelu Portharcourt

Ebe foto si, @NGPresident

Onyeisiala bụ Muhammadu Buhari ekwuola na ndị chịburu achị mara afọ n'ala na nwulite ọdọụgbọelu na Naịjirịa kamgbe afọ 1980.

O kwuru nke a mgbe ọ na-agbape ngalaba ọhụrụ nke ọdọụgbọelu mbaụwa dị n'Omagwa Portharcourt nke Rivers Steeti taa.

Okorocha a saala APC

Owele Rochas Okorocha

Ebe foto si, BBC Igbo

Nkọwa foto, Okorocha na-ebo onye isi oche APC ebubo maka ntuliaka emere n'Imo

Gọvanọ Imo Steeti bụ Rochas Okorocha ekwuola na onye odeakwụkwọ mgbasa ozi pati APC bụ Lanre Issa Onilu ezipụla ozi ọjọọ banyere APC na mbaụwa.

Okwu a bụ na nzaghachị okwu Issa kwuru na ụfọdụ ndị gọvanọ APC anabataghị mmeri e meriri ha na ntuliaka imeụlọ ha mere na nso nso a.

N'ofesi

Ndị uweojii nọ n'ihu ụlọ oriri Tribeca Grill na New York

Ebe foto si, CBS

Ezigala ozi ogbunigwe ọzọ n'ụlọ oriri Tribeca Grill dị na New York nke onye nwe ya bụ De Niro.

Nke a bụ mmadụ itoolu ndị akụkọ kwuru na-akatọọ ọchịchị onyeisiala Trump a na-ezigara ụdị ozi a n'ime otu izuụka.

N'egwuregwu

Njirimara Europa League

Ebe foto si, Getty Images

N'asọmpi Europa nke abalị a Sporting Lisbon ga-ele Arsenal ọbịa, ebe Chelsea ga-anabata ndị Bate Borisov.

N'aka nke ọzọ Zenit St Petersburg, Dinamo Zagreb, Bayer Leverkusen na ndị ọzọ ga-anọ n'egwu.

Nkeji abalịa

Aha nkeananụānụ, Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile

Ihe nkiri nke taa

Aha onyonyo, Electric Keke: Ụkọ mmanụ ụgbọala mere m ji arụ Keke - Ifeanyi

Akụkọ dị mkpa n'ụtụtụ

Udoma Udoma

Ebe foto si, Getty Images

Gọọmentị etiti ekewapụtala ego ruru tarịị naịra asatọ n'ọma bu ego a ga-emefu n'afọ 2019 dịka bọjeti.

Minista na-ahụ maka nhazi nakwa bọjeti bụ Udoma Udoma ekwuola na ya bụ akwụkwọ na-aga n'ụlọomeiwu maka nyocha ugbua

Lai Mohammed

Minista na-ahụ maka mgbasa ozi Lai Mohammed etiela mkpu n'akụkọ na-agagharị na-ekwu na ya ndị mba Israel na-ama aka gbasara Nnamdi Kanu abụghị eziokwu.

Ọ sị na ndị ọ gbasara ga-ezi ozi n'okwu Nnamdi Kanu ma oge ruo.

Na mba ofesi,

Tit Mboweni bụ Minista ọhụrụ na-ahụ maka akụnaụba obodo

Ebe foto si, AFP

Mba Saut Afrịka ewepula ụgwọ ụtụ isi dị n'elu akwa ụmụnwaanyị ji anọ na nsọ iji nyere nwata akwụkwọ ndị nwaanyị aka ka ha kwụsị ịgbajọ ụlọakwụkwọ.

Cheta na ụfọdụ ndị ntorobia na Naịjirịa na-akpoku gọọmentị etiti oku ka ha wepu ya bụ ụtụ isi.

N'Egwuregwu,

Skip X post
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post

Otu egwuregwu Rangers abụrụla aha na-ewu ewu ugbua dịka ha meriri Kano Pillars n'Asaba ụnyaahụ iji buli asọmpị iko FA nke mbụ ha n'afọ iri atọ n'anọ

Ndị kpara ike a bụ Kelvin Itoya Chidera Ezeh Ajani Ibrahim na n dị ọzọ.

Gee Nkeji nke ụtụtụ a

Aha nkeananụānụ, Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile

Ihe onyonyo nke taa

Aha onyonyo, Hyperrealism: 'A na m ese ihe maka ndụ ndị nnanna anyị'