Sudan: Ndịagha ewerela ọnọdụ ọchịchị ugbua

Ndị na-eme ngagharịwe na Khartoum dị na Sudan

Ebe foto si, Reuters

Akụkọ na-eru anyị ntị ugbua bụ na ndịagha ewepula onyeisiala mba ahụ bụ onyeisiala Omar-Al-Bashir.

Ndị agha na mba ahụ si n'ozi ha ziri n'igwe onyonyo kwuo na ha ewerela ọnọdụ na mba ahụ.

Ha kwuru na ndịagha ga-anọ n'ọchịchị afọ abụọ iji nọchi anya ndị mmadụ ma mee uche ha ka ha sị chọ ya.

Ihe ọzọ ha kwuru n'ụdị nkọwa bụ na "ndị ogbenye ka dara ogbenye, ndị ọgaranya ka bụ ọgaranya"

Akụkọ si na Sudan pụta n'ụtụtụ kwuru na a na-anụ ụda egbe ugbua na mpaghara ahụ.

Nke a mere na ndị mmadụ na-agbagharị ịchọta mkpuchi n'ebe dị icheiche.

Tupu nke ahụ emee, ndị hụrụ ebe ihe mere gwara BBC na ndịagha agaala n'ụlọọrụ otu nọ n'ọchịchị na-ezu ihe.

Ndị na-eme ngagharịwe

"Anyị na-eche ozi dị ukwu gbasara ọchịchị anyị" ka otu onye gwara onye ọrụ AFP nọ ebe ihe na-eme.

O gafeela elekere anọ kemgbe ndịagha kwere nkwa na ha ga-ezi ozi gbasara ya bụ ọkwa ọchịchị na Sudan.

Otu nwaanyị agbarala aka nwa n'ọgbaghara Sudan

Ógbaghara Sudan

Ebe foto si, Getty Images

Ndị nọ ebe ihe mere kwuru na ụfọdụ ndị agha bịara gboo ọgụ dịka ndị ọrụ nchekwa na ndị na-eme ngagharịiwe kụkọrọ isi na Khartoum,isi obodo Sudan.

Ndị agha gbalịrị ịchụsasị ụgbọala na-agba ndị mmadụ na-eme ngagharịiwe egbe na ikuku anyammiri(tear-gas).

Ndị a na-akpọ oku ka onyeisiala Sudan bụ Omar al-Bashir rituo n'ọchịchị.

Onyeisiala Omar al-Bashir

Ebe foto si, Reuters

Nkọwa foto, Onyeisiala Bashir wezụgara iwu ala ahụ nakụkụ n'ọnwa Februwarị

Bashir, onye banyere ọchịchị afọ ịrị atọ gara aga jụrụ inye ohere ka ọchịchị ọzọ bata.

Ndị na-eme ngagharịiwe gbagara ọsọ n'ogige ndị agha ụgbọmmiri dịka egwu dị n'etiti ndị agha.

An army vehicle passes protesters near the military HQ on Monday morning

Ebe foto si, AFP

Nkọwa foto, An army vehicle passes protesters near the military HQ on Monday morning

Dịka ndị ọrụ gọọmenti siri kwuo, mmadụ asaa anwụọla kemgbe Satode ọgbaghara ahụ bidoro.

Ihe mere n'abalị ụbọchị ụka

Ndị na-eme ngaghariwe chiri aka ha elu ụbọchị Eprelu 6

Ebe foto si, AFP

Nkọwa foto, Ngagharíiwe e mere úbóchí Satóde mere n'ótú obodo mepere emepe na Sudan

Otu onye so mee ngagharịiwe gwara BBC na ụgbọala na-agbakasị ndị na-eme ngagharịiwe egbe na ikuku anyammiri dịka ka ha gbakọrọ na Khartoum.

Mgbe nke a mere ndị agha gbara nkịtị maka ha nọkata gboo ọgụ site na ịchụsasị ndị ọrụ nchekwa.

Gịnị na-ese?

Ihe buteburu ngagharịiwe bụ oke ọnụ ahịa ihe na-ada n'ahịa mana ugbua ndị mmadụ na-akpọ oku ka onyeisiala ha gba alukwaghịm.

Akụnaụba Sudan na-akpụ afọ n'ala nkemgbe afọ iri abụọ gara aga dịka mba Amerịka machiri ha maka ebubo ịkwado ndị na-eyindu egwu.

Ndị na-eme ngagharịiwe na Khartoum

Ebe foto si, AFP

N'ọnwa Disemba, gọọmenti ha mara ọkwa na ọnụ mmanụ ụgbọala na achịcha bekee ga-agbalite elu dịka ego ha bụ Sudan paụnds kpụrụ isi n'ala.

Kedụ ndị na-eme ngagharịiwe?

SPA - Njịkọta ndị ọụahụike na ndị ọkaiwu bụ ndị na-ahazi ngagharịiwe ahụ

Ndị dọkịta bụ ndị bu ọgbaghara ahụ n'isi nke mere ka ndị ọrụ gọọmentị na-achọsị ha ike.

A na-eche na ụzọ abụọ n'ime atọ ndị na-eme ngagharịiwe bụ ụmụnwaanyị.

line