Algeria protest: 'Anyị achọghị onyeisiala si mba ọzọ achị anyị' - Ndị mba Algeria

Akụkọ dị mkpa:

Ndị mba Ọljiria ka na-eme ngagharịiwe ha malitere izu abụọ gara aga, maka ịkwụsị onyeisiala ha chọrọ ịbịaghachị zọọ ọkwa nke ugboro ise.

Ndị Ọljiria

Ebe foto si, AFP

Onyeisiala Abdelaziz Bouteflika dị afọ iri asatọ na ise achịala mba ahụ afọ iri abụọ, n'agbanyeghi na ọ nọ n'ụlọọgwụ dị na mba Swizaland.

Aisha Buhari

Nwunye onyeisiala Naijiria bụ Aisha Buhari adụọla di ya bụ Muhammadu Buhari na ndị APC ọdụ ka ha họpụta ndị bụ ndị pati ahụ n'ọrụ ọkwa ọchịchị.

Aisha Buhari

Ebe foto si, APC

Aisha kwuru nke a ụbọchị Tọọzde n'ọgbakọ ọ kpọrọ iji kelee ndị tụnyere ha vootu n' amaegwuregwu Daura Stadium.

N'egwuregwu,

Bernand Traore

Ebe foto si, Getty Images

Ngalaba FIFA agbaala isi akwara jụ na ha agaghị ewepụ mmachi ha machiri Chelsea ịzụ ndị egwuregwu ọhụrụ n'ime afọ abụọ.

Ọkụ gbara n'Akwa Ibom

Ọ bụ n'obodo Ibesikpo Asutan ka ụlọọrụ Inec ahụ agbara ọkụ dị.

Ụlọọrụ agbara ọkụ

Ebe foto si, Cletus Ukpong

Rue ugbua, amabeghi ihe butere ya bụ ọkụ gbara mana onyeisi Inec na steeti ahụ bụ Mike Igini agaala nleta ebe ahụ.

O kwuru na ọ bụ iji chọpụta ka ụlọ ahụ si gbaa ọkụ rue nakwa ịmata ma akụrụngwa ntuliaka e so n'ihe ndị gbara ọkụ.

A gaghị agụnye vootu ndị ejighị 'card reader' tụọ - Inec

Onye ntorobia na-eme ntuliaka

Ebe foto si, Getty Images

Inec ekwuola na ha agaghị enye ndị ndọrọndọrọ ọchịchị manyere ndị ọrụ ha ka a kpọpụta ha dịka ndị meriri na ntuliaka gọvanọ na ụlọomeiwu nke steeti a ga-eme ụbọchị Satọde akwụkwọ mmerị.

Inec kwukwara na ha ga akagbu ntuliaka n'ebe niile ndị mmadụ jụrụ igwe 'card reader'.

Onyeisioche Inec bụ Mahmood Yakubu kwuru nke a n'ụbọchị Tọọzde n'ọgbakọ ngalaba ndị ọrụ ntuliaka metụtara n'ọkwu gbasara nchekwa na ntuliaka n'isi ụlọọrụ ha dị n'Abuja.

Ụbọchị ncheta ụmụnwaanyị

Ụmụnwaanyị

Ebe foto si, Getty Images

Dịka a na-eme ncheta ụmụnwaanyị taa bụ abalị asatọ nke ọnwa Maach, otu United Nations akpọọla oku ka e jiri nka were mee isi a hụrụ kwaba okpu na mbọ ime ka ụmụnwaanyị nweta oke rụrụ ha na ndụ.

Nwoke gburu enyi ya

nwoke ji agụba

Ebe foto si, Getty Images

Ndị Uweojii nọ na Legọs anwụchiela nwoke asụgburu enyi ya n'ihi ndọrịtaụka onye elekereaka ya ka dị oke ọnụ ahia n'Ikorodu dị na Legọs na nso nso.

Onụ na-ekwuru ndị uweojii na steeti ahụ bụ Chike Oti kwuru na ha na-eenyọcha nwoke ahụ e kwuru na ya na ya enyi ya nwụrụ anwụ bụ ndị otu nzuzo a kpọrọ 'Eiye Confraternity'.

Onye ihe Manchester United na-amasị

Ama egwuregwu

Ebe foto si, Getty Images

N'egwuregwu, a sụrụ otu onye ihe otu egwu bọọlụ Manchester United na-amasị mma na Paris, mba France dịka otu bọọlụ ahụ merichara PSG ụbọchị Wenezde.

Gere akụkọ BBC n'otu nkeji ebe a:

Aha nkeananụānụ, Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile

Ihe nkiri nke taa:

Aha onyonyo, International Women's Day: 'Agaghị m ata onwe m ụta na m bụ nne na-arụ orụ- Ngozi Nwobia