"Baby Mama" abụghị omenaala Igbo

Flavour na Davido

Ebe foto si, @2niteflavour/Getty

Na nwaanyị mụrụ nwa na-alụbeghị di abụghị akụkọ ọhụrụ na Naịjiria .

Ihe na-agbagọju ọtụtụ mmadụ anya bụ na ọ dịzị ka ndị ntorọbịa agba ọhụrụ na-aṅụzi ya bụ omume.

Otu onye so na ndị na-ahụ na ụmụ ntorọbịa anaghị ebi ndụ efulefu n'obodo bụ Oriakụ Nkiruka Onyekozuru-Okafor kwuru na ya bụ agwa a kpọrọ "Baby Mama" abụghị omenala Igbo.

Nkiru kwuru na ihe ọjọọ gbara afọ a pụtaghị na ọ bụrụla omenaala.

Flavour

Ebe foto si, @2niteflavour

Cheta n'akụkọ wuru na soshal midia kwuru na-ekwu na Flavour bụ otiegwu ama ama na nwata nwaanyị mụbụrụ ya nwa bụ Sandra Okagbue amụtala nwa ọhụụ, nwa nwoke.

Flavour onye ezi aha ya bụ Chinedu Okoli

Lee ndị ama ama ndị ọzọ nwere "baby mama" na Naịjiria:

Tuface Idiabia

Onye otiegwu, Innocent Idibia nke a ma ama dịka Tuface nwere ụmụ nwaanyị anọ mụrụ ya ụmụ ya asaa tupu ọ lụa Anne bụ nwunye ya ugbua.

Ha gunyere Pero Adeniyi na Sunbo Adeoye.

Davido

Davido

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Davido bụ ya tiri egwu a kpọọ 'Assurance'

Ọtụtụ mara na Davido na Chioma bụ nnu na ose, mana ụfọdụ amaghị na Davido ,onye ezi aha ya bụ, David Adeleke, nwere ụmụ nwaanyị mụrụ ya nwa.

Sophia Momodu, nwa nwanne, Dele Momodu oney nwe ọ́kwụkwọ akụkọ, Ovation, mụrụ Davido nwa.

Onye ọzọ mụrụ ya nwa bụ nwaanyị a kpọrọ, 'Amanda.'

9ice

9ice

Ebe foto si, @9iceofficial

9ice, onye otiegwu ọzọ ama ama amụọla ụmụ ise n'aka ụmụnwaanyị anọ gunyere Olasukanmi Ajala na Vicky Godis.

Toni Payne nwunye ya na ya gbasara afọ ole na ole gara aga mụttara ya otu nwa nwoke.

Wande coal

Wande Coal nwere otu nwaanyị a kpọrọ Tope Ogunnusi, onye mụtara ya nwa nwoke.

Wizkid

Wizkid

Ebe foto si, @Wizkidayo

ụmụnwaanyị mụtara Wizkid nwa na alụghị ya alụ gụnyere Shola Ogudu,Jada Pollock nakwa Binta Diallo.

Sean Tizzle

Sean Tizzle

Ebe foto si, @iamseantizzle

Alụbeghị nwaanyị mana o nwere nwa otu enyi ya nwaanyị a kpọrọ Maina mụtara ya.

Akụkọ ga-amasị gị: