Odumegwu Ojukwu: 'Igbo agaghị echefu ya makana o nweghị onye ga-anọchinwu ya'

Ebe foto si, Getty Images
- Onye dere ya, Chimamaka Ihenacho
- Ndị mere akụkọ a, Broadcast Journalist, Igbo
Chukwuemeka Odumegwu Ojukwu bụ otu onye Ndigbo agaghị echefu aha ya echefu, mana gịnị ka ị maghị maka ya?
N'ịcheta ndụ o biri n'ụwa, Elliot Uko, onye buru Ojukwu akpa ọtụtụ afọ tupu ọ nwụọ, kwuru na "Ojukwu ejighị ịhụnanya Ndigbo nwere ebe ọ nọ kpaa ego dịka ndị ndọrọndọrọ ọchịchị ugbua na-eme."
O kwuru na ọ bụrụ na ọ ka nọ ndụ ugbua, ọ ga na-ekwuru Ndigbo ọnụ ha dịka ọnọdụ Igbo dị ugbua na Naijiria.
Site n'oge Ojukwu bụ onye agha Naịjirịa bido n'afọ 1957 ruo 1967, ruo mgbe o hibere ma bụrụ onyeisi ndị agha Biafra bụ ndị na-achọ nnwereonwe ha n'ụbọchị Mee 30 nke afọ 1967, Ojukwu mere ihe ndị e ji kpụrụ ya n'ọnụ.
Oge ọ ka nọ n'ụlọakwụkwọ sekọndịrị, a nwụchiri ya n'ụlọ mkpọrọ maka imenye otu onye nkuzi si Briten wakporo nwaanyị onyeisi ojii, ihere.
Nna ya bụ Louis Odumegwu-Ojukwu, so na ndị ego ha bụ eriwe agwụ agwụ nke mere na oge Ojukwu dị naanị afọ 13, nna ya zigara akwụkwọ na mba Briten.

Ihe i kwesịrị ịma maka Ojukwu:

Ebe foto si, Getty Images
- A mụrụ Ojukwu na dike Igbo ọzọ bụ Nnamdi Azikiwe, n'obodo Zungeru, Naịja steeti, dị na mpaghara ugwu Awụsa
- Ọ lụrụ Bianca Onoh bụ nwa onye bụbụ gọvanọ Anambara steeti, n'ụbọchị Nọvemba 12 nke afọ 1994.

Ebe foto si, BiancaOjukwu/Facebook
- Nna Ojukwu hibere ihe a ma ugbua dịka "Nigerian Stock Exchange", n'ihi na Nna Odumegwu Ojukwu kpara akụ eriwe agwụ agwụ
- Elliot Uko bụ onye na-eburu Ojukwu akpa, kwuru na o jighi ịhụnanya ndị Igbo nwere ebe ọ nọ kpaa ego.
- Enyi ya nwoke bụrụkwa onye na-ede akwụkwọ bụ Frederick Forsyth, dere n'akwụkwọ ya bụ "Emeka" na Ojukwu dị ka "akara ọkụ" nke bụ na ụmụ asa na-achụgharị ya oge .
- Ojukwu bu ụzọ gaa mahadum Lincoln, Oxford, dị na mba ofesi tupu ọ banye ma bụrụ onye agha Naịjirịa.
- Ojukwu a mụrụ n'ụbọchị anọ nke Nọvemba 1933, nwụrụ n'ụbọchị 26 nke Nọvemba n'afọ 2011, ka ọ dị afọ 78.








