Rita Dominic: Ihe kpatara soshal midia ji ekwo na nwa ada a dị ime

Ebe foto si, RitaDominic/Instagram
Ọtụtụ ụmụ na Naịjirịa akpụrụla aha Rita Dominic n'ọnụ n'ụtụtụ Mọnde a, dịka ha na-ekwu na ọ dịka nwa ada a ọ dị ime.
Ihe kpatara nke a bụ onyonyo Rita Dominic tinyere n'akara Instagram ya ebe afọ ya dịka nke nwaanyị dị ime.
Onyonyo ahụ bụ na mmemme akwamozu nke Oriaku Joy Anosike, nne Fidelis Anosike, onye akụkọ kwuru na ọ bụ ya na-alụ Rita Dominic.

Ebe foto si, Instagram
Cheta na n'ọnwa Disemba afọ 2020, Rita Dominic wepụtara foto ebe ya na Fidelis Anosike nọ.
Nke a mere ka akụkọ malite ịgbasa na ha abụọ na-akwado ịlụ onwe ha, mana ha abụọ akpọghị okwu aha.

Ebe foto si, RitaDominic/Instagram
Kama ọtụtụ na-ekwu na Rita Dominic na Fidelis Anosike agbaalarị akwụkwọ na nzuzo na-emeghị ka ọha obodo mara.
BBC Igbo amatabeghị ma mmadụ abụọ a alụọla onwe ha n'eziokwu.
Ka ọ dị ugbua, Rita Dominic ekwubeghị kpọmkwem ma ọ dị ime n'eziokwu.
Mana ọtụtụ ndị nkwado ya agaalarị na soshal midia na-agọrọ ya ọfọ ọma.

Ebe foto si, Screengrab
Rita Dominic: Gịnị mere aha ya ji ewu na soshal midia?

Ebe foto si, @ritaUdominic
Ọ bụrụ na i chere na ọ bụ ihe gbasara ihe nkiri ka aha Rita Dominic ji ewu na soshal midia ugbua, ị mara na i yi azụ akwa.
Nwaada na-eme ihe nkiri danyere na nsogbu dịka ndị ihe ya na-amasị bidoro na-akpọ ekwentị ya aghara aghara.
Ebee ka ha siri nweta akara ekwentị ya?
Akụkọ kwuru na ọ bụ ndị ji ịntanet akpa ajọ agwa zubara n'akara Nina nke soro na BBnaija were gbasa ozi akara ekwentị Dominic nyere ya.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 1
Cheta na nsonso a, BBC Igbo gwara gị ihe i kwesịghị ime na soshal midia, mana ugbua otu n'ime ha atụọla Nina na ndị enyi ya mbọ n'ike.
Ugbua, ụwa niile ejirila obere ọdachi a eme ihe ịkpa ọchị na soshal midia.
Lee ihe ụfọdụ na-ekwu maka ya:
@_Feloya kwuru na ya kpọrọ akara ekwentị Dominic, ọ bụrụ na ọ gbanyụọla ya.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 2
@Chinwekzy kwuru na ihe Dominic na-amasị ya kemgbe ọ dị na nwata.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 3
@iamoscarisrael gosiri obi mwute na ụmụ Naijiria ji ihe mere Dominic mere ihe ọchị.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 4









