Buhari: Ọnọdụ ndị uweojii Naịjirịa agbanwela

Akụkọ dị mkpa:

Uweojii Naijiria

Ebe foto si, AFP

Onyeisiala Muhammadu Buhari ewepụtala ụgwọ ọnwa ọhurụ a ga-anakwụ ndị uweojii Naịjirịa.

Buhari kwuru na ọchịchị ya ga-eme ihe niile ịhụ n'ihe ọbụla gbasara ndị uweojii ọkachasị ihe ha ji enyere ndụ aka ga-adị n'uju ka ugwu ha furu efu diri ha.

O kwuru mgbe ndị otu "Nigeria Police Service Commission" gara ikela ya n'Abuja.

Ha gara ikele ya maka etu o siri kweta ka e bulie ego ụgwọ ọnwa ha nakwa ego ezumike nka ha.

Ọkọlọtọ APC

Ebe foto si, Getty Images

Ụlọ ọrụ na-ahụ maka etu e si agbasa ozi na Naịjirịa bụ NBC n'aha ichafụ enyela ndị ndọrọndọrọ ọchịchị ndụmọdụ ka ha gbara okwu akpọmasị ọsọ.

NBC kwukwara ka ha gbara agwa ọbụla ga-eme ka ntuliaka na-abịa n'afọ 2019 ghara ịga nkeọma.

Ọ bụ onyeisi ha bụ Mallam Ikra Bilbis, nyere ndụmọdụ a n'ọgbakọ ha mere na Sokoto n'ụbọchị November 26, 2018.

Dim Odumegwu Ojukwu na Awka

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Ụmụnne Ojukwu na nwunye ya gara ụlọikpe maka akụnaụba nna ha

N'icheta ndụ o biri n'ụwa, Elliot Uko, onye buru Ojukwu akpa ọtụtụ afọ tupu ọ nwụọ, kwuru na Ojukwu ejighị ịhụnanya Ndigbo nwere ebe ọ nọ kpaa ego dịka ndị ndorondọrọ ọchịchị ugbua na-eme.

Cheta na a na-eme ncheta ọnwụ Chukwuemeka Odumegwu Ojukwu dịka ọ gbara afọ asatọ.

Uweojii/Ipob

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Ndị otu Ipob kwuru na ndị uweojii na-atụ asị

Ndị uweojii ewepụtala aha mmadụ iri atọ na atọ ndị ha na-ebo ebubo na ha gburu otu onye otu ha n'ọgbaghara mere na Nnewi.

Ha kwukwara na ndị Ipob merụrụ "onyeisi ndị uweojii (DPO) ogige Central Police Station (CPS), Nnewi bụ CSP Babalola Adewunyi, ASP Micheal Duru nke 'Area Command, Nnewi' nakwa Inspector Akinbami Olaniyi nke CPS Nnewi ahụ.

N'egwuregwu

Egwuregwu bọọlụ

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Otu Manchester city na united na-eme karị ọzụzụ ka ha wee dị sam maka egwuregwu bọọlụ

O nwere ihe di iche n'etiti Man United na Man city?

Otu egwuregwu Manchester United na-anata ego ụgwọ ọnwa ji nde pound 500 karịa nke otu Manchester city n'ime otu afọ dịka Global Sports Salaries Survey si kwupụta.

N'ofesi

Iran

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Alaọmajiji gburu mmadụ ruru narị isii na Iran n'afọ 2017

Ihe karịrị mmadụ narị asaa emerụọla ahụ n'ala ọma jiji mere n'ọdịda anyanwụ Iran n'abali ụbọchị ọnwa Nọvember 25.

E nwebeghi onye e kwuru nwụrụla nụ maọbụ onye merụrụ ahụ.

Ihe a mere n'akụkụ ebe ala ọmajiji gburu mmadụ ruru narị isii n'afọ 2017 mere.

Aha nkeananụānụ, Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile
Aha onyonyo, Ihe nkiri ndị Igbo kwesiri ịga ebe niile - Ken Erics
Ndị ọrụ Inec

Ebe foto si, AFP

Nkọwa foto, Inec: Bia nara PVC gị

Ụlọọrụ na-ahụ maka ntuliaka bụ INEC ndị dị na mpaghara ọwụwanayanwụ agwala ndị mmadụ ka ha gaa n'okpuru ọchịchị obodo ha ga were akwụkwọ ntụliaka ha bụ PVC na bekee.

Ọnụ na-ekwuru ndị INEC n'Imo Steeti bụ Oriakụ Benson kwuru na 'PVC' ndị debara aha site n'afọ 2017 rue n'ọnwa Juun nke afọ 2018 apụtala.

O kwuru na nkesa 'PVC' ga-amalite taa n'isi ụlọọrụ ha dị n'okpuru ọchịchị obodo dị iche iche na Steeti ndị dị na mpaghara ọwụwanyanwụ.

Mkparịta Gọọmentị na ASUU

ASUU na Gọọmentị

Ebe foto si, EPA

Gọọmentị na otu jịkọtara ndị nkuzi mahadum bụ ASUU ga-enwe mkparịta ụkọ ọzọ taa iji mee ka ha kwụsị abụbọ ọrụ ndị otu a na-agba.

Onyeisi ndị ASUU bụ Biodun Ogunyemi kwuru na ọ bụrụ na gọọmentị mee ihe ha kwesiri ime na ha ga-akwụsị abụbọ ọrụ a nọrọla izụụka atọ.

Ọdịda ọnụego mmanụ

ite mmanụ agbịdị

Ebe foto si, Getty Images

Egwu ji ndị ọkachamara n'ihe mgbasara akụnaụba dịka ọnụ mmanụ agbadị dara rue dọla iri ise na asatọ kwa otu udu mmanụ n'ahịa mbaụwa.

Cheta na ndị isi ọchịchị bụ Federal Executive Council na bekee gbadoro ụkwụ na ọnụ mmanụ ịda dọla iri isii wee hiwe mkpata na mmefu nke afọ a.

Aha onyonyo, Naịjirịa kwụsị ịtụkwasị obi n'elu mmanụ agbịdị - Moghalu

N'ofesi

Praịm Mịnịsta mba Briten bụ Theresa May

Ebe foto si, EPA

Praịm Mịnịsta mba Briten bụ Theresa May agwala ndị ọmeiwu ha na ọ bụrụ ha gbahapụ nkwerikọta 'Brexit' na ọ ga-ebute nkewa na adịghị n'otu.

Okwu ya na-abịa dịka ndị ndu mba ndị nọ na European Union tinyechara aka n'akwụkwọ nkwekọrịta maka 'Brexit'.

N'egwuregwu

Ndị Super Falcons

Ebe foto si, NGSuper_Falcons

Onye na-agbara Super Falcons bọọlụ Asisat Oshoala ekwuola na ọnọdụ ọma ha nọ n'asọmpi Iko mba Afrịka abụghị ọrụ otu onye kama ọ bụ mammịrị anyụkọtara ọnụ.

Oshoala nyere goolụ atọ na mmeri ha ji ọkpụ isii merie ndị Equitorial Guinea iji baa agba abụọ nke ikpeazụ.

Nkeji

Aha nkeananụānụ, Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile

Ihe nkiri

Aha onyonyo, Ihe nkiri ndị Igbo kwesiri ịga ebe niile - Ken Erics