Asuu strike: Ihe na-eme ugbua na mahadum ala Igbo

Ebe foto si, Getty Images
Onye ntaakụkọ BBC Igbo achọpụtala na ọtụtụ mahadum dị na mpaghara ọwụwa-anyanwụ Naịjirịa esoghi n'abụbọ-ọrụ ndị Asuu kpọrọ taa bụ Novemba 5, 2018.
Asuu bụ 'Academic Staff Union of Universities' na Bekee, kwuru na ha ga-eme abụbọ-ọrụ a ruo 'mgbe ebighi ebi' nke bụ ihe Bekee kpọrọ 'indefinite strike'.
Mana onye ntaakụkọ BBC chọpụtara na ruo oge e dere akụkọ a, mahadum dịka 'Alvan Ikoku College of Education' esonyebeghị n'abụbọ-ọrụ a.
Ndị a gbara ajụjụ ọnụ na mahadum a kọwara na ụmụakwụkwọ emechiela mana ndị nọ n'egwu ụla ka nọ.
Na mahadum Abia steeti (ABSU), onye ntaakụkọ BBC chọpụtara na ha ka na-aga akwụkwọ.
Otu nwata nwaanyị na-achọghị ka aha ya pụta n'akụkọ, kwukwara na ha nwere akwụkwọ taa bụ November 5, 2018, ma kwuo na ha ka ga-agakwa echi bụ Novemba 6.
Mana o kwuru na ha niile chị obi n'aka makana ha amabeghi ma mahadum ha a ga-esonye n'abụbọ-ọrụ n'ezie.
Ihe na-akpọtụ na Twitter
Akwa na-akpọtụ ugbua na Twitter nakwa Facebook maka ozi Asuu zipuru na ha ga-ebido abụbọ-ọrụ n'ike.
Asuu bụ Academic Staff Union Universities na Bekee kwuru na ha ga-emegide abụbụ ọrụ a ruo mgbe amaghị ama.
Ọtụtụ ụmụakwụkwọ agaala social media na-ebe akwa na abụbụ ọrụ a agbawaala ha obi.
@Chinuamichael dere na a chọrọ igbu ya, makana oge ọbụla ebidoro abụbụ ọrụ a ọ bụ ndị ụmụakwụkwọ na-ata ahụhụ dị n'ime ya.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 1
@OMAAOFLAGOS kwuru na onweghị ihe obi ụtọ dị na ndụ ya maka okwu a.
O kwukwara na ihe na-ebute anya mmiri bụ na mgbe ụmụakwụkwọ gụchara akwụkwọ o nweghị ọrụ na-eche ha n'iro.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 2
@OmokaroB dere na onye bụbu minista na-ahụ maka ụlọakwụkwọ gara mahadụm n'ofesi sịkwa na nnukwu nsogbu ka dị n'ihu ụmụaka na-eto na Naịjirịa.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 3
@eldarjames kwuru na nke a abụghị akụkọ ọhụrụ makana oteela ASUU bidoro ịme abụbụ ọrụ dị icheiche.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 4
@rasrap21 jiri abụbụ ọrụ mee ihe ịkpa ụka ọchị.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 5
Mana @NnaemekaNnadi dere na ASUU kwesiri ịga abụbụ ọrụ a makana o teela ha na-arịọ gọọmentị ka ha leba anya na nsogbu ha.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 6
Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị









